Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite March 12
Abụ nke 112
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “April—Oge Iji ‘Dọgbuo Onwe Anyị n’Ọrụ Ma Gbasie Mgba Ike.’” (Paragraf nke 1-13) Okwu onyeisi oche ndị nlekọta ga-ekwu. Ntụle na-ekpo ọkụ nke ihe anyị chọrọ ịrụzu n’April. Gbaa onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ume ime òkè ya iji ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ bụ́ ka ndị nkwusa nile kerezuo òkè n’ozi n’ọnwa ahụ.
Abụ nke 147 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 19
Abụ nke 166
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
17 min: “Na-echebara Ọrụ Dị Iche Iche Dị Ebube nke Chineke Echiche.”* Gosi ihe osise ole na ole dị n’akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ ndị na-eme ka a ghọta amụma Aịsaịa.
20 min: “April—Oge Iji ‘Dọgbuo Onwe Anyị n’Ọrụ Ma Gbasie Mgba Ike.’” (Paragraf nke 14-30) Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Okwu nke e wepụtara akụkụ ya ụfọdụ maka ajụjụ na azịza. Onye ọ bụla kwesịrị ime ndokwa dị irè maka ikere òkè ruo n’ókè o kwere mee n’ozi n’April. Kọwapụta ndokwa dum e mere maka nzukọ maka ozi ubi n’ọnwa ahụ. Gbaa ndị nile nwere ike ime ya ume ịsụ ụzọ inyeaka na inweta akwụkwọ ndejupụta ma a gbasaa nzukọ.
Abụ nke 188 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 26
Abụ nke 204
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ụmụnna na oge agafebeghị maka itinye akwụkwọ maka ịsụ ụzọ inyeaka n’April. Gbaa mmadụ nile ume ịgbaso usoro ọgụgụ Bible Ememe Ncheta maka April 3-8, dị ka e depụtara ya n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2001. Maa ọkwa mgbe a ga-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche maka izu Ememe Ncheta ahụ. Echefula okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu na Sunday a, April 1, nke isiokwu ya bụ “Ònye Ka A Pụrụ Ịzọpụta?” Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè n’ozi n’ụbọchị ahụ, na-amalite April n’ụzọ dị mma.
20 min: “Ka Anyị Nile Sọpụrụ Jehova na Ọkpara Ya.” Okwu na-akpali akpali nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke okenye ga-ekwu. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè zuru ezu dị ka o kwere mee n’ọrụ pụrụ iche e mere atụmatụ ya maka April na itinyekwu mgbalị iji kpọọ ndị mmadụ òkù ịbịa Ememe Ncheta.
15 min: Ịkwadebe Otú Anyị Si Eche Magazin n’Ihu Mmadụ. Anyị ga-enyefe Ụlọ Nche na Teta! n’April. Tụleghachi peeji nke 8, paragraf nke 3 na nke 10, nke Ozi Alaeze Anyị nke October 1996. Kọwapụta (1) otu isiokwu, (2) otu isi ihe kwesịrị ekwesị a pụrụ iji kwurịta okwu, (3) otu ajụjụ pụrụ ịkpali mmasị, na (4) otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị nke a pụrụ iji mee ihe n’ụzọ dị irè n’iche magazin ọhụrụ ọ bụla n’ihu mmadụ. Gbalịsie ike iji broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma malitere ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible. Mechie site n’ime ihe ngosi a kwadebere nke ọma nke otú a pụrụ isi mee nke a ná nleta mbụ.
Abụ nke 207 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 2
Abụ nke 220
9 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa inye akụkọ ozi ubi ha maka March. Tụlee “Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta.”
18 min: “Ịhụnanya Na-akpali Anyị Ime Nkwusa.”a Kọwapụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’isiokwu ahụ. Gụnye echiche okwu ndị dị n’akwụkwọ Insight, Mpịakọta nke 2, peeji nke 673, paragraf nke 1. Kpọọ onye nkwusa nke nọworo na-ejechi ozi anya ruo ọtụtụ afọ òkù ịkọ otú ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ si akwali ya ịnọgide n’ọrụ nkwusa. Gbaa ndị nkwusa nile ume ikere òkè n’ọrụ ịgba àmà n’April na n’ọnwa nile ga-eso ya.
18 min: “Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịbịa Nzukọ.”b Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, paragraf nke 14-16, na-atụkwu aro maka iduru ndị a na-amụrụ Bible bịa ná nzukọ a. Gosi otú a pụrụ isi jiri ma broshuọ Na-achọ (ihe ọmụmụ nke 5, paragraf nke 7) ma akwụkwọ Ihe Ọmụma (isi nke 5, paragraf nke 22) mee ihe ná mmalite iji gbaa ume maka ịbịa nzukọ. Iji mee ihe atụ nke a, mee ka e mee ihe ngosi a kwadebere nke ọma ebe onye nkwusa ruru eru ji ikpo ọkụ na-agba onye ọ na-amụrụ ihe ume ichesi echiche ike banyere ịbịa nzukọ.
Abụ nke 47 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.