Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 18 p. 230-243
  • Ihe Mmụta Banyere Ekwesịghị Ntụkwasị Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mmụta Banyere Ekwesịghị Ntụkwasị Obi
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Obodo A Nọchibidoro
  • Mgbagwoju Anya n’Ihi Ọdachi Ahụ
  • Mgbalị Ndị E Mere Ichebe Ya
  • Ndị Na-enweghị Okwukwe
  • Onyeisi Ụlọ nke Na-achọ Ọdịmma Onwe Ya Nanị
  • Ntú Abụọ Bụ́ Ihe Atụ
  • Mmadụ Iji Ikike O Nwere Eme Ihe Na-ekwesịghị Ekwesị Na-eme Ka A Napụ Onye Ahụ Ikike Ahụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Chineke Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Iji Gosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • E Nye Ụgwọ Ọrụ Maka Okwukwe nke Otu Eze
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 18 p. 230-243

Isi nke Iri na Asatọ

Ihe Mmụta Banyere Ekwesịghị Ntụkwasị Obi

Aịsaịa 22:1-25

1. Olee otú ọ pụrụ ịdịworị ịnọ n’ime obodo oge ochie nke ndị agha nọchibidoro?

CHEEDỊ otú ọ ga-adị ịnọ n’obodo oge ochie nke ndị agha nọchibidoro. Ndị iro nọ n’azụ mgbidi—ha dị ike ma nwee obi ọjọọ. Ị maara na ha emeriworị obodo ndị ọzọ. Ugbu a ha kpebisiri ike imeri na ịkwakọrọ ihe dị n’obodo unu ma dinaa ndị bi n’ime ya n’ike, gbuokwa ha. Ndị agha ahụ, bụ́ ndị iro, dị ike nke na a pụghị izute ha ihu na ihu n’agha; nanị ihe ị pụrụ ime bụ inwe olileanya na mgbidi obodo ahụ ga-egbochi ha ịbata. Ka i si n’elu mgbidi ahụ lefee anya n’ofe nke ọzọ, ị pụrụ ịhụ ụlọ elu ndị iro ahụ bu bịa iji nọchibido ya. Ha nwekwara ígwè ọrụ e ji eme nnọchibido bụ́ ndị a pụrụ iji gbapụ nkume ndị buru ibu iji kụtusie ihe nchebe unu. Ị hụrụ osisi ha ji akụtusị ihe na ubube ha ji arị elu, ndị ọkà ha n’ịgba ụta na ụgbọ ịnyịnya ha, usuu ndị agha ha. Lee ihe na-emenye ụjọ ọ bụ ịhụ!

2. Olee mgbe nnọchibido ahụ a kọwara n’Aịsaịa isi nke 22 weere ọnọdụ?

2 N’Aịsaịa isi nke 22, anyị na-agụ banyere nnọchibido dị otú ahụ—nnọchibido a nọchibidoro Jerusalem. Olee mgbe o weere ọnọdụ? O siri ike ịkpọ otu nnọchibido aha mgbe ihe ahụ nile a kọwara mezuchara. Dị ka ihe àmà na-egosi, ọ kasị mma ịghọta amụma ahụ dị ka nkọwa nke nnọchibido dị iche iche ga-abịakwasị Jerusalem, ịdọ aka ná ntị zuru ọnụ banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

3. Olee otú ndị bi na Jerusalem si meghachi omume ná nnọchibido ahụ Aịsaịa kọwara?

3 N’agbanyeghị nnọchibido ahụ Aịsaịa na-akọwa, gịnị ka ndị bi na Jerusalem na-eme? Dị ka ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ, hà na-etiku Jehova ka ọ zọpụta ha? Ee e, ha na-eme iberibe, nke yiri ihe a na-ahụ taa n’etiti ọtụtụ ndị na-ekwu na ha na-efe Chineke.

Obodo A Nọchibidoro

4. (a) Gịnị bụ “ndagwurugwu nke ọhụụ,” gịnịkwa mere o ji nwee aha a? (b) Gịnị bụ ọnọdụ ime mmụọ nke ndị bi na Jerusalem?

