Dịrị Ndụ Ebighị Ebi Na Paradaịs n’Elu Ala
Chineke na-ekwe nkwa ndụ ebighị ebi nye ndị na-asọpụrụ ya. Okwu ya na-emesi anyị obi ike, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
Ma, ka e wee gụnye gị ná “ndị ezi omume,” ọ dị gị mkpa ime ihe karịrị ịmata ihe bụ eziokwu banyere ozizi Atọ n’Ime Otu. Ọ dị gị mkpa inwe ọganihu n’ihe ọmụma banyere Chineke. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka, ma ọ bụrụ na ị malitebeghị inweta enyemaka ahụ. Nanị degara Watch Tower akwụkwọ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara n’okpuru, na-arịọ maka inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ ka otu n’ime Ndịàmà Jehova bịa n’ebe obibi gị ma soro gị nwee ọmụmụ Bible mgbe nile n’anaghị gị ego ọ bụla.