Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/02 p. 2-7
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite September 9
  • Izu Na-amalite September 16
  • Izu Na-amalite September 23
  • Izu Na-amalite September 30
  • Izu Na-amalite October 7
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 9/02 p. 2-7

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

IHE ỊRỊBA AMA: Ozi Alaeze Anyị ga-enwe usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi maka izu ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime mgbanwe dị ka o si dị mkpa iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi.” N’ebe o kwesịrị ekwesị, jirinụ minit 15 ná Nzukọ Ije Ozi ikpeazụ unu ga-enwe tupu unu agawa mgbakọ tụleghachi ndụmọdụ ndị dị mkpa, ndị sitere n’ihe ntinye nke ọnwa a, bụ́ ndị metụtara ọgbakọ unu. N’ọnwa February 2003, a ga-eme ndokwa iji otu Nzukọ Ije Ozi dum tụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ. Iji kwadebe maka ntụle ahụ, anyị nile pụrụ idetu ihe ndị dị mkpa ná mgbakọ ahụ, tinyere isi ihe ụfọdụ kpọmkwem ndị anyị ga-achọ iji mee ihe ná ndụ anyị nakwa n’ozi ubi. Mgbe ahụ anyị pụrụ ịkọwa otú anyị siworo jiri aro ndị ahụ mee ihe kemgbe anyị gasịrị mgbakọ ahụ. Ọ ga-abụ ihe na-agba ume bụ́ onye ọ bụla ịnụ ka ibe ya na-akọ otú o siworo rite uru ná ntụziaka dị mma a natara.

Izu Na-amalite September 9

Abụ nke 209

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Site n’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke September 15 na Teta! nke October 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke October 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi zaghachi n’ihe na-egbochi mkparịta ụka bụ́ “Enweghị m mmasị ná Ndịàmà Jehova.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 9.

15 min: “Mgbarịta Ume nke Pụrụ Iche.” Okwu. Mee ka e nwee agụụ ịga mgbakọ distrikti. Gbaa ndị nile bịaranụ ume ịnọ ná nnọkọ nke ọ bụla, malite n’ụtụtụ Friday ruo n’ehihie Sunday.

15 min: “Na-achụso Ihe Dị Mma Mgbe Nile.”a Mesie ike mkpa ọ dị ịgbaso ndokwa ndị e mere maka ụlọ obibi maka abamuru anyị. Mesie ihe ncheta anọ dị na paragraf nke 2 ike. Kọwaa ihe mere o ji dị mkpa ka onye ọ bụla kpaa ezi àgwà.

Abụ nke 115 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 16

Abụ nke 163

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: “Gboo Mkpa Ime Mmụọ Gị.” Okwu na mkparịta ụka a ga-eso ndị na-ege ntị nwee. Tụlee ihe mmadụ nile kwesịrị iji gee ntị nke ọma n’usoro ihe omume mgbakọ. Mesie ike mkpa ọ dị ka anyị na-etinye ihe ndị anyị mụtara n’ọrụ kama ịnụ ha nanị ọnụnụ. Tụlee ihe ahụ e kwuru n’elu banyere ihe a na-eme atụmatụ ya maka otu Nzukọ Ije Ozi na February 2003, bụ́ mgbe a ga-atụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ distrikti. Gbaa mmadụ nile ume idetu ihe. Kpọọ mmadụ ole na ole ikwu uru ndị ha ritere site n’usoro ihe omume nke afọ gara aga.

20 min: “Imeru Ihe n’Ókè n’Uwe na n’Ejiji.”b Ọ bụ onye okenye ga-eme ya, bụ́ onye ga-agụpụta paragraf nke ọ bụla mgbe a tụlesịrị ya. Nyere mmadụ nile aka ịhụ ihe mere o ji dị mkpa ilezi anya n’ọdịdị anyị mgbe anyị nọ n’ihu ọha.

Abụ nke 169 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 23

Abụ nke 107

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Site n’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ka otu onye okenye mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke October 1, meekwa ka otu ohu na-eje ozi gosi ụzọ isi nyefee Teta! nke October 8. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, kwughachi otu ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ ndị mbụ, bụ́ ndị e ji kpalie mmasị nke onye nwe ụlọ.

