Ikiri Ụwa
Ịzụ Ahịa Ohu na Brazil
“Ndị ohu e ji ụgbọ mmiri buga Brazil ji okpukpu iri karịa nke e bugara United States—ma ọnụ ọgụgụ ndị ohu e bu na-aga Brazil na-anwụ dị ukwuu nke na na 1860 ndị ojii bi na Brazil bụ nanị ọkara nke ndị nọ na United States,” ka ENI Bulletin nke Òtù Kansụl Chọọchị Ụwa (WCC) na-akọ. E mere atụmatụ na 40 pasent nke ndị ohu Africa nwụrụ n’ime ụgbọ mmiri. Iji mụbaa ọnụ ahịa ha, a na-emekọta ndị ohu Africa baptism site n’ịwụsa ha mmiri ka onye ụkọchukwu na-ekwu “okwu baptism.” Mgbe ọ na-ekwu okwu n’ụka “ncheta, nchegharị na ịdịghachi n’otu” e nwere na Salvador, Brazil, Aaron Tolen, bụ́ onye ndú WCC sitere Cameroon, kwuru, sị: “Ndị kpọtara anyị ebe a abụghị nanị ha kpatara ọdachi a. Anyị bụ́ ndị Africa so kpata ya. Anyị ewetuwo onwe anyị ala site n’ire ụmụnne anyị dị ka ngwá ahịa.”
Ndị Europe Na-ese Siga
Ụmụ amaala Europe na China bụ ndị kasị eji ụtaba eme ihe n’ụwa maka otu onye, ka Nassauische Neue Presse nke Frankfurt, Germany, na-akọ. N’Òtù Europe, 42 pasent nke ndị ikom na 28 nke ndị inyom na-ese siga. Otú ọ dị, pasent ndị ahụ dị nnọọ elu karị n’agbata ndị nọ n’afọ ndụ 25 ruo 39. Ise siga na-egbu mmadụ 100,000 na Germany na 100,000 ọzọ na Britain kwa afọ. Nso nso a, a gwọrọ president nke Czech Republic, bụ́ Václav Havel, bụ́ onye na-ese siga nke ukwuu ruo ọtụtụ afọ, ọrịa cancer akpa ume. Akwụkwọ akụkọ Süddeutsche Zeitung na-akọ na president ahụ degaara òtù Europe a na-akpọ Ise Siga Ka Ọ̀ Bụ Ahụ Ike akwụkwọ ozi na-ekwu na ọ na-enwe mmasị n’onye ọ bụla nke jisiri ike kwụsị àgwà nke ise siga.
Mkpọtụ Ọ̀ Na-akpatara Gị Ọrịa?
Ịnụrụ mkpọtụ, ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ ala, pụrụ ime ka ị rịa ọrịa, dị ka ihe ọmụmụ a kọrọ na magazin New Scientist nke Britain si kwuo. N’ihi nchọpụta ndị dị otú ahụ, Òtù Ahụ Ike Ụwa edegharịwo ụkpụrụ nduzi ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ mkpọtụ na-adịghị ize ndụ n’oge abalị. Ihe na-akpata nchegbu pụrụ iche bụ ihe àmà na-egosi na ụmụaka pụrụ ịbụ ndị nọ n’ihe ize ndụ karịsịa. Otu ihe ọmụmụ chọpụtara na ụmụaka bidewere ọdụ ụgbọelu mba nile nke Munich nwere ma ọbara mgbali elu ka elu ma ọ̀tụ̀tụ̀ adrenaline ka elu. Ndị nchọpụta ahụ chọpụtakwara na ụmụaka ahụ tara ahụhụ sitere ná mmebi nke ikike ịgụ ihe ha na ike ncheta ha ruo ogologo oge. Ndị yiri ka mkpọtụ adịkwaghị enye ha nsogbu na-eme otú ahụ “mgbe nile ná mfu nye ahụ ha,” ka onye ọkachamara ná mkpọtụ bụ́ Arline Bronzaft na-ekwu. “Mkpọtụ bụ nrụgide, ike na-emesịakwa gwụ ahụ n’ụzọ ụfọdụ.”
