44 Ọ gwaziri ha, sị: “Ihe ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ,+ na ihe niile e dere gbasara m n’Iwu Mosis, n’Akwụkwọ Ndị Amụma, nakwa n’Abụ Ọma ga-emezurịrị.”+
23 E nyefere nwoke a n’aka unu otú Chineke zubere nakwa otú o bu ụzọ mara na a ga-eme ya.+ Ebe unu nyefere ya n’aka ndị na-emebi iwu, ọ bụ unu kpọgidere ya n’osisi, gbuokwa ya.+