4 N’isi nke 21 nke Aịsaịa, e ji okwu bụ́ “Ibu e boro” wee malite nke ọ bụla n’ime ozi ikpe atọ ahụ. (Aịsaịa 21:1, 11, 13) Isi nke 22 sikwa otú ahụ malite: “Ibu e boro ndagwurugwu nke ọhụụ. Ọ̀ bụkwa gịnị na-eme gị, na ị rịgoworo n’elu ụlọ nile, ka ị hà?” (Aịsaịa 22:1) “Ndagwurugwu nke ọhụụ” na-ezo aka na Jerusalem. A na-akpọ obodo ahụ ndagwurugwu n’ihi na ọ bụ ezie na ọ dị n’elu, ugwu ndị ka ya elu gbara ya gburugburu. E jikọtara ya na “ọhụụ” n’ihi na a nọ n’ebe ahụ hụ ọtụtụ ọhụụ na mkpughe ndị sitere n’aka Chineke. N’ihi nke a, ndị bi n’obodo ahụ kwesịrị ịṅa ntị n’okwu Jehova. Kama ime otú ahụ, ha elegharawo ya anya ma banye n’ofufe ụgha. Ndị iro ahụ nọchibidoro obodo ahụ bụ ngwa ọrụ Chineke ji emezu ihe o kpere n’ikpe megide ndị ya na-enupụ isi.—Deuterọnọmi 28:45, 49, 50, 52.

5. Dị ka o yiri, n’ihi gịnị ka ndị ahụ ji na-arịgo elu ụlọ ha?

5 Rịba ama na ndị bi na Jerusalem ‘arịgowo n’elu ụlọ ha nile, ka ha hà.’ N’oge ochie, elu ụlọ ndị Israel na-adị larịị, ezinụlọ dị iche iche na-ezukọtakarịkwa n’ebe ahụ. Aịsaịa ekwughị ihe mere ha ji na-ezukọta ugbu a, ma ihe ndị o kwuru na-egosi na ọ kwadoghị ya. Ya bụrụ otú ahụ, o yiri ka ha arịgowo n’elu ụlọ ha ije rịọ chi ụgha ha arịrịọ. Nke a bụ omume ha n’afọ ndị gaferenụ rute mgbe e bibiri Jerusalem na 607 T.O.A.—Jeremaịa 19:13; Zefanaịa 1:5.

6. (a) Ọnọdụ dịgasị aṅaa dị n’ime Jerusalem? (b) Gịnị mere ụfọdụ ji na-aṅụrị ọṅụ, ma gịnị ga-eme n’ọdịnihu?

6 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Gị nke jupụtara ná mbigbọ, obodo nke na-atụ ụ̀zụ̀, obodo na-aṅụrị ọṅụ agha; ndị gị e gburu egbu abụghị ndị e ji mma agha gbuo, ha abụghịkwa ndị nwụrụ anwụ n’agha.” (Aịsaịa 22:2) Ìgwè mmadụ enubatawo n’obodo ahụ, ọ na-ebigbọkwa. Ndị mmadụ nọ n’okporo ámá na-eme ụ̀zụ̀, na-atụkwa ụjọ. Otú ọ dị, ụfọdụ na-aṅụrị ọṅụ ikekwe n’ihi na ha nwere mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi ma ọ bụ na ha kwenyere na ihe ize ndụ ahụ agaghị adịte aka.a Otú ọ dị, ịṅụrị ọṅụ ugbu a bụ amaghị ihe. Ọtụtụ ndị nọ n’obodo ahụ gaje ịnwụ ọnwụ dị njọ karịa ịbụ ndị e ji mma agha gbuo. A na-egbochi obodo a nọchibidoro anọchibido isi n’èzí nweta ihe oriri. Ndị nke a kwakọbara n’ime obodo ahụ na-agwụ. Ndị na-anwụ n’agụụ na n’ihi oké ụba mmadụ na-akpata ntiwapụ nke ọrịa. Ya mere ụnwụ nri na ọrịa ga-egbu ọtụtụ ndị nọ na Jerusalem. Nke a mere ma na 607 T.O.A ma na 70 O.A.—2 Ndị Eze 25:3; Abụ Ákwá 4:9, 10.b

