24 N’ihi na Kraịst ụgha+ na ndị amụma ụgha+ ga-ebili, ha ga-emekwa ihe ịrịba ama+ na ihe ijuanya dị ukwuu ka ha wee duhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.+
2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.
18 Ụmụntakịrị, ọ bụ oge awa ikpeazụ,+ dịkwa nnọọ ka unu nụrụ na onye na-emegide Kraịst na-abịa,+ ọbụna ugbu a, e nwewo ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst;+ nke bụ́ ihe anyị ji mara na ọ bụ oge awa ikpeazụ.
2 ‘Amaara m ihe ndị ị na-eme,+ na ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ na ntachi obi i nwere, amakwaara m na ị pụghị ịnabata ndị ọjọọ, na ị na-anwalekwa+ ndị na-asị na ha bụ ndịozi,+ ma ha abụghị, i wee chọpụta na ha bụ ndị ụgha.