20 min: “Inyere Ndị Ọzọ Aka Inye Jehova Otuto.”c Ọ bụrụ na oge dị, kwuo otu isi ihe ma ọ bụ abụọ dị irè site n’akwụkwọ Reasoning, peeji nke 196-199.

15 min: Ịkwado Eziokwu ahụ n’Ụlọ Akwụkwọ. Gbaa otu onye nkwusa na-eto eto ma ọ bụ abụọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị laghachiworo n’ụlọ akwụkwọ, ndị chọpụtakwara mkpa ọ dị ibelata iso ụmụ klas ibe ha bụ́ ndị na-ekweghị ekwe na-akpakọrịta. Olee otú ha na-eme atụmatụ isi merie ihe ịma aka na ụrà nke ememe ịhụ mba n’anya, ịgba egwú na mgbakọta ndị a na-enwe n’ụlọ akwụkwọ, egwuregwu na-esoghị n’ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ, na àgwà na-adịghị ọcha? Kwuokwa okwu banyere ụzọ ndị ha na-eme atụmatụ isi gbaa àmà n’ụlọ akwụkwọ.

Abụ nke 171 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 30

Abụ nke 116

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka September.

10 min: Mkpa ọgbakọ.

15 min: Gịnị Mere Magazin Anyị Ji Pụọ Iche? Okwu na mkparịta ụka a ga-eso ndị na-ege ntị nwee. N’October, anyị ga na-enyefe Ụlọ Nche na Teta! Tụlee ihe ndị mere magazin anyị ji pụọ iche: (1) Ha na-ebuli aha Jehova elu. (2) Ha na-agba ume ka e nwee okwukwe n’ebe Jizọs nọ. (3) Ha na-akpọsa Alaeze Chineke. (4) Ha na-adọrọ uche gaa na Bible dị ka o kwuchaa o bie. (5) Ha na-akọwa mmezu nke amụma Bible. (6) Ha na-akọwa ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara n’ezie. (7) Ha na-egosi ụzọ isi nagide nsogbu nke oge a. (8) Ha na-amasị ụdị mmadụ dị iche iche. (9) Ha adịghị etinye ọnụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mee ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi, nke ọ bụla ana-egosi otú a pụrụ isi jiri otu n’ime isi ihe ndị a malite nkwurịta okwu.

15 min: “Gosi na I Ji Ihe Ndị E Ji Akwado Ọrụ Ọchịchị Chineke Kpọrọ Ihe.”d Ọ bụ onye okenye ga-eme ya. Kwuo ihe ndị a chọpụtaworo n’ógbè unu na ihe ọgbakọ pụrụ ime iji jiri akwụkwọ anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. Gbaa mmadụ nile ume ibelata ọda ha na-atụ ka ọ bụrụ nanị maka ihe ndị dị ha mkpa n’ezie. Cheta ihe ùgwù e nwere inye onyinye ego iji kwadoo ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ.—Lee “Soro Ndị Ọzọ Kerịta Ihe Dị Ka Mkpa Ha Si Dị,” nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke July 2000, peeji nke 3.

Abụ nke 21 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 7

Abụ nke 129

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Gịnị Ka Anyị Rụzuru n’Afọ Gara Aga? Okwu nke onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Kọwapụta ihe ndị dị ịrịba ama n’akụkọ ozi ọgbakọ maka afọ ije ozi 2002. Jaa mmadụ nile mma maka ihe ọma ndị a rụzuru. Lekwasị anya n’otú ọgbakọ si mee n’ịbịa nzukọ, ịga nletaghachi, n’ọmụmụ Bible, nakwa n’ịsụ ụzọ inyeaka, na-atụ aro ndị dị irè maka imeziwanye ihe. Setịpụ ihe mgbaru ọsọ a pụrụ iru eru maka afọ ọzọ.

20 min: “Zere Ịchụso ‘Ihe Efu Dị Iche Iche’”e Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 4, webata ihe ndị e kwuru n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke November 1999, paragraf nke 30-32. Mgbe ị na-atụle paragraf nke 5, webata ihe ndị e kwuru n’igbe dị n’Ụlọ Nche nke October 1, 1994, peeji nke 8. Mgbe a na-atụle paragraf nke 6, gụọ paragraf nke 18 n’ihe ntinye nke November 1999.

Abụ nke 105 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.

e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle nke ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya