Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 11/8 p. 3-5
  • Mkpọtụ—Ihe Mkpasu Iwe Ọgbara Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpọtụ—Ihe Mkpasu Iwe Ọgbara Ọhụrụ
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Bụghị Nsogbu Ọhụrụ
  • Ihe Mmerụahụ Ọgbara Ọhụrụ Zuru Ebe Nile
  • Mkpọtụ—Ihe Ị Pụrụ Ime Banyere Ya
    Teta!—1997
  • Ọ̀ Dị Mgbe A Ga-enwe Udo na Ịdị Jụụ?
    Teta!—1997
  • Ikiri Ụwa
    Teta!—1997
  • Ha Nọ Na Jeruselem Na-echere
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 11/8 p. 3-5

Mkpọtụ—Ihe Mkpasu Iwe Ọgbara Ọhụrụ

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRITAIN

“Otu n’ime nnukwu ihe ndị na-akpali nchekasị ná ndụ.”—Makis Tsapogas, onye ndụmọdụ nke Òtù Ahụ Ike Ụwa.

“Ihe mmerụahụ kasị ju ebe nile n’America.”—The Boston Sunday Globe, U.S.A.

“Ihe mmerụahụ kasị njọ nke oge anyị.”—Daily Express, London, England.

Ị PỤGHỊ ịhụ, ịnụ ísì, ịma ụtọ, ma ọ bụ imetụ ya aka. MKPỌTỤ, isi iyi nke nsogbu nke ndụ a na-adị n’obodo ukwu nke oge a, na-emerụ ndị bi n’ime ime obodo ahụ ugbu a.

Otu onye America bụ́ ọkà mmụta ihe ndị si n’okike bụ́ onye tinyere ihe dị ka afọ 16 n’inweta ụda nke ihe okike na tepụ achọpụtawo na ọrụ ya na-esiwanye ike. Na 1984 o nyochara ebe 21 na steeti Washington, U.S.A., bụ́ ndị mkpọtụ na-adịghị na ha ruo minit 15 ma ọ bụ karịa. Afọ ise ka e mesịrị, nanị atọ fọdụrụ.

Nye ọtụtụ ndị bi n’ụwa, ịchọta ebe atọ mkpọtụ na-adịghị na ha bụ ihe ịma aka. Na Japan, akụkọ zuru mba ahụ dum maka 1991 kwuru na mkpọtụ kpalitekwuru mkpesa karịa ụdị ihe mmerụahụ ọ bụla ọzọ. N’ezie, The Times nke London na-akọwa mkpọtụ nke ọma dị ka “ihe otiti kasị ukwuu nke ndụ a na-adị ugbu a.” Site n’ụja nkịta na-akpasu iwe nke na-adịghị akwụsị akwụsị ruo n’ịdasi ụda ike nke stereo onye agbata obi ma ọ bụ oké ụda nke mgbịrịgba mgbaàmà ụgbọala ma ọ bụ redio na-adịghị akwụsị akwụsị, mkpọtụ aghọwo ihe a na-ahụkarị. Ma, mkpọtụ na-emerụ ahụ abụghị ihe ọhụrụ. O nwere akụkọ dị ogologo.

Ọ Bụghị Nsogbu Ọhụrụ

Iji gbochie njupụta nke ụgbọ ndị na-agba n’ụzọ, Julius Caesar machibidoro ụgbọala nwere wheel ịga n’etiti Rom n’oge ehihie. Ọ bụ ihe mwute nye ya na ndị Rom ibe ya na iwu ahụ kpatara oké mkpọtụ na-emerụ ahụ n’abalị, “ka ụgbọala nwere ụkwụ ígwè ma ọ bụ nke osisi na-eme ụzụ n’elu ụzọ ngafe e ji okwute rụọ.” (The City in History, nke Lewis Mumford dere) Ihe karịrị otu narị afọ mgbe e mesịrị, onye na-ede uri bụ́ Juvenal kpesara na mkpọtụ dubara ndị Rom n’ọnọdụ ehighị ụra nke ọma na-adịghị ebi ebi.

Ka ọ na-erule narị afọ nke 16, isi obodo England, bụ́ London, aghọwo obodo ukwu na-ekwo ekwo. “Ihe mbụ ga-emetụworị ihe ka ukwuu ná ndị nleta n’ahụ,” ka Alison Plowden na-ede, onye dere Elizabethan England, “bụ oké ụzụ na-adịghị akwụsị akwụsị: mkpọtụ na ụda ịkụ hammer nke na-esite n’ọtụtụ puku ụlọ ọrụ, ụzụ ụgbọala nwere wheel, iti mkpu nke ehi a kpụ aga ahịa, mkpu nke ndị na-ere ihe n’okporo ámá ka ha na-akpọsa ngwá ahịa ha.”

Narị afọ nke 18 hụrụ mmalite nke mgbanwe n’usoro mmepụta ihe. Ugbu a mmetụta nke mkpọtụ na-esite n’ígwè ọrụ pụtara ìhè ka ntị nọ na-echi ndị ọrụ ụlọ mmepụta ihe. Ma ọbụna ndị bi n’obodo ukwu bụ́ ndị na-ebighị nso n’ụlọ mmepụta ihe mere mkpesa maka nsogbu nke na-arị elu. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Thomas Carlyle gbabara “n’ọnụ ụlọ e gbochiri nnọọ pụọ n’ụzụ” n’elu ụlọ ya dị na London iji zere oké ọkụkọ ndị na-akwa ákwá, ngwá egwú piano ndị agbata obi, na ụgbọ ndị na-agba n’okporo ámá dị nso. The Times na-akọ, sị: “O nweghị isi.” N’ihi gịnị? “Ụdị mkpọtụ ọhụrụ gbakasịziri ya ahụ, gụnyere opi ụgbọ mmiri na opi ụgbọ okporo ígwè”!