7. Gịnị ka ndị ọchịchị Jerusalem mere n’oge nnọchibido ahụ, gịnị mekwara ha?

7 N’oge nsogbu a, olee nduzi ndị ọchịchị Jerusalem nyere? Aịsaịa na-aza, sị: “Ndị ọchịagha gị nile agbapụwo n’otu, e kere ha agbụ n’enweghị ụta: ndị gị nile a chọtaworo, e kere ha agbụ n’otu, ruo ebe dị anya ka ha gbalagara.” (Aịsaịa 22:3) Ndị ọchịchị na ndị dike gbara ọsọ, e jidekwa ha! N’enwedịghị ụta a tụdoro ha, e jidere ha ma kpụrụ ha dị ka ndị mkpọrọ. Nke a mere na 607 T.O.A. Mgbe e tipuru mgbidi Jerusalem, Eze Zedekaịa jiri abalị gbaa ọsọ ya na ndị dike ya. Ndị iro nụrụ ya, chụwa ha ma chụkwudo ha n’ala dị larịị nke Jeriko. Ndị dike ahụ gbafusịrị. E jidere Zedekaịa, rụkpọọ ya anya, jiri ọla copper kee ya agbụ, ma kpụrụ ya gaa Babilọn. (2 Ndị Eze 25:2-7) Lee ọdachi nke si n’ekwesịghị ntụkwasị obi ya pụta!

Mgbagwoju Anya n’Ihi Ọdachi Ahụ

8. (a) Olee otú Aịsaịa si meghachi omume n’amụma nke kwuru banyere ọdachi ga-abịakwasị Jerusalem? (b) Olee otú ọnọdụ ga-adị na Jerusalem?

8 Amụma a metụrụ Aịsaịa n’ahụ nke ukwuu. Ọ na-ekwu, sị: “Lepụnụ m anya, m ga-akwakpọ anya; unu anụkpọla onwe unu ịkasi m obi, n’ihi mbibi ada nke ndị m.” (Aịsaịa 22:4) Ihe e buru n’amụma ga-adakwasị Moab na Babilọn wutere Aịsaịa. (Aịsaịa 16:11; 21:3) Ugbu a nchegbu na iru újú ya ọbụna kara njọ ka ọ na-atụgharị uche n’ọdachi ga-abịakwasị ndị obodo ya. A pụghị ịgụgụ ya. N’ihi gịnị? “N’ihi na otu ụbọchị nke ọgbụgba aghara, na nke nzọda, na nke ịgba mmadụ gharịị, ka Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, nwere, n’ime ndagwurugwu nke ọhụụ; ngwuda nke mgbidi, na ntiku a na-etiku ugwu.” (Aịsaịa 22:5) Jerusalem ga-ejupụta n’oké ọgba aghara. Ndị mmadụ ga-awagharị n’ụjọ, n’enweghị nzube. Mgbe ndị iro ahụ malitere itipu mgbidi obodo ahụ, ha ga “na-etiku ugwu.” Nke a ọ̀ pụtara na ndị bi n’obodo ahụ ga-etiku Chineke n’ụlọukwu ya dị nsọ nke dị n’Ugwu Moraịa? Ọ pụrụ ịbụ. Otú ọ dị, n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha, ma eleghị anya ọ pụtara nanị na mkpu ha na-eti n’ihi ụjọ ga na-ada ụda n’ugwu ndị dị gburugburu.

9. Kọwaa ndị agha na-eyi Jerusalem egwu.

9 Ụdị ndị iro dị aṅaa na-eyi Jerusalem egwu? Aịsaịa na-agwa anyị, sị: “Ilam bukwaara akpa akụ́, ya na usuu mmadụ, bụ́ ndị ịnyịnya; Kia kpughepụkwara ọta.” (Aịsaịa 22:6) Ndị iro ahụ bujuru ngwá agha. Ha nwere ndị ọkà n’ịgba ụta bụ́ ndị akpa akụ́ ha juru eju. Ndị dike na-edozi ọta ha maka agha. E nwere ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya ndị a zụrụ azụ maka ịlụ agha. Ndị agha ahụ gụnyere ndị agha si Ilam, nke dị n’akụkụ ebe ugwu nke ebe bụ́ Persian Gulf ugbu a, na ndị si Kia, ikekwe nke dịdewere Ilam. Nhota e hotara ala ndị ahụ na-egosi ebe dị anya ndị mwakpo ahụ si abịa. Ọ na-egosikwa na ndị Ilam bụ́ ọkà n’ịgba ụta pụrụ isoworịị ná ndị agha na-eyi Jerusalem egwu n’oge Hezekaịa.

