44 Ma, ana m asị unu: Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya,+ na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu,+ 45 ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe,+ n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma. Ọ na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.+