-
Mak 10:17-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Mgbe ọ na-aga n’ụzọ, otu nwoke gbakwuuru ya ma gbuo ikpere n’ala n’ihu ya, jụọ ya, sị: “Ezigbo Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?”+ 18 Jizọs sịrị ya: “Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye? E nweghị onye bụ́ ezigbo onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.+ 19 Ị manụ ihe ndị e nyere n’iwu, ya bụ: ‘Egbula mmadụ,*+ akwala iko,+ ezula ohi,+ agbala akaebe ụgha,+ erigbula mmadụ,+ sọpụrụ nne gị na nna gị.’”+ 20 Nwoke ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, m na-edebe iwu a niile kemgbe m bụ nwata.” 21 Jizọs lere ya anya ma nwee mmasị n’ebe ọ nọ,* wee sị ya: “E nwere otu ihe ị ka ga-eme: Gaa ree ihe ndị i nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe. Bịazie bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 22 Ma ihe a Jizọs zara ya adịghị ya mma. O wutere ya, ya alawa, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe.+
-
-
Luk 18:18-23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Otu n’ime ndị na-achị achị wee jụọ ya, sị: “Ezigbo Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?”+ 19 Jizọs asị ya: “Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye? E nweghị onye bụ́ ezigbo onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.+ 20 Ị manụ ihe ndị e nyere n’iwu: ‘Akwala iko,+ egbula mmadụ,*+ ezula ohi,+ agbala akaebe ụgha,+ sọpụrụ nne gị na nna gị.’”+ 21 O wee sị: “M na-edebe iwu a niile kemgbe m bụ nwata.” 22 Mgbe Jizọs nụrụ ihe o kwuru, ọ sịrị ya: “E nwere otu ihe ị ka ga-eme: Ree ihe niile i nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe. Bịazie bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 23 Mgbe ọ nụrụ ihe a, o wutere ya nnọọ, n’ihi na ọ bara ezigbo ọgaranya.+
-