Mgbalị Ndị E Mere Ichebe Ya

10. Ihe omume dị aṅaa na-agba àmà ihe ọjọọ nye obodo ahụ?

10 Aịsaịa na-akọwa ọnọdụ na-ebilitenụ, sị: “O ruo, na ndagwurugwu gị nile a họpụtara ahọpụta jupụtara n’ụgbọala, ndị ịnyịnya dokwara onwe ha n’usoro n’ihu ọnụ ụzọ ámá. O wee kpughepụ ihe nkwụchi nke Juda.” (Aịsaịa 22:7, 8a) Ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya jupụtara n’ala dị larịị nke dị n’azụ obodo Jerusalem ma were ọnọdụ ha ịwakpo ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. Gịnị bụ “ihe nkwụchi nke Juda” nke e kpughepụrụ? Ma eleghị anya, ọ bụ ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, nke iweghara ya na-agba àmà ihe ọjọọ nye ndị na-echebe ya.c Mgbe e kpughepụrụ ihe nkwụchi a bụ́ ihe nchebe, ndị na-awakpo ya pụrụ ịbanye n’obodo ahụ.

11, 12. Olee ihe ndị bi na Jerusalem mere maka nchebe?

11 Ugbu a Aịsaịa lekwasịrị anya ná mgbalị ndị ahụ na-eme ichebe onwe ha. Ihe mbụ gbatara ha n’uche—ngwá agha! “I wee legide ihe agha dị n’ụlọ oké ọhịa anya n’ụbọchị ahụ. Mgbawa nile nke obodo Devid ka unu hụkwara, na ha dị ọtụtụ: unu wụkọbakwara mmiri nke ọdọ mmiri dị n’okpuru.” (Aịsaịa 22:8b, 9) A na-akwasa ngwá agha n’ebe nkwasa ihe agha dị n’ụlọ oké ọhịa. Ọ bụ Solomọn wuru ebe nkwasa ihe agha a. Ebe e ji osisi cedar si Lebanọn wuo ya, a bịara mara ya dị ka “Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.” (1 Ndị Eze 7:2-5) E nyochara ebe ndị e tipuru etipu ná mgbidi ahụ. A wụkọtara mmiri—ihe omume dị mkpa maka nchebe. Mmiri dị ndị ahụ mkpa iji dịrị ndụ. Ma ọ́ dịghị, obodo apụghị ịdịgide. Otú ọ dị, rịba ama na ọ dịghị ihe e kwuru banyere ha ilegara Jehova anya maka mgbapụta. Kama nke ahụ, ha na-adabere n’ihe ndị ha nwere. Ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-ehie ụzọ otú ahụ!—Abụ Ọma 127:1.

12 Gịnị ka a pụrụ ime banyere ebe ndị ahụ e tipuru etipu ná mgbidi obodo ahụ? “Ọ bụkwa ụlọ nile nke Jerusalem ka unu gụrụ ọnụ, unu wee kwatuo ụlọ nile ịrụsi mgbidi ike.” (Aịsaịa 22:10) E nyochara ụlọ dị iche iche iji mara ndị a pụrụ ịkụkpọ iji nweta ihe ndị a ga-eji rụzie ebe ndị ahụ e tipuru etipu. Nke a bụ mgbalị a na-eme iji gbochie ndị iro ahụ iweghara mgbidi ahụ kpam kpam.

Ndị Na-enweghị Okwukwe

13. Olee otú ndị ahụ sị gbalịa ịhụ na e nwere mmiri, ma ònye ka ha chefuru?

13 “Ebe nchịkọta mmiri ka unu mekwara n’etiti mgbidi unu abụọ ịnagide mmiri nke ọdọ mmiri ochie: ma unu elegideghị Onye na-eme nke a anya, ọ bụkwa Onye na-akpụ ya rịị site n’ebe dị anya ka unu na-elekwasịghị anya.” (Aịsaịa 22:11) Mgbalị ịchịkọta mmiri, bụ́ nke a kọwara ma n’ebe a ma n’amaokwu nke 9, na-echetara anyị ihe Eze Hezekaịa mere iji chebe obodo ahụ pụọ n’aka ndị Asiria na-awakpo ya. (2 Ihe E Mere 32:2-5) Otú ọ dị, ndị bi n’obodo ahụ e kwuru maka ya n’amụma a nke Aịsaịa enweghị okwukwe ma ọlị. Ka ha na-arụ ọrụ iji chebe obodo ahụ, ha echetụghị echiche banyere Onye Okike, n’adịghị ka Hezekaịa.

