Nzukọ Ije Ozi Maka August
Izu Na-amalite August 3
Abụ 216
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi May maka mba a na ọgbakọ unu.
20 min: “August Ọ̀ Ga-abụ Ọnwa Pụrụ Iche?” Ajụjụ na azịza. Tụleekwa igbe a kpọrọ “215,000!” Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè n’ozi n’August na n’ọnwa ọ bụla n’ime afọ ije ozi ọhụrụ.
15 min: “Nyefee Akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụzọ Dị Irè.” Ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ tinyere otu ma ọ bụ ihe ngosi abụọ banyere ụzọ njekwu ndị a tụrụ aro ha.
Abụ 191 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 10
Abụ 127
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kpọọ ndị mmadụ ikwu okwu ndị dị mkpirikpi banyere otú a pụrụ isi nweta aha na adres nke onye a gbawooro àmà n’okporo ámá, n’ogige ntụrụndụ, ma ọ bụ n’ebe ọzọ iji sochie mmasị o nwere.
15 min: Mkpa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ikere òkè n’ozi n’August.
20 min: “Ndị Ntorobịa—Jirinụ Agụmakwụkwọ Unu Na-eme Ihe.” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ndị kwesịrị ekwesị sitere na Teta!, April 8, 1992 (Bekee), peji nke 17-19, na Ụlọ Nche, July 15, 1991, peji nke 23-26.
Abụ 37 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 17
Abụ 163
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara mmadụ nile ikere òkè n’ozi ubi ná ngwụsị izu a.
35 min: “Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria.” Ajụjụ na azịza. Gbaa mmadụ nile ume ịkwado owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Abụ 108 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 24
Abụ 213
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ebe ọ fọrọ nanị otu ngwụsị izu n’August, gbaa mmadụ nile ume ikere òkè n’ozi tupu ọnwa agwụsịa.
20 min: Ụzọ Isi Nọgide n’Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke September 15, 1993, peji nke 28-31. Gbaa onye ọsụ ụzọ ajụjụ ọnụ, bụ́ onye mụtaworo ụzọ isi nagide nsogbu ndị siri ike ma nọgide na-asụ ụzọ.
20 min: Jiri Ozi Alaeze Anyị Na-eme Ihe nke Ọma. Ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Site n’iji ihe atụ ndị e nwere na nso nso a eme ihe, gosipụta ihe ọmụma na-abịa n’oge ya ndị na-adị n’Ozi Alaeze Anyị na uru ndị anyị na-erite site na ya: (1) isiokwu ndị na-akpali anyị ikerechi òkè anya n’ozi; (2) ahụmahụ ndị na-agba anyị ume n’ozi anyị dị nsọ; (3) aro ndị na-enyere anyị aka izi ozi ọma n’ụzọ dị irè; (4) ịma ọkwa maka akwụkwọ ndị ọhụrụ e nwere, bụ́ ndị bara uru n’ókèala unu; (5) akụkọ ozi ndị na-egosi otú ọrụ Alaeze ahụ si aga n’ihu; (6) Akụkọ Ọchịchị Chineke ndị na-akọ banyere ọganihu nke ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ; (7) ịma ọkwa na usoro ndị na-eme ka anyị mara ihe omume ndị dị n’ihu; (8) Igbe Ajụjụ ndị na-aza ajụjụ dị iche iche na-akpata oké nchegbu; na (9) ihe ntinye ndị na-agwa anyị banyere mgbakọ, mkpọsa ndị pụrụ iche, na ihe ndị ọzọ na-eme ka anyị mụrụ anya banyere mkpa ime mmụọ anyị. Gbaa mmadụ nile ume ịgụ mbipụta nke ọ bụla, itinye aro ya n’ọrụ, iji ya na-abịa Nzukọ Ije Ozi na nzukọ maka ozi ubi, idebekwa ya na faịlụ ha maka izo aka na ya n’ọdịnihu.
Abụ 210 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 31
Abụ 65
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi maka August. Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị ịchọpụta site n’aka onye ọ bụla nọ n’ìgwè ha iji hụ na a chịkọtara akụkọ ozi nile ka ọ na-erule September 6. Tụlee akwụkwọ a ga-enyefe na September.
15 min: “Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Onyeisi Oche Ndị Nlekọta.” Okwu onyeisi oche ndị nlekọta ga-ekwu. Mgbe ọ tụleghachisịrị ọrụ ya, o kwupụta ekele nye ọgbakọ maka nkwado ha na-enye ndị okenye ka ha na-azụ atụrụ ahụ.
18 min: Nyere Nwa Gị Aka Ịnagide Nsogbu n’Ụlọ Akwụkwọ. Onye okenye esoro mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ mụrụ ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ nwee nkwurịta okwu. Kwuo okwu dị mkpirikpi banyere ụfọdụ n’ime nsogbu ụmụaka na-ezutekarị, dị ka a kọwapụtara na Teta! nke November 8, 1994, peji nke 5-7. Mgbe ahụ, n’izo aka na peji nke 8-10, tụlee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi chebe ụmụ ha ma nọgide na-enwe ezi mmekọrịta nke ndị nkụzi na ndị mụrụ ụmụ.
Abụ 24 na ekpere mmechi.