-
Ọnụ Ọgụgụ 32:16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Ha mechara bịakwute ya, sị: “Ka anyị jiri nkume gbaara anụ ụlọ anyị ogige, rụọkwara ụmụ anyị obodo.
-
-
Ọnụ Ọgụgụ 32:34-38Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 Ụmụ Gad wee rụọ* Daịbọn,+ Atarọt,+ Aroa,+ 35 Atrọt-shofan, Jeza,+ Jọg-beha,+ 36 Bet-nimra,+ na Bet-heran,+ bụ́ obodo ndị a rụsiri ike. Ha jikwa nkume gbaara anụ ụlọ ha ogige. 37 Ụmụ Ruben rụrụ Heshbọn,+ Iliele,+ Kiriateyim,+ 38 Nibo,+ na Bel-mion+ (a gbanwere aha ha agbanwe) nakwa Sibma. Ha malitere ịgụgharị obodo ndị ahụ ha rụrụ aha.
-