Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 17 p. 215-229
  • “Babilọn Adawo!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Babilọn Adawo!”
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọhụụ Siri Ike”
  • “Ọ Dawo”
  • Ịjụta Onye Nche ahụ Ihe
  • Chi Ejie n’Ọzara
  • Iso Onye Nche ahụ Na-eje Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jehova Ewedaa Obodo Dị Mpako Ala
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Okpukpe Ụgha—A Hụ Mbibi Ya Dị Ịrịba Ama Tupu O Mee
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 17 p. 215-229

Isi nke Iri na Asaa

“Babilọn Adawo!”

Aịsaịa 21:1-17

1, 2. (a) Gịnị bụ isiokwu nke Bible dum, ma olee isiokwu ọzọ dị n’Aịsaịa? (b) Olee otú Bible si kọwapụta isiokwu metụtara ọdịda nke Babilọn?

A PỤRỤ iji Bible tụnyere egwú mara nnọọ mma nke nwere isiokwu bụ́ isi na isiokwu nta ndị a na-ewebata iji mee ka ọ dịkwuo ụtọ. N’otu aka ahụ, Bible nwere isiokwu bụ́ isi—mwepụ nke ọbụbụeze Jehova n’ụta site n’ọchịchị Alaeze Mesaịa ahụ. O nwekwara isiokwu ndị ọzọ dị mkpa, ndị pụtara ugboro ugboro. Otu n’ime isiokwu ndị a bụ ọdịda nke Babilọn.

2 E webatara isiokwu ahụ n’Aịsaịa isi nke 13 na 14. Ọ pụtara ọzọ n’isi nke 21, pụtakwa ọzọ n’isi nke 44 na 45. Otu narị afọ ka e mesịrị, Jeremaịa kwuru okwu n’ụzọ sara mbara karị n’otu isiokwu ahụ, akwụkwọ Mkpughe wetakwara ya ná njedebe dị ịrịba ama. (Jeremaịa 51:60-64; Mkpughe 18:1–19:4) Ọ dị mkpa ka onye ọ bụla na-amụsi Bible ike chesie echiche ike banyere isiokwu ọzọ a dị n’Okwu Chineke. Aịsaịa isi nke 21 na-enye aka n’akụkụ a, n’ihi na ọ na-enyekwu nkọwa ndị na-akpali mmasị banyere ọdịda e buru n’amụma nke ike ọchịchị ụwa ahụ dị ike. Ka oge na-aga, anyị ga-ahụ na Aịsaịa isi nke 21 na-emesi isiokwu ọzọ dị mkpa nke Bible ike—isiokwu nke na-enyere anyị aka inyocha otú anyị si mụrụ anya taa dị ka ndị Kraịst.

“Ọhụụ Siri Ike”

3. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Babilọn “ọzara nke oké osimiri,” gịnịkwa ka utu aha ahụ na-egosi banyere ọdịnihu ya?

3 Aịsaịa isi nke 21 ji okwu na-agba àmà ihe ọjọọ wee malite: “Ibu e boro ọzara nke oké osimiri. Dị ka oké ifufe nke dị n’ime Negeb na-efebiga, n’ọzara ka o siworo bịa, site n’ala dị egwu.” (Aịsaịa 21:1) Osimiri Yufretis si n’etiti Babilọn gafere, mpaghara ya nke dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ dịkwa n’agbata oké osimiri abụọ ahụ bụ́ Yufretis na Taịgris. Ọ dịtụ anya site n’ebe oké osimiri ahụ dị kpọmkwem. Gịnị meziri e ji kpọọ ya “ọzara nke oké osimiri”? N’ihi na idei mmiri na-asọju n’ógbè Babilọn kwa afọ, na-eme ka e nwee “oké osimiri” sara mbara, nke apịtị na-ejupụta na ya. Otú ọ dị, ndị Babilọn achịkwawo ọzara a mmiri na-eju na ya site n’igwu ọwa mmiri dị iche iche, na ọdọ mmiri ndị nwere ọtụtụ njikọ. Ha ji nkà jiri mmiri a mere otu akụkụ nke ihe nchebe obodo ahụ. Ma, ọ dịghị ihe mmadụ rụrụ nke ga-azọpụta Babilọn n’ikpe Chineke. Ọ bụbu ọzara—ọ ga-aghọkwa ọzara ọzọ. Ọdachi na-aga ịdakwasị ya, ọ na-aga itiwapụ dị ka otu n’ime ajọ ifufe ndị na-efekwasị Israel mgbe ụfọdụ site n’ọzara ahụ na-atụ ụjọ nke dị n’ebe ndịda.—Tụlee Zekaraịa 9:14.

