Ọ̀ Dị Mgbe A Ga-enwe Udo na Ịdị Jụụ?
MGBE a jụrụ ha ihe ha lere anya ya n’ezumike ofesi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 3 n’ime ndị njem nleta 4 si Britain zara sị, “Udo na ịdị jụụ.” Ma ebe mkpọtụ na-emerụ ahụ bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ, ọtụtụ kwenyere na ezigbo udo na ịdị jụụ bụ nanị olileanya na-agaghị eme eme.
N’agbanyeghị oké mgbalị iji belata mkpọtụ na-emerụ ahụ, ị pụrụ iche ma ezi uche ọ̀ dị n’ikwere na ọ dị mgbe a ga-enwe ihe ịga nke ọma zuru ezu. Gịnị banyere ndị ọzọ na-adịghị enwe nchegbu ị na-enwe?
Ihe Mgbochi Ndị A Ga-emeri
Ọ dịghị mfe iso ndị mmegide kwurịta okwu, ma ya fọdụzie ime ka ha nabata echiche gị. Mgbe ìgwè ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eme mkpọtụ zukọrọ n’èzí ụlọ ebe Ron bi, o butere ụzọ n’imeta ha enyi. Ọ matara aha ha. Ọbụna na o nyere aka idozi otu n’ime ịnyịnya ígwè ha. Eri mgbe ahụ, o nwetabeghị nsogbu ọzọ site n’aka ha.
Tụlee ọnọdụ nke Marjorie, nne nanị ya na-azụ nwa nwanyị nọ n’afọ iri na ụma, onye bi n’ọnụ ụlọ dị n’etiti nke ndị agbata obi na-eme mkpọtụ. Ndị bi n’elu enweghị kapet n’ala ụlọ ha. N’ihi ya, Marjorie na-achọpụta na mkpọtụ sitere n’ụmụaka iji ihe mkpọre agbagharị n’ala ụlọ, ịtụ bọl, ma ọ bụ ọbụna ịwụtu n’àkwà na-enye ya nsogbu. Ọzọkwa, nne ha na-eyi akpụkpọ ụkwụ ndị ike ya dị elu n’ụlọ. Marjorie ji obiọma jekwuru onye agbata obi ya ịgwa ya ka ọ kwụsịlatatụ ụzụ, ma ihe mgbochi nke anụghị asụsụ dị n’etiti ha wetara nkụda mmụọ. Kansụl ógbè ahụ ewepụtawo onwe ha izite onye ntụgharị okwu inye aka dozie nsogbu ahụ, ya mere Marjorie na-echere ka ihe ka mma.
N’okpuru ya e nwere otu nwoke na-akpọ egwú na-ada oké ụda n’agbata elekere anya asaa na asatọ kwa ụtụtụ, ụda bass na-adasi ike n’akwụsịghị akwụsị. Ụzọ akọ o si jekwuru nwoke ahụ wetara nzaghachi bụ na egwú ya dị ya mkpa iji ‘tinye ya n’ọnọdụ obi dị mma maka ọrụ ya.’ Olee otú Marjorie si anagide ya?
“Ana m arụ ọrụ n’inwe njide onwe onye na ndidi,” ka ọ na-ekwu. “Ahazigharịwo m usoro ihe omume m, ana m anọdụkwa ala ịgụ akwụkwọ n’agbanyeghị mkpọtụ ahụ. Achọpụtara m na ngwa ngwa uche m na-emikpu n’akwụkwọ m. Mgbe ahụ adịghị m anụkebe mkpọtụ ahụ.”
Heather, n’aka nke ọzọ, bi n’ụlọ chere otu ụlọ nkwari abalị ihu, bụ́ nke na-emechi n’ihe dị ka n’elekere isii n’ụtụtụ, ma abalị nke ime oké ụzụ gasịa. Ọ bụ ezie na o mesịrị kpesara ndị ọchịchị obodo, ọ dịbeghị oké ihe e mere iji kwụsị nsogbu ahụ.
Mkpọtụ Ọ̀ Ga-akwụsị?
“Oké ịdị jụụ na-enye ọtụtụ ndị nsogbu ma na-atụ ha ụjọ nke ukwuu,” ka Dr. Ross Coles nke Ụlọ Ọrụ Nnyocha Ịnụ Ihe nke Kansụl Nnyocha Ọgwụ na Ahụ Ike nke Britain na-ekwu. Abụ na-atọ ụtọ nke ụmụ nnụnụ, mpịasa dị nro nke ebili mmiri n’ụsọ osimiri bụ́ ájá ájá, mkpu obi ụtọ nke ụmụaka—ụda ndị a na ndị ọzọ na-eme anyị obi ụtọ. Ọ bụ ezie na ka ọ dị ugbu a anyị pụrụ ịchọ inwetụ ahụ efe pụọ ná mkpọtụ, anyị na-enwe obi ụtọ ịnọ n’etiti ezi ndị enyi bụ́ ndị anyị na ha na-akparịta ụka. Chineke ekwewo nkwa udo na ịdị jụụ maka ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi.
N’ime Bible ọbụ abụ ahụ kwupụtara, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) Ọchịchị Alaeze eluigwe nke Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ n’isi nso. (Daniel 2:44) Mgbe ahụ, n’okpuru ịchịisi Kraịst Jisọs, a ga-enwe “ọtụtụ udo . . . ruo mgbe ọnwa agaghị adị.”—Abụ Ọma 72:7; Aịsaịa 9:6, 7.
Ị pụrụ ijide n’aka na ntinye aka nke Chineke ga-eweta udo na ịdị jụụ nke anyị nile na-achọ, dị nnọọ ka Aịsaịa onye amụma Chineke buru n’amụma: “Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe nke ga-esi n’ofufe ezi omume ahụ pụta bụkwa ịnọ jụụ ná ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m ga-anọkwa . . . n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.”—Aịsaịa 32:17, 18.
Ọbụna ugbu a, ị pụrụ ịchọta udo na ịdị jụụ ime mmụọ ná nnọkọ Ndịàmà Jehova n’ógbè gị. Ọ bụ ezie na n’oge ụfọdụ ọtụtụ iri puku na-ezukọta maka ofufe ná mgbakọ ndị buru ibu—n’ezie a na-enwekwa ná nnọkọ ndị a ‘mkpọtụ n’ihi ụba ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka’—ụda ndị si na ha adịghị enye nsogbu kama ha na-enye obi ụtọ. (Maịka 2:12) Nwee ahụmahụ ya n’onwe gị site n’isoro Ndịàmà zukọọ n’ógbè gị ma ọ bụ site n’idega akwụkwọ n’otu n’ime adres ndị dị na peji nke 5 nke magazin a iji nweta ha. Nụrụ ụtọ nke ezi udo na ịdị jụụ ná mkpakọrịta ha ugbu a na ikekwe ruo mgbe ebighị ebi.