-
Aịzaya 46:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 E nwere ndị na-anaghị eji ọlaedo dị n’akpa ha eme ihe bara uru.
Ha na-eji ihe e ji atụ̀ ihe atụ ọlaọcha.
Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, ya ejiri ọlaọcha ahụ kpụọrọ ha chi,+
Ha akpọwaziere ya isiala, fewekwa ya.+
Ha na-eburu ya busa ebe ọ ga na-adị, ya akwụrụ ebe ahụ.
Ọ naghị esi ebe ahụ apụ.+
Ndị mmadụ na-eti mkpu, na-arịọ ya arịrịọ, ma ọ naghị atụpụrụ ha ọnụ.
O nweghị ike ịnapụta onye na-ata ahụhụ.+
-