4. Olee otú ọhụụ dị ná Mkpughe banyere “Babilọn Ukwu ahụ” si agụnye “mmiri” na “ọzara,” gịnịkwa ka “mmiri” ahụ pụtara?

4 Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 14 nke akwụkwọ a, Babilọn oge ochie nwere ogbo ya n’oge a—“Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ná Mkpughe, a kọwakwara Babilọn Ukwu ahụ, na-ejikọta ya na “ọzara” na “mmiri.” E buuru Jọn onyeozi gaa n’ọzara iji gosi ya Babilọn Ukwu ahụ. A gwara ya na ọ “na-anọkwasị n’ọtụtụ mmiri” nke na-anọchite anya “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche.” (Mkpughe 17:1-3, 5, 15) Nkwado ọha na eze anọwo mgbe nile na-abụ isi ihe ji okpukpe ụgha ndụ, ma “mmiri” dị otú ahụ agaghị echebe ya n’ikpeazụ. Dị ka ogbo ya nke oge ochie, ọ ga-emecha tọgbọrọ chakoo, bụrụ nke e leghaara anya, na nke e bibiri.

5. Olee otú e si bịa mara Babilọn dị ka “onye nghọgbu” na “onye na-apụnara mmadụ ihe”?

5 N’oge Aịsaịa, Babilọn aghọbeghị ike ọchịchị ụwa, ma Jehova eburula ụzọ hụ na mgbe oge ya ruru, ọ ga-eji ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ọhụụ siri ike ka e gosiworo m; onye nghọgbu na-aghọgbu, onye na-apụnara mmadụ ihe na-apụnara mmadụ ihe.” (Aịsaịa 21:2a) N’ezie Babilọn ga-apụnara mba ndị o meriri ihe ma ghọgbuo ha, gụnyere Juda. Ndị Babilọn ga-ebibi Jerusalem, kwakọrọ ihe ndị dị n’ụlọukwu ya, ma kpụrụ ndị bi na ya gaa Babilọn. N’ebe ahụ, a ga-aghọgbu ndị a e ji eji na-enweghị onye inye aka, kwaa ha emo n’ihi okwukwe ha, ma ghara inye ha olileanya ịlaghachi n’ala nna ha.—2 Ihe E Mere 36:17-21; Abụ Ọma 137:1-4.

6. (a) Ize ume dị aṅaa ka Jehova ga-eme ka ọ kwụsị? (b) Olee mba ndị e buru amụma na ha ga-awakpo Babilọn, oleekwa otú nke a si mezuo?

6 Ee, Babilọn kwesịrị nnọọ inweta ‘ọhụụ a siri ike,’ nke ga-ewetara ya oge ihe isi ike. Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Rịgoo, gị Ilam; nọchigide n’agha, gị Midia; ize ume ya nile ka M meworo ka ọ kwụsị.” (Aịsaịa 21:2b) Ndị alaeze ukwu a dị aghụghọ na-emegbu ga-enwere onwe ha. N’ikpeazụ, ize ume ha nile ga-akwụsị! (Abụ Ọma 79:11, 12) Olee otú nnwere onwe a ga-esi bịa? Aịsaịa kpọrọ aha mba abụọ ga-awakpo Babilọn: Ilam na Midia. Narị afọ abụọ n’ihu, na 539 T.O.A., Saịrọs onye Peasia ga-eduru ndị agha jikọrọ aka nke Peasia na Midia gaa megide Babilọn. Banyere Ilam, ndị eze Peasia ga-eweghara ma ọ dịghị ihe ọzọ akụkụ ụfọdụ nke ala ahụ tupu 539 T.O.A.a N’ihi ya ndị agha Peasia ga-agụnye ndị Ilam.

7. Olee mmetụta nke ọhụụ Aịsaịa nwere n’ahụ ya, na-egosi gịnị?

7 Rịba ama otú Aịsaịa si kọwaa mmetụta ọhụụ a nwere n’ahụ ya: “N’ihi nke a ka úkwù m jupụtara ná mgbali; ahụ ụfụ ka m nwezuru, dị ka ahụ ụfụ nile nke nwanyị ime na-eme: agbagọrọ m agbagọ, m wee ghara ịnụ ihe; amara m jijiji, m wee ghara ịhụ ụzọ. Obi m akpafuwo, oké ọma jijiji emewo ka m tụọ egwu nke ukwuu: chi ojiji nke dị m ezi mma ka o meworo ka ọ ghọọrọ m ịma jijiji.” (Aịsaịa 21:3, 4) O yiri ka onye amụma ahụ ọ na-enwe mmasị na chi ojiji, oge dị mma iji tụgharịa uche n’ụzọ dị jụụ. Ma chi ojiji amakwaghị mma ugbu a, kama nke ahụ, ọ na-eweta nanị ụjọ, ahụ ụfụ, na ịma jijiji. Onye amụma ahụ na-enwe ahụ ụfụ dị ka nwanyị ime na-eme, obi ya ‘akpafuwokwa.’ Otu ọkà mmụta sụgharịrị nkebi okwu a ịbụ “obi m na-akụsi ike,” na-ekwu na okwu ahụ na-ezo aka ‘n’obi ịkụsi ike na n’ụzọ na-adịghị n’usoro.’ Gịnị kpatara ụdị obi erughị ala ahụ? Dị ka ihe àmà na-egosi, mmetụta Aịsaịa bụ amụma. N’abalị nke October 5/6, 539 T.O.A., ndị Babilọn ga-atụ ụdị ụjọ ahụ.

