27 N’eziokwu, ọ masịrị ha ime otú ahụ, ma ha jikwa ha ụgwọ; n’ihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eketawo òkè n’ihe ime mmụọ ha,+ ha jikwa ụgwọ iwere ihe anụ ahụ́ jeere ndị a ozi n’ihu ọha.+
9 N’ezie, ụmụnna anyị, unu na-echeta ọrụ anyị rụsiri ike na ndọlị anyị dọlịrị. Ọ bụ site n’ịrụ ọrụ+ abalị na ehihie ka anyị kwusaara unu ozi ọma Chineke, ka anyị wee ghara ibo onye ọ bụla n’ime unu oké ibu arọ.+