17 Ọ bụrụ na unu efee ha, Jehova ga-ewesa unu ezigbo iwe. Ọ ga-emechi eluigwe ka mmiri ghara izo,+ ala agaghịkwa emepụta ihe. Unu ga-anwụkwa ọsọ ọsọ n’ezigbo ala ahụ Jehova na-enye unu.+
17Ịlaịja,*+ onye Tishbe, nke dị na Gilied,+ wee sị Ehab: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe,* na-aṅụ iyi na igirigi agaghị ada, mmiri agaghịkwa ezo ruo afọ ole na ole, ọ gwụkwala ma m̀ kwuru ka o zoo.”+