8. Dị ka e buru n’amụma, olee otú ndị Babilọn si mee omume, ọ bụ ezie na ndị iro ha nọ n’azụ mgbidi?

8 Ka chi na-eji n’ụbọchị ahụ ọdachi bịara, ụjọ adịtụghị ndị Babilọn n’uche ma ọlị. Ihe dị ka narị afọ abụọ tupu mgbe ahụ, Aịsaịa buru amụma, sị: “Ha na-edozi tebụl, chee nche, rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ.” (Aịsaịa 21:5a) Ee, Eze Belshaza ahụ dị mpako kpọrọ oriri. E doziri oche maka otu puku ndị isi ya, nakwa ọtụtụ ndị nwunye ya na ndị iko ya. (Daniel 5:1, 2) Ndị ahụ na-eme oriri oké mkpọtụ maara na e nwere ndị agha nọ n’azụ mgbidi, ma ha kwenyere na a pụghị ịwakpo obodo ha. Nnukwute mgbidi ya na ekpe ya miri emi mere ka imeri ya yie ihe na-agaghị ekwe omume; ọtụtụ chi ya mere ka ọ bụrụ ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche. Ya mere ka e ‘riwe ihe, ṅụwa ihe ọṅụṅụ’! Belshaza ṅụbigara mmanya ókè, ma eleghịkwa anya ọ bụghị nanị ya. Mkpa ọ dị ịkpọte ha n’ụra na-enye echiche na mmanya na-egbu ha, dị ka ihe Aịsaịa kwuziri na-egosi n’ụzọ amụma.

9. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka e ‘tee ọta mmanụ’?

9 “Bilienụ, ndị isi, teenụ ọta mmanụ.” (Aịsaịa 21:5b) Na mberede, nnọkọ oriri ahụ bịara ná njedebe. Ndị isi ahụ aghaghị ịkpọte onwe ha n’ụra! A kpọbatara Daniel meworo agadi n’ebe ahụ, ọ hụkwara otú Jehova si mee ka Eze Belshaza nke Babilọn nọrọ n’ụjọ nke yiri nke ahụ Aịsaịa kọwara. Ndị isi nke eze nọ ná mgbagwoju anya ka ndị agha Midia, Peasia, na Ilam, bụ́ ndị jikọrọ aka, na-akwada ihe nchebe nke obodo ahụ. E meriri Babilọn ngwa ngwa! Otú ọ dị, gịnị ka ‘ite ọta mmanụ’ pụtara? Mgbe ụfọdụ Bible na-ezo aka n’ebe eze na-achị mba nọ dị ka ọta ya n’ihi na ọ bụ onye nkwado na onye nchebe nke ala ahụ.b (Abụ Ọma 89:18) Ya mere amaokwu a dị n’Aịsaịa yiri ka ọ na-ebu amụma banyere mkpa ọ dị inwe eze ọhụrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na e gburu Belshaza “n’abalị ahụ.” N’ihi ya, ọ dị mkpa ka e ‘tee ọta mmanụ,’ ma ọ bụ ka a họpụta eze ọhụrụ.—Daniel 5:1-9, 30.

10. Nkasi obi dị aṅaa ka ndị na-efe Jehova na-enweta site ná mmezu nke amụma Aịsaịa banyere onye nghọgbu ahụ?

10 Ndị nile hụrụ ezi ofufe n’anya na-enweta nkasi obi site n’akụkọ a. Babilọn nke oge a, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, bụkwa onye nghọgbu na onye na-apụnara mmadụ ihe dị ka ogbo ya nke oge ochie. Ruo taa ndị ndú okpukpe na-akpa nkata ka a machibido Ndịàmà Jehova iwu, kpagbuo ha, ma ọ bụ nara ha ụtụ isi iji taa ha ahụhụ. Ma dị ka amụma a na-echetara anyị, Jehova na-ahụ omume aghụghọ nile dị otú ahụ, ọ gaghịkwa ekwe ka ha gabiga n’enyeghị ntaramahụhụ maka ha. Ọ ga-ebibi okpukpe nile na-adịghị anọchite anya ya nke ọma, ndị na-emegbukwa ndị ya. (Mkpughe 18:8) Ụdị ihe ahụ ọ̀ ga-ekwe omume? Nanị ịhụ otú e siwororịị mezuo ịdọ aka ná ntị o nyere banyere ọdịda nke ma Babilọn oge ochie ma ogbo ya nke oge a ga-ewuli okwukwe anyị elu.

“Ọ Dawo”

11. (a) Gịnị bụ ọrụ onye nche, ònyekwa nọworo na-arụsi ọrụ ike dị ka onye nche taa? (b) Gịnị ka ụgbọ ịnyịnya ibu na nke camel na-anọchite anya ha?

11 Jehova gwara onye amụma ahụ okwu ugbu a. Aịsaịa na-akọ, sị: “Otú a ka Onyenwe anyị sịworo m, Jee, guzo onye nche: ihe ọ ga-ahụ ka ọ ga-egosi.” (Aịsaịa 21:6) Okwu ndị a na-ewebata isiokwu ọzọ dị mkpa n’isiakwụkwọ a—nke onye nche. Nke a bụ ihe na-adọrọ mmasị nye ezi ndị Kraịst nile taa, n’ihi na Jisọs gbara ụmụazụ ya ume ịdị ‘na-eche nche.’ “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” akwụsịbeghị ịkọ ihe ọ na-ahụ banyere ịdị nso nke ụbọchị ikpe Chineke na ihe ize ndụ ndị dị n’ụwa a rụrụ arụ. (Matiu 24:42, 45-47) Gịnị ka onye nche ahụ Aịsaịa hụrụ n’ọhụụ hụrụ? “Ọ [hụrụ ụgbọ ịnyịnya na ìgwè ịnyịnya, NW], usuu ịnyịnya ibu, usuu camel, ọ ga-aṅa ntị na-aṅasi ntị ike nke ukwuu.” (Aịsaịa 21:7) Ụgbọ ịnyịnya ndị a n’otu n’otu, ma eleghị anya, na-anọchite anya ahịrị dị iche iche nke ụgbọ ịnyịnya ndị na-agbaga n’ọgbọ agha, na-awụ ọsọ ka ịnyịnya ndị a zụrụ azụ. Ụgbọ ịnyịnya ibu na nke camel, n’ụzọ dabara adaba, na-anọchite anya ike ọchịchị abụọ ahụ, bụ́ Midia na Peasia, ndị ga-ejikọ aka ọnụ mee mwakpo a. Ọzọkwa, akụkọ ihe mere eme na-anwapụta na usuu ndị agha Peasia ji ma ịnyịnya ibu ma camel lụọ agha.

12. Onye nche ahụ Aịsaịa hụrụ n’ọhụụ gosipụtara àgwà dịgasị aṅaa, ole ndị ka àgwà ndị a dịkwa mkpa taa?

12 A manyeziri onye nche ahụ ịkọ ihe ọ hụrụ. “O wee kpọọ dị ka ọdụm: sị, Onyenwe anyị, n’elu ụlọ nche ka mụ onwe m na-eguzo mgbe nile n’ehihie, na nche m ka a na-eme ka mụ onwe m guzo n’abalị nile: ma, lee, ugbu a ka usuu mmadụ na-abịa, ndị ịnyịnya na-eje abụọ abụọ.” (Aịsaịa 21:8, 9a) Onye nche ahụ a hụrụ n’ọhụụ ji obi ike kpọọ “dị ka ọdụm.” A chọrọ obi ike iji kwupụta ozi ikpe megide mba dị ike dị ka Babilọn. A chọkwara ihe ọzọ—ntachi obi. Onye nche ahụ nọgidere n’ebe ọ nọ na-eche nche ma n’ehihie ma n’abalị, n’akwụsịtụghị ịmụ anya. N’otu aka ahụ, obi ike na ntachi obi adịwo òtù onye nche na mgbe ikpeazụ a mkpa. (Mkpughe 14:12) Àgwà ndị a dị ezi ndị Kraịst nile mkpa.

13, 14. (a) Olee otú ihe si gaara Babilọn oge ochie, n’echiche dịkwa aṅaa ka e tipịara arụsị ya nile? (b) N’ụzọ dị aṅaa, ọ̀ bụkwa ole mgbe ka Babilọn Ukwu ahụ dara ụdị ọdịda ahụ?

