5 Mgbe ndị mba ọzọ na ndị Juu nakwa ndị na-achị ha kpara nkata imenye ha ihere na ịtụ ha nkume,+ 6 a gwara ha gbasara ya, ha agbaga n’obodo ndị dị na Likeonia, ya bụ, Listra na Dabe na obodo ndị dị ha gburugburu.+ 7 Ha nọkwa na-ezisa ozi ọma n’ebe ndị ahụ.