Ihe Ize Ndụ nke Ọgwụ Ahụhụ
Dị ka Ụlọ Ọrụ Mba Nile Na-eme Nnyocha Banyere Osikapa nke dị na Philippines si kwuo, mmepụta osikapa ga-anọgide bụrụ otu ihe ma ọ bụrụ na ndị ọrụ ugbo ejighị ọgwụ ahụhụ mee ihe ma ọlị. Otu onye ọkà mmụta sayensị nọ n’ụlọ ọrụ osikapa ahụ gwara Nzukọ Ụwa Maka Ihe Oriri, nke e nwere na Philippines, na ịgbasa ihe ọkụkụ ọgwụ n’ụzọ bara ụba bụ imefusị ihe ma bụrụkwa nke na-adịghị mkpa. Ọ bụghị nanị na ndị ọrụ ugbo na-agbasa ya n’oge na-ekwesịghị ekwesị n’afọ, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ, kama n’ezie ha na-egbu ụmụ ahụhụ ha na-ekwesịghị igbu. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ọrụ ugbo na-eleghara okwu ndụmọdụ nchebe anya mgbe ha na-agbasa ọgwụ ma na-eji ihe na-efesasị mmiri ọgwụ, bụ́ ndị dị mfe nkuru, eme ihe, ma ọ bụ ha na-agwakọta ọgwụ e ji egbu ahịhịa na ájá ma jiri aka fesaa ya. Òtù Ahụ Ike Ụwa na-akọ na n’ụwa nile ọgwụ ahụhụ na-akpata ọnwụ nke mmadụ 220,000 ugbu a na nde atọ ndị nsí na-emetụta n’ụzọ siri ike kwa afọ.
Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Akọwaa Ndị Nne na Nna Dị Mma
Olee otú ndị nọ n’afọ iri na ụma ga-esi akọwa nne na nna dị mma? Iji chọpụta, onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ na ọkà n’akparamàgwà mmadụ bụ́ Scott Wooding nyochara ihe karịrị ndị nọ n’afọ iri na ụma 600. Ebe Wooding tụrụ anya ka ndị ntorobịa ahụ jaa ime ihe masịrị mmadụ mma, nzaghachi ha juru ya anya. N’otu olu, ndị ahụ nọ n’afọ iri na ụma kwuru na ha chọrọ “akpaghị ókè, nlekọta, (‘ha chọrọ ịnụ okwu bụ́: “Ahụrụ m gị n’anya”’), ịkpa ọchị, [na] isetịpụ ezi ihe nlereanya,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star na-akọ. Wooding chọpụtakwara na ndị nọ n’afọ iri na ụma chọrọ ka ndị mụrụ ha nyere ha aka ịzụlite echiche nke ibu ọrụ. Mgbe ha mehiere ihe, ha na-atụ anya ahụhụ. Nke kasị mkpa, ndị na-eto eto kwuru na ọ na-agụsi ha agụụ ike ka ndị mụrụ ha soro ha nọkọọ ogologo oge karị.
Ịgwọ Ọrịa n’Ejighị Ọbara
“Egwu nke ọrịa ndị na-esite n’ọbara na oké ụkọ ọbara ndị e nyere n’onyinye akpalitewo mgbalị dị ukwuu iji wepụ mmịnye ọbara n’ebe ọ bụla o kwere mee,” ka akwụkwọ akụkọ The Globe and Mail na-akọ. Ịgwọ ọrịa na ịwa ahụ n’ejighị ọbara na-adabere n’iji nlezianya chịkwaa mfu ọbara, ‘a malitekwara ọtụtụ usoro ọhụrụ na mbụ iji gwọọ Ndịàmà Jehova,’ ka Globe ahụ na-ekwu. Dr. James A. Robblee, onye na-agba ọgwụ nkụnwụ ahụ na Mahadum nke Ụlọ Ọgwụ Obi nke Ottawa, otu n’ime ụlọ ọgwụ na-eji usoro ịwa ahụ n’ejighị ọbara eme ihe, kwetara, sị: “Echere m n’ezie na ha [Ndịàmà Jehova] akpaliwo echiche anyị nke ukwuu n’okwu a.”
Site ‘n’Ọgbọ Nkume’ Gaa n’Égbè
Otu nnukwute ọhịa mmiri ozuzo a na-adịghị achụ nta na ya n’agbata Brazil na Venezuela bụ ebe obibi nke ndị India Yanomami. N’ịbụ nke e bu ụzọ “chọpụta” n’afọ ndị 1960, e jiriwo nwayọọ nwayọọ kpugheere ndị Yanomami ahụ ihe mmepụta ọgbara ọhụrụ dị ka nko azụ̀, enyo, mkpá ọkụ, na redio. Otú ọ dị, ngwá ọgbara ọhụrụ rutere ha aka n’oge na-adịbeghị anya—égbè—na-eyi “ebo Ọgbọ Nkume ikpeazụ nọ na kọntinent ndị dị n’America egwu,” ka The Daily Journal nke Caracas, Venezuela, na-akọ. Site ná mgbanwerịta ihe na ịzụ ahịa, ndị na-egwu ọlaedo, ndị ahịa oké ọhịa, na ndị ozi ala ọzọ ewebatawo égbè n’ọdịbendị oge ochie nke ndị Yanomami. Ma mgbagbu nke ndị Yanomami atọ n’amaghị ama n’otu izu bụ ihe ncheta na-awụ ibobo n’ahụ nke ụzọ ịhụ mmepeanya ọgbara ọhụrụ pụrụ isi rụpụta ọdachi. Dị ka Claudia Andujar, onye isi nke Ndị Nkwado Ọrụ Yanomami, si kwuo: “Cheedị otú ịtụkwasịkwu égbè na nsí égbè na mberede si dị ize ndụ nye ebo nke ji ikike ya nke iji akụ́ nwere nsí, okwute na okpiri alụ ọgụ na-eme nganga.”
