Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 1
IZU NA-AMALITE NA JUN 1
Abụ nke 13 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 25 ¶9-16 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Samuel 16-18 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Samuel 17:14-20 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ndị Dị Umeala n’Obi A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Imefusị Ego Gị ma Ọ Bụ Akụ̀ Gị?—igw p. 21 ¶1-4 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Nyere ụdị mmadụ niile aka ka ha mara eziokwu.—1 Tim. 2:3, 4.
Nkeji 10: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Jun. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, unu atụlee ihe ndị dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.”
Nkeji 10: Jiri Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Na-ezi Ozi Ọma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. N’akwụkwọ ozi Nọvemba 27, 2014, e detaara ọgbakọ niile, e mere ka anyị mata gbasara akwụkwọ ịkpọ òkù ọhụrụ e bipụtara. E nwere ụzọ ihe abụọ a ga-eji ya na-eme. A ga-eji ya na-akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa ọmụmụ ihe anyị, jirikwa ya na-agwa ndị mmadụ na anyị na ha nwere ike ịnọ n’ụlọ ha mụwa Baịbụl. N’akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ, e sere ndị nọ ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa ebe onye nkwusa nọ n’ụlọ mmadụ na-amụrụ ya ihe. Ọ bụrụgodị na unu enwetabeghị akwụkwọ ịkpọ òkù a, kọwaa otú ọ ga-esi nyere anyị aka ma anyị ziwe ozi ọma nakwa ma anyị kpọwa ndị mmadụ òkù ka ha bịa ọmụmụ ihe anyị. (km 12/05 p. 4) Jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a: (1) Ò nwetụla ahụmahụ i nwere mgbe i nyere mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù a? (2) Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù a malite izi mmadụ ozi ọma mgbe anyị nọ ozi ụlọ n’ụlọ? (3) Olee otú anyị ga-esi jiri ya gwa ndị mmadụ na anyị nwere ike ịbịa n’ụlọ ha mụọrọ ha Baịbụl? (4) Olee otú ndị nne na nna ga-esi mee ka ụmụ ha jiri akwụkwọ ịkpọ òkù a na-ekwusa ozi ọma? (5) Olee otú ndị nkwusa na-eji akwụkwọ ozi ezi ozi ọma ga-esi jiri akwụkwọ ịkpọ òkù a gwa ndị mmadụ gbasara ọmụmụ ihe anyị? (6) Olee otú i si ejikarị ya agwa ndị ị na-amụrụ Baịbụl na ndị ọzọ nwere mmasị ka ha bịawa ọmụmụ ihe anyị? Gbaa ndị nkwusa ume ka ha na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù a mgbe ha na-anọghị n’ozi. Chetakwara ha na anyị kwesịrị ịna-ede ole anyị nyere ndị mmadụ n’ebe ahụ anyị na-ede broshọ ole anyị nyere ndị mmadụ n’akwụkwọ awa anyị.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kọwaa otú ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ndị Na-anaghị Asụ Asụsụ Anyị Ozi Ọma” sirila nyere ha aka n’ozi ọma. Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ nke 25 na Ekpere