3 Ka e too Chineke, bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,+ na Nna na-emetere ndị mmadụ ebere,+ Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ.+
11 Anyị na-asị na ndị tachiri obi+ na-enwe obi ụtọ.* Unu anụla otú Job si tachie obi,+ hụkwa ihe Jehova* mechara mee.+ Unu ejirikwala ya mata na ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova* n’obi, nakwa na ọ na-eme ebere.+