19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya.+ Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa,+ kama ahọpụtara m unu n’ụwa, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.+
2 Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka+ usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ,+ ka unu wee chọpụta n’onwe unu+ ihe bụ́ uche+ Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.