HABAKỌK
1 Ihe a bụ ozi gbara ọkpụrụkpụ mụnwa, bụ́ Habakọk* onye amụma, nụrụ mgbe m na-ahụ ọhụụ. M kwuru, sị:
2 Jehova, olee mgbe m ga-etiru mkpu ka i nyere m aka, gị anụ?+
Olee mgbe m ga-arịọru gị ka ị napụta m n’aka ndị tigbuo zọgbuo, gị anapụta m?*+
3 Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ndị na-eme ihe ọjọọ?
Gịnịkwa mere i ji hapụ ndị na-emegbu ndị ọzọ?
Gịnị mere m ji na-ahụ ndị na-emebisị ihe ndị mmadụ na ndị tigbuo zọgbuo?
Gịnịkwa mere e ji na-ese okwu ma na-alụ ọgụ ebe niile?
4 N’ihi ya, o nweghị onye na-edebe iwu,
A naghịkwa ekpe ikpe ziri ezi.
Ndị ajọ omume gbara ndị ezi omume gburugburu.
Ọ bụ ya mere na a naghịzi ekpe ikpe ziri ezi.+
5 “Leenụ anya ná mba niile, hụkwanụ ihe na-eme.
Kporopụnụ anya na-ele ha, ka o jukwa unu anya.
N’ihi na o nwere ihe ga-eme n’oge unu
Nke unu na-agaghị ekweta ọ bụrụgodị na a gwa unu ya.+
6 E nwere ihe m ga-eji ndị Kaldia mee.*+
Ha bụ mba obi fere azụ na ndị na-eme ihe ọkụ ọkụ.
Ha na-aga ọtụtụ ebe n’ụwa
Na-eweghara ụlọ ndị na-abụghị nke ha.+
7 Ha dị egwu, a na-atụkwa ha ụjọ.
Ọ bụ ha na-etiri onwe ha iwu, na-enyekwa onwe ha ikike.*+
Ịnyịnya agha ha na-awụ ajọ ọsọ.
Ịnyịnya ha na-esi ebe dị anya abịa.
Ha na-efe ọsọ abịa ka mgbe ugo ji ike na-efedata ka o rie ihe.+
9 Ha niile na-abịa ka ha mebisịa ihe.+
Ha niile gakọọ ọnụ, ha na-adị ka ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ.+
Ha na-ekpokọrọkwa ndị ha dọọrọ n’agha otú e si ekporo ájá.
Ha na-achị ebe ọ bụla a rụsiri ike ọchị.+
Ha na-ekpokọta ájá ma weghara ebe ahụ.
11 Ha na-aga n’ihu n’ihu ka ifufe, gaferekwa ala ahụ.
Ma ikpe ga-ama ha+
N’ihi na ha kwuru na ọ bụ chi ha nyere ha ike.”*+
12 Jehova, ọ́ bụghị kemgbe ebighị ebi ka ị dị?+
Chineke m, Onye Nsọ m, ị naghị anwụ anwụ.*+
Jehova, ị họpụtara ha ka ha mee ihe i kpebiri.
Oké Nkume m,+ ọ bụ maka ịta anyị ahụhụ* ka i ji mee ka ha dịrị.+
13 Anya gị dị ezigbo nsọ nke na ọ naghị ele ihe ọjọọ.
I nweghịkwa ike ịhapụ ihe ọjọọ ka ọ dịrị na-aga.+
Gịnịzi mere i ji hapụ ndị aghụghọ?+
Gịnịkwa mere i ji na-agbachi nkịtị mgbe onye ajọ omume na-eloda onye ka ya mma?+
14 Gịnị mere i ji hapụ ka a na-eme ndị mmadụ ka hà bụ azụ̀ dị n’oké osimiri?
Gịnịkwa mere i ji hapụ ka a na-eme ha ka hà bụ ihe ndị na-arị arị* na-enweghị onye na-achị ha?
15 Ha* na-eji nko azụ̀ adọpụta ihe a niile.
Ha na-eji ụgbụ ha ejide ha,
Ha na-achịkọtakwa ha n’ụgbụ ha ji akụ azụ̀.