14. N’agbanyeghị ozi ịdọ aka ná ntị Jehova, olee omume iberibe ndị ahụ mere?

14 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, wee kpọsaa ịkwa ákwá, na iti aka n’obi n’újú, na ime isi nkwọcha, na ike ákwà mkpe n’úkwù n’ụbọchị ahụ: ma, lee, obi ụtọ na ọṅụ, ogbugbu ìgwè ehi na ogbugbu ìgwè ewu na atụrụ, oriri anụ na ọṅụṅụ mmanya vine: ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (Aịsaịa 22:12, 13) Ndị bi na Jerusalem enweghị nchegharị maka nnupụisi ha megide Jehova. Ha ebeghị ákwá, kpụchasịa isi ha, ma ọ bụ yiri ákwà mkpe dị ka ihe àmà nke nchegharị. A sị na ha mere otú ahụ, ma eleghị anya Jehova gaara egbochiri ha nhụsianya na-abịanụ. Kama nke ahụ, ha mikpuru onwe ha n’ihe ụtọ. Otu omume ahụ dịkwa taa n’etiti ọtụtụ ndị na-enweghị okwukwe na Chineke. N’ihi na ha enweghị olileanya—ma nke isi n’ọnwụ bilite ma ọ bụ nke ịdị ndụ n’elu ala Paradaịs n’ọdịnihu—ha na-adị ndụ nke imeju ọchịchọ ha, na-asị: “Ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:32) Lee ka o si bụrụ echebaraghị ọdịnihu echiche! A sị nnọọ na ha ga-atụkwasị Jehova obi, ha ga-enwe olileanya na-adịte aka!—Abụ Ọma 4:6-8; Ilu 1:33.

15. (a) Gịnị bụ ozi ikpe Jehova megide Jerusalem, ònyekwa na-emezu ihe o kpere n’ikpe? (b) N’ihi gịnị ka ụdị ihe bịakwasịrị Jerusalem ga-eji bịakwasị Krisendọm?

15 Ndị ahụ bi na Jerusalem, bụ́ ndị a nọchibidoro, agaghị anọ ná ntụkwasị obi. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha wee kpughepụ Onwe ya ná ntị m abụọ, sị, N’ezie a gaghị ekpuchiri unu ajọ omume a ruo mgbe unu ga-anwụ, ka Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, sịrị.” (Aịsaịa 22:14) N’ihi obi ịkpọ nkụ nke ndị ahụ, a gaghị agbaghara ha. Ha ga-anwụrịrị. E ji nke a n’aka. Eze Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ekwuwo ya. Ná mmezu nke okwu amụma Aịsaịa, ọdachi bịakwasịrị Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi ugboro abụọ. Ndị agha Babilọn bibiri ya, e mesịakwa ndị agha Rom. Otú ahụkwa ka ọdachi ga-esi bịakwasị Krisendọm na-ekwesịghị ntụkwasị obi, nke ndị òtù ya na-ekwu na ha na-efe Chineke ma na-agọnarị ya n’ezie site n’ọrụ ha. (Taịtọs 1:16) Mmehie Krisendọm, tinyere nke okpukpe ndị ọzọ dị n’ụwa, bụ́ ndị na-eleghara ụzọ ezi omume Chineke anya, ‘arapakọwo n’otu ruo eluigwe.’ Dị ka njehie nke Jerusalem si n’ezi ofufe dapụ dị, njehie ya karịrị akarị nke na a pụghị ikpuchi ya.—Mkpughe 18:5, 8, 21.

Onyeisi Ụlọ nke Na-achọ Ọdịmma Onwe Ya Nanị

16, 17. (a) Ònye nwetara ozi ịdọ aka ná ntị ugbu a site n’aka Jehova, n’ihi gịnịkwa? (b) N’ihi oké ọchịchọ ya, gịnị ga-eme Shebna?

16 Onye amụma ahụ wepụrụ uche ya ugbu a n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ gaa n’ebe onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ. Aịsaịa na-ede, sị: “Otú a ka Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, sịrị, Jee, bakwuru odozi akụ̀ a, bụ́ Shebna, nke bụ́ onyeisi ụlọ, sị, Gịnị ka i nwere n’ebe a? Ma ọ bụ ònye ka i nwere n’ebe a, na i gwuwaworo ili nye onwe gị n’ebe a? ọ na-egwuwa ili ya n’elu, ọ na-akara onwe ya ebe obibi n’ime nkume dị elu!”—Aịsaịa 22:15, 16.

