7 Ọ* ga-ekwupụta+ mmehie o* mere ma kwụchaa ụgwọ o kwesịrị ịkwụ maka ikpe mara ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ụgwọ ahụ.+ Ọ ga-enye ya onye o mejọrọ.
9 Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume niile+ n’ihi na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume.