50 Ị ga-ahọpụta ndị Livaị ka ha na-elekọta ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya+ na arịa ya niile na ihe niile a rụrụ maka ya.+ Ha ga na-ebu ụlọikwuu ahụ na arịa ya niile,+ ha ga na-ejekwa ozi na ya.+ Ha ga-ebi n’ụlọikwuu ha ndị ha ga-ama gburugburu ụlọikwuu ahụ.+