17 Shebna bụ “onyeisi ụlọ,” ma eleghị anya ụlọ Eze Hezekaịa. N’ihi ya, o nwere ọkwá dị elu, osote eze. A na-atụ anya ihe dị ukwuu n’aka ya. (1 Ndị Kọrint 4:2) Ma, mgbe o kwesịrị ibu ụzọ na-ahụ maka ọdịmma mba ahụ, Shebna nọ na-achọrọ onwe ya otuto. Ọ na-egwu ili okomoko—nke yiri nke onye eze—nke ọ wapụtaara onwe ya n’ime nkume dị elu. Jehova, n’ịhụ nke a, kpaliri Aịsaịa ịdọ onyeisi ụlọ ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi aka ná ntị, sị: “Lee, Jehova gaje ịtụdasi gị ike, gị nwoke; ee, Ọ gaje ịpịakọta gị apịakọta. Ọ ga-afụkọtasi gị ike dị ka ihe ọtụtụ tụọ gị n’ala sara mbara n’aka abụọ; n’ebe ahụ ka ị ga-anwụ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ụgbọala nile nke nsọpụrụ gị ga-adị, gị ihe nlelị nke ụlọ onye nwe gị! M ga-akwapụkwa gị n’ebe nguzo gị siri ike, ọ ga-esikwa n’ọnọdụ gị dọda gị.” (Aịsaịa 22:17-19) N’ihi iche maka onwe ya nanị, Shebna agaghị enwe ọbụna ili nkịtị n’ime Jerusalem. Kama nke ahụ, a ga-atụpụ ya dị ka bọl, ịnọ n’ala dị anya nwụọ. Ịdọ aka ná ntị dị na nke a nye ndị nile e nyere ikike n’etiti ndị Chineke. Iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ga-eduga ná nnapụ nke ike ahụ na ma eleghị anya nchụpụ.

18. Ònye ga-anọchi Shebna, gịnịkwa ka ọ pụtara na onye a ga-eweghara uwe ọrụ Shebna na mkpịsị ugodi nke ụlọ Devid?

18 Otú ọ dị, olee otú a ga-esi wepụ Shebna n’ọkwá ya? Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-akọwa, sị: “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, na M ga-akpọ ohu m, bụ́ Elaịakim nwa Hilkaịa: M ga-eyikwasị ya uwe gị, were ihe ahụ a na-eke gị n’úkwù kesie ya ike, ọ bụkwa ọchịchị gị ka M ga-enye ya n’aka: ọ ga-aghọkwara ndị bi na Jerusalem na ndị ụlọ Juda nna. M ga-atụkwasịkwa mkpịsị ugodi ụlọ Devid n’ubu ya; o wee meghee, ọ dịghịkwa onye na-emechi; o wee mechie, ọ dịghịkwa onye na-emeghe.” (Aịsaịa 22:20-22) N’ịnọchi Shebna, a ga-enye Elaịakim uwe ọrụ nke onyeisi ụlọ ahụ nakwa ugodi nke ụlọ Devid. Bible na-eji okwu bụ́ “mkpịsị ugodi” eme ihe iji gosi ikike, ọchịchị, ma ọ bụ ike. (Tụlee Matiu 16:19.) N’oge ochie, onye ndụmọdụ eze, onye e nyere mkpịsị ugodi, pụrụ ịdị na-elekọta ụlọ eze nile, ọbụna na-ekpebi ndị ga na-ejere eze ozi. (Tụlee Mkpughe 3:7, 8.) Ya mere, ọkwá nke onyeisi ụlọ dị mkpa, a na-atụkwa anya ihe dị ukwuu n’aka onye ọ bụla nọ n’ọkwá ahụ. (Luk 12:48) Ọ pụrụ ịbụ na Shebna ruru eru, ma n’ihi na o kwesịghị ntụkwasị obi, Jehova ga-edochi ya.

Ntú Abụọ Bụ́ Ihe Atụ

19, 20. (a) Olee otú Elaịakim ga-esi ghọọrọ ndị obodo ya ngọzi? (b) Gịnị ga-eme ndị nọgidere na-adabere n’ebe Shebna nọ maka enyemaka?

