8 kama unu ga-anata ike+ mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà+ m ma na Jeruselem+ ma na Judia dum nakwa na Sameria,+ ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”+
9 Mụ onwe m bụ́ Jọn, nwanna unu na onye unu na ya na-eketa òkè ná mkpagbu+ na alaeze+ na ntachi obi+ ná mmekọrịta anyị na Jizọs,+ wee nọrọ n’agwaetiti a na-akpọ Patmọs n’ihi ikwu banyere Chineke na ịgbara Jizọs àmà.+
9 Mgbe o meghere nke ise n’ime ihe ndị ahụ a kara akara, ahụrụ m, n’okpuru ebe ịchụàjà ahụ,+ mkpụrụ obi+ nke ndị e gburu+ n’ihi okwu Chineke nakwa n’ihi ọrụ ịgba àmà+ ha nọ na-arụ.