Ọ bụ ya mere ha ji na-aṅụrị ezigbo ọṅụ.+
16 Ọ bụ ya mere ha ji achụrụ ụgbụ ha àjà,
Na-achụkwara ụgbụ ha ji akụ azụ̀ àjà.
N’ihi na ụgbụ ha na-eme ka òkè ha hie nne,*
Na-emekwa ka nri ha na-edozi ahụ́.
17 Ọ̀ bụ ya mere ha ga na-eji awụpụ ihe ndị dị n’ụgbụ ha?*
Hà ga na-ala mba dị iche iche n’iyi n’emereghị ha ebere?+
2 M ga na-eguzo ebe m na-anọ eche nche.+
M ga na-anọkwa n’elu mgbidi siri ike.
M ga na-eche nche ka m hụ ihe ọ ga-esi n’ọnụ m kwuo
Nakwa ihe m ga-aza ma ọ dọọ m aka ná ntị.
2 Jehova wee sị m:
“Dee ọhụụ a edee, depụtakwa ya nke ọma n’elu mbadamba nkume,+
3 N’ihi na ọhụụ a ga-emezu n’oge a kara aka.
Oge ọ ga-emezu jikwa ọsọ na-eru. Ọ gaghịkwa agha ụgha.
Ọ bụrụgodị na o gbuo oge,* na-atụ anya ya.*+
N’ihi na ọ ga-emezurịrị.
Ọ gaghị anọ ọdụ.
Ọ bụghị ezigbo mmadụ.
Ma onye ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe.+
5 N’eziokwu, mmanya dị aghụghọ.
Ọ bụrụ na ọ na-egbu onye dị mpako, ihe agaghị agaziri onye ahụ.
Onye ahụ na-eme onwe ya ka agụụ na-agụ ya* otú o si agụ ili.*
Ọ dị ka ọnwụ, afọ anaghịkwa eju ya eju.
Ọ na-akpọkọta mba niile,
Na-akpọkọtakwara onwe ya ndị niile.+
6 Ndị a niile há agaghị eji ya na-atụ ilu, na-akwa ya emo, jirikwa ya na-eme ihe ọchị?+
Ha ga-asịkwa,
‘Onye na-akwakọta ihe na-abụghị nke ya ga-ata ahụhụ.
Olee mgbe ọ ga-emeru ihe a?
Ọ ga-ata ahụhụ n’ihi na ọ na-ekotere onwe ya nnukwu ụgwọ.
7 Ọ̀ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị ebili na mberede bịa mesie gị ike?
Ha ga-eteta bịa nusie gị aka ike.
Ha ga-akwakọrọkwa ihe niile i nwere.+
8 Ebe ọ bụ na ị kwakọọrọ ihe ọtụtụ mba,
Ndị niile fọdụrụ ná mba ndị ahụ ga-akwakọrọ ihe gị,+
N’ihi ndị mmadụ i gburu*
Nakwa n’ihi otú i si bibie ụwa,
Bibiekwa obodo dị iche iche na ndị niile bi na ha.+
9 Onye ji aghụghọ na-eritara ezinụlọ* ya uru,
Nke na-akpakwa akwụ́ ya n’ebe dị elu,
Ka e wee napụta ya n’ọdachi, ga-ata ahụhụ.
10 Ị kpaala nkata ọjọọ nke na-emenye ezinụlọ* gị ihere.
I mehiela n’ihi na i gbuola ọtụtụ ndị.+
11 Nkume ga-esi ná mgbidi bee ákwá.
Ogologo osisi ga-esikwa n’elu ụlọ soro ya bee ákwá.
13 Ọ́ bụghị Jehova nke ụsụụ ndị agha na-eme ka ndị mmadụ na-arụgbu onwe ha n’ọrụ maka ihe ọkụ ga-agba?