19 N’ikpeazụ, Jehova ji okwu ihe atụ kọwaa nnyefe a ga-enyefe Elaịakim ike site n’aka Shebna. Ọ na-ekwu, sị: “M ga-akpọgidekwa ya [Elaịakim] dị ka ntú n’ebe kwesịrị ntụkwasị obi; ọ ga-aghọkwara ụlọ nna ya ocheeze nsọpụrụ. Ha ga-ekokwasịkwa ya nsọpụrụ nile nke ụlọ nna ya, ụmụ ya na ụmụ nna ya, ihe nile nke dị nta, site n’ihe nile bụ́ ọkwá wee ruo ihe nile bụ́ karama. N’ụbọchị ahụ (ọ bụ ihe si n’ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta) ka ntú [Shebna] nke a kpọgideworo n’ebe kwesịrị ntụkwasị obi ga-apụ n’ọnọdụ ya; e wee gbutuo ya, o wee daa, e wee bipụ ibu dị n’elu ya; n’ihi na Jehova ekwuwo ya.”—Aịsaịa 22:23-25.

20 N’amaokwu ndị a, ntú nke mbụ bụ Elaịakim. Ọ ga-aghọrọ ụlọ nna ya, bụ́ Hilkaịa, “ocheeze nsọpụrụ.” N’adịghị ka Shebna, ọ gaghị emechu ụlọ nna ya ihu ma ọ bụ mebie aha ọma ya. Elaịakim ga-abụrụ arịa ụlọ nile, ya bụ, ndị ọzọ na-ejere eze ozi, onye enyemaka na-adịgide adịgide. (2 Timoti 2:20, 21) N’ụzọ dị iche, ntú nke abụọ na-ezo aka n’ebe Shebna nọ. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ọ nọ ná ntụkwasị obi, a ga-ewepụ ya. Onye ọ bụla nke nọgidere na-adabere n’ebe ọ nọ maka enyemaka ga-ada.

21. N’oge a, ònye, dị ka Shebna, ka a nọchiri, n’ihi gịnị, ònyekwa nọchiri ya?

21 Ahụmahụ Shebna na-echetara anyị na n’etiti ndị na-ekwu na ha na-efe Chineke, ndị nakweere ihe ùgwù ije ozi kwesịrị iji ha na-ejere ndị ọzọ ozi ma na-ewetara Jehova otuto. Ha ekwesịghị iji ọnọdụ ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji mee onwe ha ọgaranya ma ọ bụ iji bụrụ ndị a ma ama. Dị ka ihe atụ, Krisendọm anọwo eri oge na-ebuli onwe ya elu dị ka onyeisi ụlọ a họpụtara ahọpụta, onye nnọchiteanya Jisọs Kraịst n’elu ala. Otú ọ dị, dị nnọọ ka Shebna wetaara nna ya mmechuihu site n’ịchọ otuto onwe ya, ndị ndú nke Krisendọm ewetaworo Onye Okike mmechuihu site n’ịkpakọbara onwe ha akụ̀ na ụba na ike. N’ihi ya, mgbe oge ruru na 1918 maka ikpe nke ‘ga-esi n’ụlọ Chineke’ malite, Jehova wepụrụ Krisendọm. E mere ka a mata onyeisi ụlọ ọzọ—“onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche”—ma họpụta ya ilekọta ezinụlọ Jisọs n’elu ala. (1 Pita 4:17; Luk 12:42-44) Òtù a nke ọtụtụ ndị mejupụtara egosiwo na o ruru eru ilekọta “mkpịsị ugodi” eze nke ụlọ Devid. Dị ka “ntú” nke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ ghọworo “ihe” nile dị iche iche, ndị Kraịst e tere mmanụ nwere ibu ọrụ dị iche iche, bụ́ ndị na-elegara ya anya maka nri ime mmụọ, ihe nkwado a pụrụ ịdabere na ya. “Atụrụ ọzọ” ahụkwa, dị ka ‘onye ala ọzọ nke nọ n’ọnụ ụzọ ámá’ nke Jerusalem oge ochie, na-adabere na “ntú” a, bụ́ Elaịakim nke oge a.—Jọn 10:16; Deuterọnọmi 5:14.

22. (a) N’ihi gịnị ka idochi Shebna dị ka onyeisi ụlọ ji were ọnọdụ n’ezi oge? (b) N’oge a, n’ihi gịnị ka ịhọpụta “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ji were ọnọdụ n’ezi oge?

