Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 19
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Ehi na-acha ọbara ọbara na mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha (1-22)

Ọnụ Ọgụgụ 19:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 22:20; Mal 1:14

Ọnụ Ọgụgụ 19:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Hib 9:13, 14

Ọnụ Ọgụgụ 19:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 4:11, 12

Ọnụ Ọgụgụ 19:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 51:7

Ọnụ Ọgụgụ 19:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Hib 9:13, 14
  • +Ọg 19:13, 21

Ọnụ Ọgụgụ 19:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 12:49; Le 24:22; Ọg 15:15

Ọnụ Ọgụgụ 19:11

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ozu mkpụrụ obi ọ bụla bụ́ mmadụ.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 21:1, 11; Ọg 5:2; 6:9; 9:6; 31:19

Ọnụ Ọgụgụ 19:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “A ga-egbupụ mkpụrụ obi ahụ n’Izrel.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 15:31
  • +Le 22:3; Hib 10:28
  • +Ọg 19:9

Ọnụ Ọgụgụ 19:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 11:31, 32

Ọnụ Ọgụgụ 19:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 19:11; 31:19

Ọnụ Ọgụgụ 19:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ndị.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 19:9
  • +Ọm 51:7

Ọnụ Ọgụgụ 19:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Ọ ga-asachapụ ya mmehie.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 14:9; Ọg 19:12; 31:19

Ọnụ Ọgụgụ 19:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “a ga-egbupụ mkpụrụ obi ahụ n’ọgbakọ ahụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 19:13

Ọnụ Ọgụgụ 19:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 19:18; Hib 9:9, 10, 13, 14

Ọnụ Ọgụgụ 19:22

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 15:4, 5

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 19:2Le 22:20; Mal 1:14
Ọnụ Ọgụ. 19:4Hib 9:13, 14
Ọnụ Ọgụ. 19:5Le 4:11, 12
Ọnụ Ọgụ. 19:6Ọm 51:7
Ọnụ Ọgụ. 19:9Hib 9:13, 14
Ọnụ Ọgụ. 19:9Ọg 19:13, 21
Ọnụ Ọgụ. 19:10Ọp 12:49; Le 24:22; Ọg 15:15
Ọnụ Ọgụ. 19:11Le 21:1, 11; Ọg 5:2; 6:9; 9:6; 31:19
Ọnụ Ọgụ. 19:13Le 15:31
Ọnụ Ọgụ. 19:13Le 22:3; Hib 10:28
Ọnụ Ọgụ. 19:13Ọg 19:9
Ọnụ Ọgụ. 19:15Le 11:31, 32
Ọnụ Ọgụ. 19:16Ọg 19:11; 31:19
Ọnụ Ọgụ. 19:18Ọg 19:9
Ọnụ Ọgụ. 19:18Ọm 51:7
Ọnụ Ọgụ. 19:19Le 14:9; Ọg 19:12; 31:19
Ọnụ Ọgụ. 19:20Ọg 19:13
Ọnụ Ọgụ. 19:21Ọg 19:18; Hib 9:9, 10, 13, 14
Ọnụ Ọgụ. 19:22Le 15:4, 5
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 19:1-22

Ọnụ Ọgụgụ

19 Jehova gwakwara Mosis na Erọn, sị: 2 “Ihe a bụ iwu Jehova nyere: ‘Gwa ndị Izrel ka ha kpụtara gị nne ehi ahụ́ dị mma, nke na-acha ọbara ọbara, nke na-enweghịkwa nkwarụ ọ bụla,+ nke a na-anyakwasịtụbeghị yok. 3 Unu ga-akpụnye ya Elieza onye nchụàjà. Ọ ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kpụpụ ya, a ga-egbukwa ya n’ihu ya. 4 Elieza onye nchụàjà ga-ejizi mkpịsị aka ya rụrụtụ ọbara nne ehi ahụ ma fesa ọbara ya n’ihu ụlọikwuu nzute.+ Ọ ga-eme ya ugboro asaa. 5 A ga-akpọzi nne ehi ahụ ọkụ n’ihu ya. A ga-akpọ akpụkpọ ya na anụ ya na ọbara ya na nsị ya ọkụ.+ 6 Onye nchụàjà ga-ewere osisi sida, ahịhịa hisop,+ na ákwà na-acha uhie uhie ma tụba ha n’ọkụ ahụ na-ere nne ehi ahụ. 7 Onye nchụàjà ga-ejizi mmiri sụọ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. E mechaa, ọ ga-abata n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ma onye nchụàjà ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.

8 “‘Onye kpọrọ nne ehi ahụ ọkụ ga-asa uwe ya mmiri, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.

9 “‘Nwoke dị ọcha ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kporo ntụ nne ehi ahụ+ pụọ gaa kposa n’ebe dị ọcha. Nzukọ Izrel ga-edosa ya ka e jiri ya na-akwadebe mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha.+ Ọ bụ àjà mmehie. 10 Onye kpokọtara ntụ nne ehi ahụ ga-asa uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.

“‘Ọ ga-abụrụ ndị Izrel na onye mbịarambịa binyeere ha iwu ga-adịgide adịgide.+ 11 Onye ọ bụla nke metụrụ onye ọ bụla nwụrụ anwụ* aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa.+ 12 Onye ahụ ga-eji mmiri ahụ mee onwe ya ka ọ dị ọcha n’ụbọchị nke atọ. Ọ ga-adịkwa ọcha n’ụbọchị nke asaa. Ma ọ bụrụ na o meghị onwe ya ka ọ dị ọcha n’ụbọchị nke atọ, ọ gaghị adị ọcha n’ụbọchị nke asaa. 13 Onye ọ bụla nke metụrụ ozu onye nwụrụ anwụ aka ma ghara ime onwe ya ka ọ dị ọcha emerụọla ụlọikwuu Jehova.+ A ga-egbu ya.*+ Ebe ọ bụ na e fesaghị ya mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha,+ ọ ka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.

14 “‘Ihe a bụ iwu a ga-edebe ma ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ime ụlọikwuu: Onye ọ bụla batara n’ụlọikwuu ahụ na onye ọ bụla nọ n’ụlọikwuu ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa. 15 Arịa ọ bụla ghe oghe, nke a na-ekwuchighị ekwuchi ma jiri eriri kechie ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.+ 16 Onye ọ bụla nke nọ n’èzí metụ onye e ji mma agha gbuo aka ma ọ bụ metụ ozu onye nwụụrụ onwe ya aka ma ọ bụ metụ ọkpụkpụ mmadụ ma ọ bụ ili aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa.+ 17 Ha ga-ekporotụ ntụ anụ ahụ a kpọrọ ọkụ e ji chụọ àjà mmehie ka e jiri ya mee ka onye ahụ na-adịghị ọcha dị ọcha. A ga-ekponyetụ ntụ ahụ n’efere ma wụnye ya mmiri e kutere n’iyi. 18 Nwoke dị ọcha+ ga-ewerezi ahịhịa hisop,+ sụnye ya n’ime mmiri ahụ ma fesa ya n’ụlọikwuu ahụ nakwa n’arịa niile dị n’ime ya, fesakwa ya ndị* nọ n’ebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya onye ahụ metụrụ ọkpụkpụ ma ọ bụ onye e gburu egbu ma ọ bụ ozu onye nwụụrụ onwe ya ma ọ bụ ili aka. 19 Onye ahụ dị ọcha ga-efesa ya n’ahụ́ onye ahụ na-adịghị ọcha n’ụbọchị nke atọ nakwa n’ụbọchị nke asaa. Ọ ga-eme ka ọ dị ọcha* n’ụbọchị nke asaa.+ Onye ahụ na-adịghị ọcha ga-asụzi uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-adịkwa ọcha ná mgbede.

20 “‘Ma onye na-adịghị ọcha, nke na-emeghị onwe ya ka ọ dị ọcha, a ga-egbu ya*+ n’ihi na o merụọla ebe nsọ Jehova. E fesaghị ya mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha. N’ihi ya, ọ dịghị ọcha.

21 “‘Ihe a ga-abụrụ ha iwu ga-adịgide adịgide: Onye na-efesa mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha+ ga-asụ uwe ya. Onye metụkwara mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 22 Ihe ọ bụla onye ahụ na-adịghị ọcha metụrụ aka ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Onye* metụkwara ihe ahụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.’”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya