-
1 Samuel 26:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ma, Devid sịrị Abishaị: “Akpakwala ya aka, n’ihi na a gaghị asị na aka mmadụ ka dị ọcha+ ma ọ bụrụ na onye ahụ kpara onye Jehova tere mmanụ aka.”+ 10 Devid kwukwara, sị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na ma ọ́ bụghị na Jehova ga-eji aka ya gbuo ya,+ ya abụrụ na otu ụbọchị+ ọ ga-anwụ otú ndị ọzọ si anwụ, ma ọ bụkwanụ na ọ ga-aga agha, agha ahụ ataa isi ya.+
-