Ihe Mmerụahụ Ọgbara Ọhụrụ Zuru Ebe Nile

Taa ndị na-eme mkpesa maka mkpọtụ na-elekwasị anya n’ọdụ ụgbọelu ka ndị ọrụ ụgbọelu na-eguzogidesi mgbalị iti iwu megide mkpọtụ na-emerụ ahụ ike. Mgbe ọdụ ụgbọelu Manchester dị n’England guzobere nhá na-enweghị mgbanahụ mgbe ọ bụla Concorde ahụ gbagburu onwe ya n’ọsọ feliri, ndị a hà dị irè? Ee e. Otu onye na-anya Concorde kwetara na ụgbọelu ahụ na-eme mkpọtụ ma ọ bụrụ na o buru mmanụ dị nta karị felie iji belata ọ̀tụ̀tụ̀ mkpọtụ, ọ gaghị eru Toronto ma ọ bụ New York n’akwụsịghị akwụsị.

Igbochi mkpọtụ ụgbọ ndị na-agba n’ụzọ sikwara ike n’otu aka ahụ. Na Germany, dị ka ihe atụ, ihe ọmụmụ na-ekpughe na ụdị ihe mmerụahụ a na-enye 64 pasent nke ụba mmadụ ya nsogbu. Ọ bụkwa nsogbu na-arị elu, a kọrọ na o ji otu puku okpukpu ugbo karịa otú ọ dị tupu ọha mmadụ amalite ịgba ụgbọala. Otu akụkọ si Gris na-asị na “Atens bụ otu n’ime obodo ndị a kasị eme mkpọtụ na ha na Europe nakwa na oké ụzụ ya na-adịghị akwụsị akwụsị dị njọ nke na ọ na-emebi ahụ ike ndị Atens.” N’otu aka ahụ, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi nke Japan na-achọpụta ihe na-aka njọ ná mkpọtụ ụgbọ ndị na-agba n’ụzọ ma na-ekwu na ọ bụ n’ihi ịrị elu a nọgidere na-enwe n’ịgba ụgbọala. N’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ dị ala, injin ụgbọala bụ ebe bụ isi mkpọtụ si apụta, ma ọ gafee kilomita 60 kwa hour, taya na-eme mkpọtụ kasịnụ.

Ihe kasị akpata mkpesa banyere mkpọtụ na Britain bụ mkpọtụ ebe obibi. Na 1996, Ụlọ Ọrụ Iwu Kwadoro Maka Ahụ Ike Gburugburu Ebe Obibi nke Britain chọpụtara ịrị elu 10 pasent ná mkpesa banyere ndị agbata obi na-eme mkpọtụ. Otu nwanyị na-ekwuchitere ụlọ ọrụ ahụ kwuru, sị: “O siri ike ịkọwa. Otu ihe na-akpata ya pụrụ ịbụ na nrụgide nke ndụ nke ndị na-arụ ọrụ na-enwe na-eduba ha n’ịchọkwu udo na ịdị jụụ n’ụlọ.” Ụzọ abụọ n’ime atọ nke mkpesa nile e mere na Britain na 1994 gụnyere egwú ime abalị na injin ụgbọala na-eme mkpọtụ, mgbịrịgba, na opi. Ma gịnị banyere 70 pasent e mere atụmatụ ya nke ndị mkpọtụ na-emerụ ahụ na-emetụta bụ́ ndị na-adịghị eme mkpesa n’ihi egwu nke mmegwara? Nsogbu ahụ juru ebe nile n’eziokwu.

N’ihi mkpasu iwe nke mkpọtụ zuru ebe nile, ụlọ ọrụ ndị na-ezube ichebe gburugburu ebe obibi na-esi ọnwụ ka e tie iwu iji belata mkpọtụ na-emerụ ahụ. Na United States, dị ka ihe atụ, ógbè ụfọdụ eguzobewo iwu nchịkwa nke ha iji kpaara iji ígwè ọrụ ndị na-asụ ahịhịa eme ihe ókè. Na Britain, Iwu Mkpọtụ ọhụrụ lekwasịrị anya ná ndị agbata obi na-eme mkpọtụ ma na-enye ikike iri nhá ozugbo maka ịda iwu n’agbata 11:00 abalị na 7:00 ụtụtụ. Ndị ọchịchị ógbè nwedịrị ike ijichi ngwá egwú stereo e ji daa iwu. Ma, mkpọtụ ekweghị ala.

Ebe mkpọtụ na-emerụ ahụ bụ n’ezie nsogbu na-arị elu, ị pụrụ nnọọ ịjụ banyere ihe ị pụrụ ime dị ka onye o metụtara. Ma, ọzọkwa, olee otú ị pụrụ isi zere ime mkpọtụ? Ọ̀ dị mgbe a ga-enwe udo na ịdị jụụ na-adịgide adịgide? Gụọ isiokwu ndị na-esonụ maka azịza.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya