Ọrụ Ndịozi
4 Ka ndịozi abụọ ahụ nọ na-agwa ndị Juu okwu, ndị isi nchụàjà na onyeisi ndị nche ụlọ nsọ+ na ndị Sadusii+ bịakwutere ha na mberede, 2 iwe ji ha maka na ha na-ezi ndị mmadụ ihe, na-ekwusakwa banyere mbilite n’ọnwụ n’ụzọ doro anya, na-ehota Jizọs dị ka ihe atụ;+ 3 ha wee jide ha, tụba ha n’ụlọ mkpọrọ ruo echi ya,+ n’ihi na ọ bụ na mgbede. 4 Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ndị gere ntị n’okwu ahụ kweere,+ ọnụ ọgụgụ ndị ahụ wee dị ihe dị ka puku mmadụ ise.+
5 N’echi ya, ndị na-achị ha na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ nwere nzukọ na Jeruselem.+ 6 (Ha na Anas+ onyeisi nchụàjà na Keyafas+ na Jọn na Alegzanda na ndị niile bụ́ ndị ikwu onyeisi nchụàjà ahụ). 7 Ha wee mee ka ha guzo n’etiti ha wee malite ịjụ ha, sị: “Olee ike unu ji mee ihe a, ọ̀ bụkwa aha onye ka unu ji mee ya?”+ 8 Pita jupụtara na mmụọ nsọ+ n’oge ahụ wee sị ha:
“Unu ndị na-achị obodo na ndị okenye, 9 ọ bụrụ na a na-agba anyị ajụjụ taa n’ihi ihe ọma e meere nwoke ahụ́ na-enye nsogbu,+ ka a mara onye e ji aha ya mee ka ahụ́ dị nwoke a mma, 10 unu niile na ndị Izrel niile, maranụ na ọ bụ aha Jizọs Kraịst onye Nazaret,+ onye unu kpọgidere n’osisi,+ onye Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie,+ ọ bụ aha ya ka e ji mee ka ahụ́ dị nwoke a guzo n’ihu unu n’ebe a mma. 11 Onye a bụ ‘nkume ahụ nke unu bụ́ ndị na-ewu ụlọ mesoro dị ka ihe na-abaghị uru, nke ghọworo isi nkuku.’+ 12 Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ, n’ihi na aha ọzọ+ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta anyị.”+
13 Ma mgbe ha hụrụ otú Pita na Jọn si nwee nkwuwa okwu, ghọtakwa na ha bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,+ o juru ha anya. Ha wee malite ịmata na ha na Jizọs na-anọbu;+ 14 ka ha nọ na-ele nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa n’ebe o so ha guzoro,+ ha enweghị ihe ha ga-aza ha.+ 15 Ha wee nye ha iwu ka ha si n’ụlọ nzukọ Sanhedrin ahụ pụọ, ha malitekwara ịgba izu, 16 na-asị: “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a?+ N’ihi na, n’ikwu eziokwu, ha emewo ihe ịrịba ama a maara nke ọma, nke pụtara ìhè n’anya ndị niile bi na Jeruselem;+ anyị apụghịkwa ikwu na ha emeghị ya. 17 Ka o sina dị, ka o wee ghara ịgbasakwu n’ebe niile n’etiti ndị mmadụ, ka anyị yie ha egwu ma gwa ha ka ha ghara ịgwakwa onye ọ bụla okwu ma ọlị n’aha a.”+
18 Ha wee kpọọ ha ma nye ha iwu ka ha ghara ikwu ma ọ bụ izi ihe ọ bụla n’ebe ọ bụla n’aha Jizọs. 19 Ma Pita na Jọn zara ha, sị: “Kpebienụ n’onwe unu ma ò ziri ezi n’anya Chineke ige unu ntị kama ige Chineke ntị. 20 Ma anyị onwe anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụrụ na ihe ndị anyị nụrụ.”+ 21 Ya mere, mgbe ha yikwuru ha egwu ọzọ, ha hapụrụ ha, ebe ha na-ahụghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji nye ha ntaramahụhụ nakwa n’ihi ndị mmadụ,+ n’ihi na ha niile nọ na-enye Chineke otuto n’ihi ihe merenụ; 22 n’ihi na nwoke ahụ e ji ọrụ ebube gwọọ ọrịa dị ihe karịrị afọ iri anọ.
23 Mgbe a hapụrụ ha, ha jekwuuru ndị ibe ha+ ma kọọrọ ha ihe ndị isi nchụàjà na ndị okenye gwara ha. 24 Mgbe ha nụrụ ihe a, ha ji otu obi gwa Chineke n’oké olu,+ sị:
“Ọkaakaa Onyenwe anyị,+ ọ bụ gị bụ Onye kere eluigwe na ụwa na oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha,+ 25 onye ji mmụọ nsọ si n’ọnụ nna nna anyị Devid,+ bụ́ ohu gị, sị, ‘Gịnị mere mba niile ji na-agba ghara ghara, ndị dị iche iche ana-atụgharịkwa uche n’ihe efu?+ 26 Ndị eze nke ụwa eguzorowo, ndị na-achị achị zukọtakwara dị ka otu onye imegide Jehova na imegide onye o tere mmanụ.’+ 27 N’agbanyeghị nke ahụ, ma Herọd ma Pọntiọs Paịlet,+ tinyere ndị mba ọzọ na ndị Izrel, zukọtara n’obodo a megide ohu gị dị nsọ,+ bụ́ Jizọs, onye i tere mmanụ,+ 28 iji mee ihe niile aka gị na nzube gị kara aka tupu oge eruo na ha ga-eme.+ 29 Ugbu a, Jehova, biko, leba anya n’egwu ha na-eyi anyị,+ nyekwa ndị ohu gị ike ka anyị nọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla,+ 30 ka ị na-agbatị aka gị na-agwọ ọrịa, ka ihe ịrịba ama+ na ihe ebube na-emekwa n’aha+ ohu gị+ dị nsọ bụ́ Jizọs.”
31 Mgbe ha rịọsiri arịrịọ ike, e mere ka ebe ahụ ha zukọtara maa jijiji;+ ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ,+ na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu.+
32 Ìgwè mmadụ ahụ bụ́ ndị kweerenụ nwere otu obi na mkpụrụ obi,+ ọ dịghịkwa ọbụna otu onye na-ekwu na nke ọ bụla n’ime ihe ndị o nwere bụ nke ya; kama ha nwekọrọ ihe niile ọnụ.+ 33 Ndịozi ahụ jikwa ike dị ukwuu na-agba àmà banyere mbilite n’ọnwụ nke Onyenwe anyị Jizọs;+ obiọma na-erughịrị mmadụ dịkwasịkwara ha niile nke ukwuu. 34 N’eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha nke ihe kọrọ;+ n’ihi na ndị niile nwere ala ma ọ bụ ụlọ na-ere ha ma na-eweta ihe ha retara. 35 Ha na-edebekwa ya n’ụkwụ ndịozi.+ E mesịa, a na-ekenye onye ọ bụla,+ dị nnọọ ka mkpa o nwere si dị. 36 Ya mere, Josef, onye ndịozi kpọkwara Banabas,+ nke pụtara, ma a sụgharịa ya, Nwa Nkasi Obi, bụ́ onye Livaị, onye Saịprọs, 37 nwere otu ibé ala. O rere ya ma weta ego ya wee debe ya n’ụkwụ ndịozi.+