21Jehova chetara Sera otú o kwuru. Jehova meere Sera ihe o kwere ná nkwa.+2 Sera wee dị ime,+ mụọrọ Ebreham nwa nwoke mgbe Ebreham merela agadi. Ọ mụrụ nwa ahụ kpọmkwem n’oge Chineke kwere ya nkwa na Sera ga-amụ nwa.+
19 Elkena na ezinụlọ ya wee bilie n’isi ụtụtụ, kpọọrọ Jehova isiala. Mgbe ha mechara, ha laghachiri n’ụlọ ha na Rema.+ Elkena na Hana nwunye ya wee nwee mmekọahụ, Jehova echetakwa Hana.+