22 Elaịakim nọchiri Shebna mgbe Senakerib na ìgwè ndị so ya nọ na-eyi Jerusalem egwu. N’otu aka ahụ, a họpụtawo “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ka ọ na-eje ozi n’oge ọgwụgwụ a, nke ga-abịa ná njedebe mgbe Setan na ndị agha ya mere mwakpo ikpeazụ ha n’ahụ “Israel nke Chineke” na ndị ibe ha bụ́ atụrụ ọzọ ahụ. (Ndị Galetia 6:16) Dị ka ọ dị n’oge Hezekaịa, mwakpo ahụ ga-arụpụta mbibi nke ndị iro nke ezi omume. Ndị na-adabere na ‘ntú ahụ dị n’ebe kwesịrị ntụkwasị obi,’ nke bụ́ onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, ga-alanarị, dịkwa ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi bi na Jerusalem lanarịrị mwakpo ndị Asiria wakporo Juda. Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ịghara ịrapara n’ahụ “ntú” ahụ a jụrụ ajụ bụ́ Krisendọm!

23. N’ikpeazụ gịnị mere Shebna, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

23 Gịnị mere Shebna? Anyị enweghị ihe ndekọ banyere otú amụma e buru maka ya, nke e dekọrọ n’Aịsaịa 22:18, si mezuo. Mgbe o buliri onwe ya elu, e wee menye ya ihere, o yiri Krisendọm, ma ọ pụrụ ịbụ na ọ mụtara ihe site n’ahụhụ ahụ. Na nke a, ọ dị nnọọ iche na Krisendọm. Mgbe Rabshake nke Asiria kwuru ka Jerusalem chịlie aka elu, onyeisi ụlọ ọhụrụ nke Hezekaịa, bụ́ Elaịakim, bụ onye du ndị gakwuuru ya. Otú ọ dị, Shebna nọ ya n’akụkụ dị ka odeakwụkwọ eze. Dị ka ihe àmà na-egosi, Shebna ka na-ejere eze ozi. (Aịsaịa 36:2, 22) Lee ihe mmụta dị mma ọ bụụrụ ndị a napụrụ ọnọdụ ije ozi ná nzukọ Chineke! Kama ịnọ na-enwe mwute na ibu iwe n’obi, ọ bụụrụ ha amamihe ịnọgide na-ejere Jehova ozi n’ọnọdụ ọ bụla o kwere ka ha nọrọ. (Ndị Hibru 12:6) Site n’ime otú ahụ, ha ga-ezere ọdachi nke ga-adakwasị Krisendọm. Ha ga na-enwe ihu ọma na ngọzi Chineke ruo mgbe ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Na 66 O.A., ọtụtụ ndị Juu ṅụrịrị ọṅụ mgbe ndị agha Rom nọchibidoro Jerusalem lawara.

b Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ bụ́ Josephus si kwuo, na 70 O.A., ụnwụ nri nke dị na Jerusalem dị njọ nke na ndị mmadụ tara akpụkpọ, ahịhịa, na okporo ọka. N’otu nke a kọrọ akụkọ ya, otu nne hụrụ nwa ya n’ọkụ rie.

c N’aka nke ọzọ, “ihe nkwụchi nke Juda” pụrụ izo aka n’ihe ọzọ na-echebe obodo ahụ, dị ka ebe ndị e wusiri ike a na-akwasa ngwá agha, ebe ndị agha na-ebikwa.

[Foto dị na peeji nke 231]

Mgbe Zedekaịa gbara ọsọ, a nwụdere ya ma rụkpọọ ya anya

[Foto dị na peeji nke 232, 233]

Ndị Juu tọrọ atọ na Jerusalem nwere ntakịrị olileanya

[Foto dị na peeji nke 239]

Hezekaịa mere Elaịakim “ntú [dị] n’ebe kwesịrị ntụkwasị obi”

[Foto dị na peeji nke 241]

Dị ka Shebna, ọtụtụ n’ime ndị ndú Krisendọm ewetaworo Onye Okike mmechuihu site n’ịkpakọba akụ̀ na ụba

[Foto ndị dị na peeji nke 242]

N’oge a, a họpụtawo òtù onye na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, ilekọta ezinụlọ Jisọs

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya