Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite July 14
Abụ nke 56
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa July. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ kwekọrọ n’ọnọdụ ndị e nwere n’ókèala ọgbakọ unu nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke July 15 na Teta! nke August 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke August 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya.
15 min: Olee Otú Ife Jehova Si Eme Ka Ndụ Anyị Ka Mma? Mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Ezi ofufe bụ isi ihe na-eduga ná ndụ obi ụtọ, nke nwere nzube. (1) Ọ na-enyere anyị aka ịnagide nsogbu na nchekasị nke ndụ. (Fil. 4:6, 7) (2) Ọ na-agba anyị ume ịzụlite àgwà nsọpụrụ Chineke. (2 Pita 1:5-8) (3) Ọ na-enyere anyị aka iji oge na ihe onwunwe anyị mee ihe n’ụzọ kasị baa uru. (1 Tim. 6:17-19) (4) Ọ na-eme ka olileanya e nwere maka ọdịnihu bụrụ nke e ji n’aka. (2 Pita 3:13) (5) Ọ na-eme ka anyị nwee ike isoro Jehova na-akpachi anya. (Jes. 4:8) Kwuo otú ihe ndị a si kọọ ụkọ n’etiti ndị na-amaghị Jehova ma ọ bụ ndị na-adịghị ejere ya ozi.
20 min: “Inwe Ekele Maka Ebere Chineke.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, tụọ aro otú a pụrụ isi guzobe ụzọ magazin, dabere n’Ozi Alaeze Anyị nke October 1998, peeji nke 8. Kpọọ otu ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ nwere nkà n’ikwusa ozi ọma ka ha kwuo ụzọ ndị ha chọpụtaworo dị ka ndị dị irè n’ịmalite ọmụmụ Bible. Gbaa mmadụ nile ume ka ha mee ya ihe mgbaru ọsọ ha ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible.—om-IB 91.
Abụ nke 176 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 21
Abụ nke 184
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Ị̀ Pụrụ Imeghe Ụlọ Gị?” Okwu onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ ga-ekwu. Gbakwụnye ihe e kwuru n’Igbe Ajụjụ ndị dị n’Ozi Alaeze Anyị nke May 2001 na April 1990. Kwuo ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ole ọgbakọ nwere na nkezi ọnụ ọgụgụ ndị na-aga ha. Mee ka otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ kọọ otú ha na ezinụlọ ha siworo rite uru site n’inwe ìgwè ọmụmụ akwụkwọ n’ụlọ ha. Onye ọ bụla nke ga-enwe mmasị ka a nọrọ n’ụlọ ya na-enwe ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ime ka onyeisi oche ndị nlekọta mara banyere ya.
20 min: Ṅomienụ Àgwà Ha nke Ime Nkwusa n’Atụghị Egwu. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabere n’akwụkwọ Fee Chineke Ofufe, peeji nke 170-171. Kpọọ ndị na-ege ntị ka ha zaa ajụjụ ndị a jụrụ na paragraf nke 7 nakwa itinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’azịza ha. Gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a họtara ahọta. Mee ka ihe ndị a na-amụta n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a pụta ìhè, nakwa otú ha si enyere anyị aka inwe echiche kwesịrị ekwesị banyere ọrụ nkwusa e nyere anyị.
Abụ nke 201 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 28
Abụ nke 45
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi maka ọkara nke abụọ nke ọnwa July. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke August 1 na Teta! nke August 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke August 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, mee ka onye nkwusa gosi ebe ọ na-agba àmà n’oge ọ na-anọghị n’ozi.
15 min: Tụlee “Owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze n’Ala Ụfọdụ nke Europe.” Kwuo na a na-eji Ụtụ Ego Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze akwado owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ala ndị na-abachaghị ọgaranya nakwa n’ala ndị ọzọ.
20 min: “Ozi Ìgwè Na-enye Ọṅụ.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, kwuo okwu n’Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2001. Gbaa onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ajụjụ ọnụ dị mkpirikpi. Jụọ banyere ndokwa ozi ubi ndị o meworo maka ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ ya na otú ìgwè ahụ si erite uru site n’ịgbakọ àmà ọnụ.
Abụ nke 36 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 4
Abụ nke 178
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa a. Mee otu ma ọ bụ ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi nke ụzọ a pụrụ isi nyefee ha.
20 min: “Inyefe Akwụkwọ n’Ókèala A Na-asụ Ọtụtụ Asụsụ.”c Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, jiri asụsụ ala ọzọ a na-asụ n’ókèala ọgbakọ unu, bụ́kwa nke a na-enweghị ọgbakọ na-eji ya eme ihe, mee ihe ngosi dị mfe.—km-IB 7/02 p. 1 para. 4.
15 min: Ndị Na-eto Eto Na-enye Jehova Otuto! Okwu nke nwere akụkụ ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya na ịgba ajụjụ ọnụ. Ọ na-atọ anyị ụtọ ịnụ ka ndị na-eto eto na-enye azịza a kwadebere nke ọma ná nzukọ. Ịdị uchu na ọganihu ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enye obi ụtọ. Ha na-egosipụta ezi okwukwe ka ha na-agba ezi àmà n’ozi. Àgwà nsọpụrụ Chineke ha na-ewetara Jehova otuto. (yb88 p. 53-54) Ọganihu ime mmụọ ha na-atọ ntọala maka inwe ihe ùgwù dị iche iche n’ọdịnihu. Gbaa ndị na-eto eto abụọ ma ọ bụ atọ bụ́ Ndị Kraịst na-ekerechi òkè anya n’ihe omume ọgbakọ ajụjụ ọnụ dị mkpirikpi. Jaa ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ mma nke ọma maka ezi mgbalị ha n’ito Jehova.
Abụ nke 49 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.