5 Chineke wee kpọpụta Ebram n’èzí, sị ya: “Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha ọnụ.” Chineke sịziri ya: “Otú a ka ụmụ* gị ga-adị ọtụtụ.”+
26 Nwoke ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa, nyere ọkara shekel, nke bụ́ ọkara shekel ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya.+ Ụmụ nwoke ndị ahụ dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+
64 Ma n’ime ndị a Mosis na Erọn onye nchụàjà debara aha ha n’akwụkwọ, e nweghị onye n’ime ha so ná ndị Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ n’ala ịkpa Saịnaị.+