13 Onye nche ahụ Aịsaịa hụrụ n’ọhụụ hụrụ ụgbọ ịnyịnya na-abịanụ. Gịnị ka ọ ga-akọ? “O wee zaa, sị, Ọ dawo, Babilọn adawo; ọzọ, arụsị nile a pịrị apị nke chi ya nile ka e tipịaruworo ala.” (Aịsaịa 21:9b) Lee akụkọ na-akpali akpali ọ bụ! Onye nghọgbu a na-apụnara ndị Chineke ihe emesịala daa!c Otú ọ dị, n’echiche dị aṅaa ka e tipịara arụsị nile a pịrị apị na chi nile nke Babilọn? Ndị Midia na ndị Peasia ahụ na-eme mwakpo hà ga-abanye n’ụlọ nsọ nile nke Babilọn ma kụrisie arụsị ya nile a na-apụghị ịgụta ọnụ? Ee e, ụdị ihe ahụ adịghị mkpa. A ga-akụrisi chi arụsị nile nke Babilọn n’echiche bụ́ na e gosiri na ike adịghị ha ichebe obodo ahụ. Babilọn ga-adakwa mgbe ọ na-enwekwaghị ike ịnọgide na-emegbu ndị Chineke.

14 Olee banyere Babilọn Ukwu ahụ? Site n’ịkpali mmegbu nke ndị Chineke n’oge Agha Ụwa Mbụ, o mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ruo oge ụfọdụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọrụ ime nkwusa ha kwụsị kpam kpam. A tụrụ onyeisi oche na ndị ọrụ ndị ọzọ a ma ama nke Watch Tower Society mkpọrọ n’ihi ebubo ụgha. Ma e nwere oké mgbanwe na 1919. A tọhapụrụ ndị ọrụ ahụ site n’ụlọ mkpọrọ, e mepeghachiri isi ụlọ ọrụ ahụ, a maliteghachiri ọrụ nkwusa ahụ. N’ụzọ dị otú a, Babilọn Ukwu ahụ dara n’ihi na ọ kwụsịrị ojiji o ji ndị Chineke.d Ná Mkpughe, otu mmụọ ozi ji okwu ndị dị n’ịma ọkwa ahụ dị n’Aịsaịa 21:9 kpọsaa ọdịda a ugboro abụọ.—Mkpughe 14:8; 18:2.

15, 16. N’echiche dị aṅaa ka ndị obodo Aịsaịa bụ “ihe nzọcha” ya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’omume Aịsaịa n’ebe ha nọ?

15 Aịsaịa ji inwe ọmịiko n’ebe ndị obodo ya nọ mechie ozi amụma a. Ọ sịrị: “Gị ihe nzọcha m, na nwa nke ebe nzọcha ọka m: Ihe m nụworo n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ Chineke nke Israel, ka m gosiworo unu.” (Aịsaịa 21:10) N’ime Bible, nzọcha ọka na-abụkarị ihe atụ nke inye ndị Chineke ahụhụ na ịnụcha ha. Ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ ga-aghọ ‘ụmụ nke ebe nzọcha ọka,’ ebe a na-eji ike ewepụta mkpụrụ ọka wheat n’ahịhịa ya, na-ahapụ nanị mkpụrụ ọka a yọchara ayọcha, ndị dị mma. Aịsaịa adịghị achị ha ọchị n’ihi ahụhụ a. Kama nke ahụ, ọ na-emere ndị a ga-abụ ‘ụmụ nke ebe nzọcha ọka’ n’ọdịnihu ebere, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha ga-abụ ndị e ji eji n’ala ọzọ ná ndụ ha nile.

16 Nke a pụrụ ịbụrụ anyị nile ihe ncheta bara uru. N’ọgbakọ ndị Kraịst taa, ụfọdụ ndị pụrụ ịchọ ịkwụsị inwe ọmịiko n’ebe ndị mere ihe ọjọọ nọ. Ọtụtụ mgbekwa, ndị e nyere ịdọ aka ná ntị pụrụ ịchọ ịjụ ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị eburu n’uche na Jehova na-enye ndị ya ahụhụ iji nụchaa ha, anyị agaghị eleda inye ahụhụ ahụ na ndị ji umeala n’obi nara ya anya ma ọ bụkwanụ jụ ya ma e nye anyị ya. Ka anyị nara ahụhụ sitere n’aka Chineke dị ka ngosipụta nke ịhụnanya ya.—Ndị Hibru 12:6.

Ịjụta Onye Nche ahụ Ihe

17. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Edọm “Duma” n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

17 Ozi amụma nke abụọ nke Aịsaịa isi nke 21 mere ka nkọwa banyere onye nche ahụ pụta ìhè. Ọ malitere ikwu, sị: “Ibu e boro Duma. Mụ ka otu onye na-akpọ òkù site na Sia, sị, Onye nche, mgbe ole gabigaworo n’abalị? Onye nche, mgbe ole gabigaworo n’abalị?” (Aịsaịa 21:11) Olee ebe Duma a dị? Dị ka ihe àmà na-egosi, e nwere ọtụtụ obodo na-aza aha ahụ n’oge e dere Bible, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha e bu n’uche n’ebe a. Duma adịghị na Sia, nke bụ́ aha ọzọ a na-akpọ Edọm. Otú ọ dị, “Duma” pụtara “Idere Duu.” Ya mere o yiri, dị ka ọ dị ná nkwupụta okwu ndị bu ụzọ, ka e nyere ógbè a aha na-egosi ihe ga-eme ya n’ọdịnihu. Edọm, nke nọworo na-abụ onye iro bu iwe n’obi nke ndị Chineke eri oge, ga-emesịa dere duu—idere duu nke ọnwụ. Otú ọ dị, tupu nke ahụ emee, ụfọdụ ga-ajụsi ase ike banyere ihe ọdịnihu ga-abụ.