Azụ̀ Blue Whale Na-alọghachite
A chịkwawo ịchụ nta azụ̀ blue whale n’ụzọ siri ike eri 1946. N’oge ahụ, a chụwo nta azụ̀ ndị a na-enye nwa ara nke dị mita 30 n’ogologo, ton 150 n’ibu ruo n’ókè nke mkpochapụ. Ma ugbu a, site n’enyemaka nke Usoro Iji Ụda Chọpụta Ihe nke Ndị Agha Mmiri United States, e kpughewo na Ebe Ugwu Atlantic bụ ebe obibi nye ọnụ ọgụgụ buru ibu nke azụ̀ whale, gụnyere finback nakwa humpback, minke, na blue whale a na-adịghị ahụkebe. “E nwere ọtụtụ azụ̀ whale n’ụsọ oké osimiri nke Britain karịa ka e cheburu,” ka The Sunday Telegraph nke London na-ekwu. E meburu ngwá ọrụ e ji anụ mkpọtụ n’ime mmiri ndị tọgbọrọ n’ala mmiri n’omimi nke ihe ruru mita 3,000 iji chọta ụgbọ agha okpuru mmiri. Otú ọ dị, a chọpụtawo na ha dịkwa mma iji nụta iti mkpu ndị dị ala nke azụ̀ whale. E kwuru na iti mkpu nke azụ̀ whale na-aga kilomita 3,000 n’okpuru mmiri.
Hà Bụ Klas Ịgba Alụkwaghịm?
Na Pima County, Arizona, U.S.A., a na-achọ n’aka ndị mụrụ ụmụ chọrọ ịgba alụkwaghịm ịga nzukọ ọmụmụ ihe ga-ewe hour anọ na ọkara iji ghọta mmetụta ọ ga-enwe n’ahụ ụmụ ha, ka The Dallas Morning News na-akọ. A haziri klas ndị ahụ iji nyere ndị mụrụ ụmụ aka ịmụta “ụzọ isi hazie usoro nleta” na ịtụle “mgbe nwatakịrị toruru ogo iso nne ma ọ bụ nna na-enweghị ikike ịkpọrọ ya bie maka oge okpomọkụ.” Nke kasị mkpa, a na-enyere ndị mụrụ ụmụ aka ịghọta ịgba alụkwaghịm otú ụmụaka si aghọta ya, ka onye nduzi klas bụ́ Frank Williams na-ekwu. “Otú ọ dị, ana m eche ihe mere mmụta dị ka nke a ji bụrụ ihe a ga-emerịrị ná ngwụsị usoro a,” ka ọkàiwu n’iwu metụtara ezinụlọ bụ́ Alyce Pennington na-ekwu. Gịnị ma “a gaa klas dị ka nke a ọbụna tupu ha alụọ di na nwunye?”
Ndị Kasị Atụ Mkpọrọ n’Ụwa
Na 1995 e nwere 615 ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ maka 100,000 ọ bụla bi na United States, ka Ngalaba Okwu Ikpe nke United States na-ekwu. Nke a bụ okpukpu abụọ nke ọ̀tụ̀tụ̀ ịtụ ngá nke 1985, na-eme ya nke kasị ukwuu n’ụwa, ka The Wall Street Journal na-akọ. Russia nọ n’ọkwá nke abụọ, na-enwe 590 maka 100,000, na-adabere n’ihe ọmụma kasị ọhụrụ e nwere (1994).
Mmegharị Ihe Bụ Ihe Amamihe Dị na Ya
Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ El Universal nke Caracas, Venezuela, si kwuo, imegharị kom kom aluminum na-echebe 90 pasent nke ikike e ji emepụta kom kom ndị ọhụrụ. Imegharị akwụkwọ bụkwa ihe amamihe dị na ya nye mbara ebe obibi. A na-eji ikike ji 50 pasent dị ala emegharị akwụkwọ karịa nke e ji emepụta akwụkwọ ọhụrụ, a na-eji 58 pasent belata mmetọ mmiri, a na-ejikwa 74 pasent egbubilata mmetọ ikuku. Glas dị mma ọbụna karị n’ihi na a pụrụ imegharị ya n’ozuzu ya, ugboro ugboro.