Ọ́ bụghịkwa ya na-eme ka mba dị iche iche rụtara onwe ha ike ọgwụgwụ n’efu?+
15 Onye ezigbo iwe ji,
Nke na-enyekwa ndị enyi ya mmanya ka mmanya gbuwe ha,
Ka o wee kirie ọtọ ha, ga-ata ahụhụ.
16 Ihere ga-eju unu afọ, ọ bụghị otuto.
Ṅụọnụ mmanya ka ndị mmadụ mata na e bighị unu úgwù.*
Jehova ga-eme ka unu ṅụọ mmanya dị n’iko o ji n’aka nri ya.+
Ùgwù unu ga-akpụkwa n’ala.
17 N’eziokwu, otú unu si bibie Lebanọn ka a ga-esi bibie unu.
Otú unu sikwa bibie anụ ọhịa dị iche iche ka a ga-esikwa bibie unu.
A ga-ebibikwa unu n’ihi ndị unu gburu*
Nakwa n’ihi otú unu si bibie ụwa,
Bibiekwa obodo dị iche iche na ndị bi na ha.+
18 Olee uru arụsị a pịrị apị bara,
Nke mere onye pịrị ya ji pịa ya?
Olee uru arụsị a kpụrụ akpụ na ụgha ọ na-akụzi bara,
N’agbanyeghị na onye kpụrụ ya tụkwasịrị ya obi,
Onye mere chi ndị na-abaghị uru, ndị na-anaghị ekwu okwu?+
19 Onye na-asị mkpirisi osisi: “Teta,” ga-ata ahụhụ.
Onye na-asịkwa nkume na-enweghị ike ikwu okwu: “Teta, kụziere anyị ihe,” ga-ata ahụhụ.
E ji ọlaedo na ọlaọcha machie ya.+
Ume ndụ ọ bụla adịghịkwa n’ime ya.+
20 Ma Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+
Ụwa niile, nọrọnụ duu n’ihu ya.’”+
3 Ekpere Habakọk onye amụma kpere, nke o kpere ka abụ iru uju:
2 Jehova, anụla m akụkọ gbasara gị.
Jehova, ihe i mere emenyela m ụjọ.
Meekwa ya ọzọ n’oge anyị.*
Mee ka a mara ya n’oge anyị.*
N’oge ị ga-eme ka ọgba aghara dị, cheta mee ebere.+
3 Chineke si na Timan bịa.
Onye Nsọ si n’Ugwu Peran bịa.+ (Sila)*
Ebube ya kpuchiri eluigwe.+
Ndị na-eto ya juru ebe niile n’ụwa.
4 Ìhè ya gbukepụrụ dị ka anyanwụ.+
Ìhè si ebe abụọ na-apụta n’aka ya,
Ebe ike ya zoro.
5 Ọrịa na-efe efe nọ na-aga n’ihu ya.+
Oké ahụ́ ọkụ sokwa ya n’azụ.
6 O guzo otu ebe mee ka ụwa maa jijiji.+
Anya o lere mere ka mba niile jiri ụjọ malie elu.+
E tidara ugwu ukwu niile dịwara kemgbe ụwa.
Ugwu nta niile dịwara kemgbe oge ochie dakwara.+
Otú a ka o si eme kemgbe ụwa.
7 Ahụrụ m nsogbu dị n’ụlọikwuu Kushan.
Ákwà ụlọikwuu Midian mara jijiji.+
8 Jehova, ọ̀ bụ osimiri ka ị na-ewesa iwe?
Ọ̀ bụ iyi ka ị na-ewesa iwe?
Ụgbọ ịnyịnya gị mere ka ndị gị merie.*+
9 I wepụtala ụta gị, jikerekwa ịgbapụ ya.
Mkpara* gị ejikerela ịrụ ọrụ ha otú ị ṅụrụ n’iyi. (Sila)
I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
10 Ugwu dị iche iche hụrụ gị maa jijiji n’ihi ihe mgbu.+
Oké mmiri ozuzo gafere.
Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda.+
Ọ tụliri mmiri ya elu.
