-
Matiu 19:16-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Ma, otu onye bịakwutere ya wee sị ya: “Onye Ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?”+ 17 O wee sị ya: “Gịnị mere i ji ajụ m ihe bụ́ ezi ihe? Naanị otu onye bụ ezi onye.+ Ma ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi, na-edebe ihe ndị e nyere n’iwu.”+ 18 Ọ sịrị ya: “Olee ndị ọ bụ?” Jizọs wee sị ya: “Egbula mmadụ,*+ akwala iko,+ ezula ohi,+ agbala akaebe ụgha,+ 19 sọpụrụ nne gị na nna gị,+ na hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”+ 20 Nwa okorobịa ahụ wee sị ya: “M na-edebe iwu a niile. Gịnị ọzọ ka m kwesịrị ime?” 21 Jizọs sịrị ya: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka i zuo okè, gaa ree ihe i nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe.+ Bịazie bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 22 Mgbe nwa okorobịa ahụ nụrụ ihe a, o wutere ya, ya alawa, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe.+
-
-
Mak 10:17-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Mgbe ọ na-aga n’ụzọ, otu nwoke gbakwuuru ya ma gbuo ikpere n’ala n’ihu ya, jụọ ya, sị: “Ezigbo Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?”+ 18 Jizọs sịrị ya: “Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye? E nweghị onye bụ́ ezigbo onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.+ 19 Ị manụ ihe ndị e nyere n’iwu, ya bụ: ‘Egbula mmadụ,*+ akwala iko,+ ezula ohi,+ agbala akaebe ụgha,+ erigbula mmadụ,+ sọpụrụ nne gị na nna gị.’”+ 20 Nwoke ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, m na-edebe iwu a niile kemgbe m bụ nwata.” 21 Jizọs lere ya anya ma nwee mmasị n’ebe ọ nọ,* wee sị ya: “E nwere otu ihe ị ka ga-eme: Gaa ree ihe ndị i nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe. Bịazie bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 22 Ma ihe a Jizọs zara ya adịghị ya mma. O wutere ya, ya alawa, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe.+
-
-
Luk 10:25-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ma, otu nwoke ma Iwu biliri ka ọ nwaa ya, wee sị ya: “Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”+ 26 Ya asị ya: “Gịnị ka e dere n’Iwu? Gịnị ka ị gụtara?” 27 Ya azaa, sị: “‘Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile na ike gị niile na uche gị niile hụ Jehova* bụ́ Chineke gị n’anya,+ hụkwa ‘onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.’”+ 28 O wee sị ya: “Ị zatara ya. Na-eme ya, ị ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.”+
-