Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 1 p. 12-13
  • Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ga-ebibi Ndị Ajọ Omume
  • Chineke Ga-ebibi Ekwensu
  • Chineke Ga-eme Ka Ọnwụ na Ọrịa Kwụsị
  • Chineke Ga-eme Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs
  • Chineke Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • I Pụrụ Inwe Ọdịnihu Obi Ụtọ!
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Ndị Enyi Chineke Ga-Ebi Na Paradaịs
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 1 p. 12-13
Ebe ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ nọ n’udo n’ime paradaịs mara mma, nri jukwara ebe niile.

Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya

Chineke kwere nkwa na ihe niile ga-adị mma n’oge na-adịghị anya. Ọ ga-eme ka ahụhụ kwụsị, meekwa ka ndụ na-atọ mmadụ niile ụtọ n’ụwa. (Abụ Ọma 37:11) Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na nkwa a ga-emezu? Ọ bụ n’ihi na “Chineke abụghị mmadụ nkịtị nke na-agha ụgha.” (Ọnụ Ọgụgụ 23:19) Lee ihe ụfọdụ Chineke ga-eme.

Chineke Ga-ebibi Ndị Ajọ Omume

“Mgbe ndị ajọ omume na-eju ebe niile otú ahịhịa si epu ebe niile, ihe ana-agazikwara ndị niile na-eme ihe ọjọọ, ọ bụ ka e wee laa ha n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.”​—ABỤ ỌMA 92:7.

Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ihe na-akakwu njọ n’ụwa a. Ma, o kwesịghị iju anyị anya. A sị ka e kwuwe, Baịbụl bu ụzọ kwuo na 2 Timoti 3:​1-5 na ọ ga-adị otú a. Ọ sịrị na ndị mmadụ ga na-akpa àgwà ndị jọgburu onwe ha ‘n’oge ikpeazụ.’ Oge ikpeazụ nke gịnị? Nke ụwa a ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke juru na ya. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi ndị niile na-achọghị isepụ aka n’ihe ọjọọ ha na-eme. Mgbe ahụ, ọ bụ naanị ndị ezi mmadụ, ya bụ, ndị na-asọpụrụ Chineke, ga-afọdụ. “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—Abụ Ọma 37:29.

Chineke Ga-ebibi Ekwensu

“Chineke, onye na-eme ka anyị nwee udo, ga-azọpịa Setan.”​—NDỊ ROM 16:20.

E bibichaa ndị ọjọọ niile, ma Ekwensu ma ndị mmụọ ọjọọ ya, udo ga-adịzi n’ebe niile n’ụwa. Chineke kwere nkwa, sị: ‘E nweghị onye ga-emenye gị ụjọ.’​—Maịka 4:4.

Chineke Ga-eme Ka Ọnwụ na Ọrịa Kwụsị

“Ụlọikwuu nke Chineke dị ebe ụmụ mmadụ nọ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”​—MKPUGHE 21:​3, 4.

Ahụhụ na ọrịa ga-akwụsị n’ihi na Chineke ga-edozi nsogbu niile Ekwensu, Adam, Iv, na ezughị okè kpatara. Ihe a ga-emedị ka ‘ọnwụ gharazie ịdị.’ Ụmụ mmadụ ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-erubere ya isi ga-adị ndụ ebighị ebi. Ma, olee ebe ha ga-ebi?

Chineke Ga-eme Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs

“Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị. Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.”​—AỊZAYA 35:1.

Chineke bibichaa ndị ọjọọ niile, ụwa ga-aghọ Paradaịs. A ga-enwe ọtụtụ ogige ndị mara mma na ya, nri ga-ejukwa ebe niile. (Abụ Ọma 72:16) Oké osimiri dị iche iche, ọdọ mmiri dị iche iche, na osimiri dị iche iche ga-adị ọcha, ihe ndị dị ndụ ga-ejukwa n’ime ha. N’oge ahụ, o nwere ike o nweghịzi ebe ị ga na-anụ okwu bụ́ “imebi ikuku” ma ọ bụ “imebi mmiri.” Onye ọ bụla ga-arụ ụlọ nke aka ya, birikwa na ya. O nweghịzi onye ga-anọ n’enweghị ụlọ. Agụụ na ịda ogbenye ga-alakwa kpamkpam.​—Aịzaya 65:​21, 22.

Chineke Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

“Chineke ga-akpọlite ndị . . . nwụrụ anwụ.”​—ỌRỤ NDỊOZI 24:15.

Ị̀ ga-achọ ịhụ ndị nke gị nwụrụ anwụ ọzọ? Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ ọzọ n’ụwa a n’ime Paradaịs. Ị ga-amata ha, hanwa ga-amatakwa gị. Chegodị ụdị obi ụtọ unu niile ga-enwe mgbe ahụ. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na ihe a ga-eme? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl kwuru banyere ndị toro eto na ụmụaka a kpọlitere n’ọnwụ, ha na ndị ezinụlọ ha ebirikwa ọzọ. Ọtụtụ mgbe, Jizọs kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ n’ihu ọtụtụ ndị.​—Luk 8:​49-56; Jọn 11:​11-14, 38-44.

M Na-enwezi Obi Ụtọ Ugbu A

“Echetara m oge mbụ m nụrụ na ụwa ga-aghọ paradaịs, nakwa na ahụhụ, ọrịa, na ọnwụ agaghị adị na ya. M chịrị ọchị n’ime obi m n’ihi na m chere na ọ gaghị ekwe omume. Ma mgbe m mụwara Baịbụl, amụtara m ihe ndị mere ka obi sie m ike na ihe dị na Baịbụl bụ eziokwu nakwa na amụma ndị e buru na ya ga-emezu. M kwetasiri ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke. N’oge gara aga, ihu anaghị atọ m ọchị, anaghịkwa m enwe obi ụtọ. Ma, m na-enwezi obi ụtọ ugbu a. Ndị ezinụlọ m na ndị enyi m na-achọpụtakwa na ihe agbanweela n’ime ndụ m.”​—Ravi.

Ravi.

Mụtakwuo ihe ndị ọzọ:

Ị chọọ ịmatakwu banyere uche Chineke nke bụ́ ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa e mere ka ọ bụrụ paradaịs ruo mgbe ebighị ebi, gaa na jw.org/ig n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA, pịzie NDỤ NA ỌNWỤ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya