14 Chineke wee gwa Mozis, sị: “M GA-ABỤ IHE M CHỌRỌ ỊBỤ.”+ O kwukwara, sị: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ụmụ Izrel, ‘M GA-ABỤ ezitewo m ka m bịakwute unu.’”+
4 Jọn na-edegara ọgbakọ asaa+ dị ná mpaghara Eshia akwụkwọ:
Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo nke si n’aka “Onye ahụ dị adị na onye dịbu adị na onye na-abịa”+ dịrị unu, nke sikwa n’aka mmụọ asaa+ ahụ nọ n’ihu ocheeze ya,
5 M wee nụ ka mmụọ ozi nke na-elekọta mmiri na-asị: “Gị Onye dị adị na onye dịbu adị,+ Onye na-eguzosi ike n’ihe,+ bụ onye ezi omume, n’ihi na i mewo mkpebi ndị a,+