18. Olee otú nkwupụta okwu bụ́, “Ụtụtụ abịawo, ma abalị abịawokwa” si mezuo n’isi Edọm nke oge ochie?

18 N’oge a na-ede Aịsaịa, Edọm dị n’ụzọ usuu ndị agha dị ike nke Asiria si agafe. Ụfọdụ ndị nọ n’Edọm chọsiri nnọọ ike ịmata mgbe abalị nke mmegbu ga-akwụsị nye ha. Gịnị bụ azịza ya? “Onye nche sịrị, Ụtụtụ abịawo, ma abalị abịawokwa.” (Aịsaịa 21:12a) Ihe ndị na-eme adịghị agba àmà ihe ọma maka Edọm. Ntakịrị ìhè ụtụtụ ga-acha n’igwe, ma ọ ga-adịru nwa oge, na-eduhie eduhie. Abalị—oge mmegbu ọzọ nke olileanya na-adịghị na ya—ga-esochi ụtụtụ ahụ ngwa ngwa. Lee nkọwa kwesịrị ekwesị ọ bụ banyere ọdịnihu Edọm! Mmegbu nke ndị Asiria ga-akwụsị, ma Babilọn ga-anọchi Asiria dị ka ike ọchịchị ụwa, ọ ga-egbukwa ọtụtụ ndị Edọm. (Jeremaịa 25:17, 21; 27:2-8) Usoro a ga-emeghachi ọzọ. Mmegbu nke ndị Peasia, e mesịakwa nke ndị Gris, ga-esochi mmegbu nke ndị Babilọn. A ga-enwezi “ụtụtụ” dị mkpirikpi n’oge nke ndị Rom, mgbe ndị Herọd—ndị bụ́ ndị Edọm—ga na-achị na Jerusalem. Ma “ụtụtụ” ahụ agaghị adịte aka. N’ikpeazụ, Edọm ga-edere duu ruo mgbe ebighị ebi, pụọ n’akụkọ ihe mere eme. Aha ahụ bụ́ Duma ga-ekwesị ya nke ọma n’ikpeazụ.

19. Mgbe onye nche ahụ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ajụ ase, jụọnụ ase: laghachinụ, bịa,” ọ̀ pụrụ ịbụ gịnị ka o bu n’uche?

19 Onye nche ahụ ji okwu ndị a mechie ozi ya dị nkenke: “Ọ bụrụ na unu ga-ajụ ase, jụọnụ ase: laghachinụ, bịa.” (Aịsaịa 21:12b) Okwu bụ́ “bịa” pụrụ izo aka n’ọtụtụ ‘abalị’ na-echere Edọm. Ma ọ bụ n’ihi na a pụkwara ịsụgharị okwu ahụ ịbụ “laghachinụ,” onye amụma ahụ pụrụ ịdị na-atụ aro na onye Edọm ọ bụla nke chọrọ ịgbanarị ihe ga-abịakwasị mba ahụ kwesịrị ichegharị ma ‘laghachikwuru’ Jehova. Nke ọ bụla ọ bụ, onye nche ahụ na-ekwu ka ha jụkwuo ase.

20. N’ihi gịnị ka nkwupụta okwu ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 21:11, 12 ji dị ndị Jehova taa mkpa?

20 Nkwupụta okwu a dị mkpirikpi enwewo ihe dị ukwuu ọ pụtara nye ndị Jehova n’oge a.e Anyị maara na ihe a kpọrọ mmadụ agamiwo n’abalị gbara ọchịchịrị nke ikpu ìsì ime mmụọ na nkewapụ n’ebe Chineke nọ bụ́ nke ga-eduga ná mbibi nke usoro ihe a. (Ndị Rom 13:12; 2 Ndị Kọrint 4:4) N’oge abalị a, ntakịrị olileanya ọ bụla e nwere na ọ dị otú ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ isi weta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi yiri ìhè chi ọbụbọ ahụ na-eduhie eduhie nke ihe sochiri ya bụ nanị oge ndị gbara ọchịchịrị karị. Chi ọbụbọ nke bụ́ ezie na-abịa—chi ọbụbọ nke Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst n’elu ụwa a. Ma ruo ogologo oge abalị ahụ dịruru, anyị aghaghị ịgbaso idu ndú nke òtù onye nche ahụ site n’ịmụ anya n’ụzọ ime mmụọ na iji obi ike na-ama ọkwa ịdị nso nke ọgwụgwụ usoro ihe a rụrụ arụ.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:6.

