2 Jekọb wee gwa ezinụlọ ya, gwakwa ndị niile ya na ha nọ, sị: “Tụfuonụ chi ndị mba ọzọ dị n’etiti unu,+ meekwanụ onwe unu ka unu dị ọcha, gbanweekwanụ ákwà mgbokwasị unu,+
15 ka gị na ndị bi n’ala ahụ wee ghara ịgba ndụ, n’ihi na ha na chi ha ga na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ,+ ha ga na-achụkwara chi ha àjà,+ mmadụ ga-akpọkwa gị, i wee rie ihe ha chụrụ n’àjà.+
30 “Ya mere, gwa ụlọ Izrel, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ̀ bụ n’ụzọ nna nna unu hà ka unu na-emerụ onwe unu,+ ọ̀ bụkwa ihe arụ ha ka unu na ha na-akwa iko?+