21 Ihe ndị a bụ ihe ndị e ji rụọ ụlọikwuu ahụ, bụ́ ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.*+ Mosis nyere iwu ka e depụta ihe ndị a n’akwụkwọ. Ọ bụ ndị Livaị ka e nyere ọrụ idepụta ha.+ Ọ bụkwa Ịtama+ nwa Erọn onye nchụàjà duziri ha.
8 Ha ga na-elekọta arịa niile+ e ji eje ozi n’ụlọikwuu nzute, na-arụkwara ndị Izrel ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ha. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eje ozi dị iche iche gbasara ụlọikwuu ahụ.+