Chi Ejie n’Ọzara

21. (a) Olee nrọgharị okwu a pụrụ ibu n’uche kwuo nkebi okwu bụ́ “ibu e boro [ọzara]”? (b) Gịnị bụ usuu ndị njem nke Dedan?

21 Nkwupụta okwu ikpeazụ nke Aịsaịa isi nke 21 bụ “ọzara” ka e mere ya nye. O si otú a malite: “Ibu e boro [ọzara]. N’oké ọhịa dị [n’ọzara] ka unu ga-anọ ọnọdụ abalị, unu usuu ije nile nke ndị Dedan.” (Aịsaịa 21:13) Dị ka ihe àmà na-egosi, ọzara a na-ezo aka na ya bụ Arebia, n’ihi na ọ bụ ọtụtụ ebo nke ndị Arab ka e mere nkwupụta okwu ahụ nye. Mgbe ụfọdụ, a na-asụgharị okwu maka “ọzara” ịbụ “uhuruchi,” bụ́ okwu yiri ya nnọọ n’asụsụ Hibru. Ụfọdụ na-atụ aro na nke a bụ ịrọgharị okwu, dị ka a ga-asị na uhuruchi nke gbara ọchịchịrị—oge nsogbu—na-aga ịbịakwasị ógbè a. Nkwupụta okwu ahụ ji abalị ebe a hụrụ usuu ndị njem nke Dedan, bụ́ ebo Arab a ma ama, wee malite. Usuu ndị njem dị otú ahụ na-esi n’ụzọ azụmahịa agafe site n’otu ala ahịhịa dị n’ọzara gaa n’ọzọ, na-ebu ụda, pearl, na akụ̀ ndị ọzọ. Ma n’ebe a anyị na-ahụ ka a manyere ha ịhapụ ụzọ ndị ha siworo na ha gafee ọtụtụ mgbe ma nọọ ọnọdụ abalị n’ebe zoro ezo. N’ihi gịnị?

22, 23. (a) Olee oké ibu arọ gaje ịdakwasị ebo ndị Arab, mmetụta dịkwa aṅaa ka ọ ga-enwe n’ahụ ha? (b) Ruo ókè hà aṅaa ka ọdachi a dịruru na nso, ọ bụkwa ònye ga-eweta ya?

22 Aịsaịa na-akọwa, sị: “Izute onye akpịrị na-akpọ nkụ kutenụ mmiri; unu ndị bi n’ala Tima, werenụ nri kwesịrị ya zute onye na-awagharị. N’ihi na n’ihu ọtụtụ mma agha ka ha siri wagharịa, n’ihu mma agha a mịpụtara amịpụta, na n’ihu ụta a zọrọ ụkwụ ikwe ya, na n’ihu ibu dị arọ agha bu.” (Aịsaịa 21:14, 15) Ee, oké ibu arọ nke agha ga-adakwasị ebo Arab ndị a. Tima, nke dị n’otu n’ime ala ahịhịa dị n’ọzara nke kasị nwee mmiri n’ógbè ahụ, bụ nke a manyere ikutere ndị nwere ihe ndabara ọjọọ, bụ́ ndị na-agba ọsọ agha, mmiri na iwetara ha achịcha. Olee mgbe nsogbu a ga-abịa?

23 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Otú a ka Onyenwe anyị sịworo m, Tutu otu afọ agwụ, dị ka afọ onye e goro ọrụ si dị, nsọpụrụ nile nke Kida ga-agwụsị: ndị fọdụrụ n’ọnụ ọgụgụ ndị ụta, bụ́ ndị dike nke ụmụ Kida, ewee dị ole na ole: n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, ekwuwo ya.” (Aịsaịa 21:16, 17) Kida bụ ebo a ma nnọọ ama nke na mgbe ụfọdụ a na-eji ya anọchite anya Arebia nile. Jehova ekpebiwo na ndị ụta na ndị dike nke ebo a ga-ebelata n’ọnụ ọgụgụ wee ghọọ nanị ihe fọdụrụ afọdụ. Olee mgbe? “Tutu otu afọ agwụ,” ọ gaghị agafe ya, dị ka onye e goro ọrụ na-adịghị arụfe oge a kwụrụ ya ụgwọ ya. Otú ihe a nile si mezuo kpọmkwem edoghị anya. Ndị ọchịchị abụọ nke Asiria—Sagọn nke Abụọ na Senakerib—kwuru na ọ bụ ha meriri Arebia. Ọ pụrụ ịbụ nke ọ bụla n’ime ha gburu ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị si n’ebo ndị a dị mpako nke Arab, dị ka e buru n’amụma.

24. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na e mezuru amụma Aịsaịa buru megide Arebia?

24 Otú ọ dị, anyị pụrụ ijide n’aka na amụma a mezururu n’isi. Ọ dịghị ihe pụrụ ime ka eziokwu ahụ doo anya karịa okwu mmechi nke nkwupụta okwu ahụ: “Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, ekwuwo ya.” Nye ndị nọ ndụ n’oge Aịsaịa, ọ pụrụ iyi ihe na-agaghị eme eme na Babilọn ga-aka Asiria ike, a kwatuokwa ya n’oge iri oriri ndụ ịla n’iyi nke otu uhuruchi. Ọ pụkwara iyi ihe na-agaghị eme eme na Edọm dị ike ga-emesịa nwụọ ọnwụ idere duu ma ọ bụ na abalị nke ihe isi ike na ịnọ ná mkpa ga-adakwasị ebo ndị Arab bara ọgaranya. Ma Jehova kwuru na ọ ga-eme, o mekwara otú ahụ. Taa, Jehova na-agwa anyị na a ga-ebibi alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Nke a abụghị nanị ihe nwere ike ime eme; ọ bụ ihe e ji n’aka. Jehova n’onwe ya ekwuwo ya!

25. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya nke onye nche ahụ?

25 Ya mere, ka anyị yie onye nche ahụ. Ka anyị mụrụ anya, dị ka a ga-asị na anyị nọ n’ụlọ nche dị elu, na-elepụ anya ebe nile maka ihe àmà ọ bụla nke ihe ize ndụ na-abịanụ. Ka anyị na-esochi òtù onye nche ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi anya, bụ́ ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’elu ala taa. Ka anyị sonyere ha n’iji obi ike na-akpọsa ihe anyị na-ahụ kpọmkwem—ihe àmà dị ukwuu na-egosi na Kraịst na-achị n’eluigwe; na ọ ga-eweta ogologo abalị gbara ọchịchị nke nkewapụ ihe a kpọrọ mmadụ kewapụrụ onwe ha site n’ebe Chineke nọ ná njedebe; na mgbe e mesịkwara ọ ga-eweta chi ọbụbọ nke bụ́ ezie, Ọchịchị Narị Afọ Iri, ịchị ụwa paradaịs!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ Eze Saịrọs nke Peasia “Eze Anshan”—ebe Anshan bụ ógbè ma ọ bụ obodo dị n’Ilam. Ọ pụrụ ịbụ na ndị Israel nọ n’oge Aịsaịa—narị afọ nke asatọ T.O.A.—amaghị Peasia, ebe ha pụrụ ịmaworị Ilam. Nke a pụrụ ịbụ ihe mere Aịsaịa ji kpọọ Ilam n’ebe a kama ịkpọ Peasia.

b Ọtụtụ ndị nkọwa Bible na-eche na okwu bụ́ “teenụ ọta mmanụ” na-ezo aka n’ihe ndị agha na-eme n’oge ochie nke bụ́ ite ọta akpụkpọ mmanụ tupu ha agawa agha ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụta a gbara na ya wee gbụchapụ. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịbụ nkọwa ya, e kwesịrị ịrịba ama na n’abalị ahụ e meriri obodo ahụ, ndị Babilọn enweghị ohere ịlụ agha, ma ya fọdụzie ijikere maka agha site n’ite ọta ha mmanụ!

c Amụma Aịsaịa buru banyere ọdịda nke Babilọn ziri nnọọ ezi nke na ụfọdụ ndị nkatọ Bible ekwuwo na ọ ghaghị ịbụ na e dere ya mgbe ihe ahụ mesịworo. Ma dị ka ọkà mmụta n’asụsụ Hibru bụ́ F. Delitzsch si kwuo, ịkọ nkọ dị otú ahụ adịghị mkpa ma ọ bụrụ na anyị kwetara na a pụrụ inye onye amụma ike mmụọ nsọ ikwu ihe ga-eme ọtụtụ narị afọ tupu ha emee.

d Lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peji nke 164-169.

e N’ime afọ 59 mbụ a malitere ibipụta ya, magazin bụ́ Ụlọ Nche na-ebu Aịsaịa 21:11 n’ihu ya. Otu akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ bụkwa ebe e si nweta isiokwu nke okwu ikpeazụ e dere ede nke Charles T. Russell, bụ́ onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society. (Lee foto dị na peji bu ụzọ.)

[Foto dị na peeji nke 219]

“Rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ”!

[Foto dị na peeji nke 220]

Onye nche ahụ “wee kpọọ dị ka ọdụm”

[Foto dị na peeji nke 222]

“Mụ onwe m na-eguzo mgbe nile n’ehihie, [na] n’abalị nile”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya