-
Daniel 7:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 “Anọ m na-ele anya ruo mgbe a dọsara ocheeze dị iche iche. Onye Ochie ahụ+ wee nọdụ ọdụ.+ Uwe ya na-enwu ọcha ka snoo.+ Ntutu isi ya dị ka owu dị ọcha. Ocheeze ya bụ ire ọkụ ire ọkụ. Ụkwụ ocheeze ya bụ ọkụ na-ere ere.+ 10 Ọkụ nke na-asọ asọ ka mmiri si n’ihu ocheeze ya na-asọpụta.+ Puku kwuru puku ndị mmụọ ozi nọ na-ejere ya ozi, iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi guzokwa n’ihu ya.+ Ụlọikpe a+ malitere ikpe ikpe, a saghekwara akwụkwọ dị iche iche.
-