11 Anyanwụ na ọnwa guzooro otu ebe n’ụlọ ha dị elu.+
Akụ́ gị nke na-egbuke egbuke gbapụrụ.+
Ube gị gburu ka àmụ̀mà.
12 I ji ezigbo iwe zọrọ ije gafere n’ụwa.
I ji iwe zọgbuo mba niile.*
13 Ị pụtara ka ị zọpụta ndị gị, ka ị zọpụta onye i tere mmanụ.
Ị kụriri onyeisi ụlọ onye ajọ omume.
Ị kụturu ụlọ ahụ si na ntọala ya ruo n’elu ya.* (Sila)
Ha si n’ebe ha zoro ṅụrụ ezigbo ọṅụ bịa ka ha bibie onye nọ n’ahụhụ.
15 I ji ịnyịnya gị gafee oké osimiri,
Ya bụ, nnukwu mmiri na-asọ asọ.
16 Amara m jijiji* mgbe m nụrụ ihe ndị a.
Egbugbere ọnụ m mara jijiji mgbe m nụrụ ụda ya.
Ọkpụkpụ m wee rewe ure.+
Ụkwụ m abụọ nọ na-ama jijiji.
Ma m ga-anọrọ nwayọọ chere ụbọchị ahụhụ,+
N’ihi na ọ bụ ụbọchị a ga-emesi ndị iro anyị ike.
17 Ọ bụ eziokwu na osisi fig nwere ike ghara ịma ifuru,
Osisi vaịn nwekwara ike ghara ịmị mkpụrụ,
Ọ bụ eziokwu na osisi oliv nwere ike ghara ịmị mkpụrụ,
Ala nwekwara ike ghara imepụta nri ọ bụla,
Ọ bụ eziokwu na ìgwè ewu na atụrụ ndị nọ n’ogige ha nwere ike nwụchaa,
E nwekwara ike a gaghị enwe ìgwè ehi n’ogige ha,
18 Ma mụnwa ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.
M ga-enwe aṅụrị n’ihi Chineke, onye nzọpụta m.+
19 Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị bụ ike m.+
Ọ ga-eme ka ụkwụ m na-awụ ọsọ ka ụkwụ mgbada,
Meekwa ka m jee ije n’ebe ndị dị elu.+
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara m kpọọ ya.
O nwere ike ịbụ na Habakọk pụtara “Ịmakụ Mmadụ nke Ọma.”
Ma ọ bụ “azọpụta m.”
Na Hibru, “M ga-eme ka ndị Kaldia bilie.”
Ma ọ bụ “na-ebulikwa onwe ha elu.”
O nwere ike ịbụ, “chi ha bụ ike ha.”
O nwere ike ịbụ, “anyị agaghị anwụ.”
Ma ọ bụ “maka ịdọ anyị aka ná ntị.”
Ma ọ bụ “ihe ndị na-akpụ akpụ.”
Ya bụ, ndị Kaldia bụ́ ndị iro ndị Izrel.
Na Hibru, “maa abụba.”
O nwere ike ịbụ, “ga na-eji amịpụta mma agha ha?”
Ma ọ bụ “Ka onye na-agụpụta ya wee gụọ ya were were.”
Ma ọ bụ “o yiri ka ọ̀ na-egbu oge.”
Ma ọ bụ “na-echesi ya ike.”
Ma ọ bụ “Lee, mkpụrụ obi ya afụliela onwe ya elu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ọbara ndị mmadụ ị wụfuru.”
Ma ọ bụ “obodo.”
Ma ọ bụ “obodo.”
Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”
O nwere ike ịbụ, “ka ndị mmadụ na-adagharị.”
Na Hibru, “ọbara ndị unu wụfuru.”
Na Hibru, “n’afọ ndị a.”
Na Hibru, “n’afọ ndị a.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “a zọpụta ndị gị.”
O nwere ike ịbụ, “Akụ́.”
Na Hibru, “zọchaa mba niile dị ka mkpụrụ.”
Na Hibru, “n’olu ya.”
Na Hibru, “mkpara.”
Na Hibru, “Afọ m mara jijiji.”