Ezi Nnwere Onwe—Site n’Ole Ebe?
“Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike. Dọọ m aka ná ntị, Jehova.”—JEREMAỊA 10:23, 24.
1, 2. Olee otú ọtụtụ mmadụ si ele nnwere onwe anya, ma gịnị ọzọ dị mkpa ka a tụlee?
IHE Ịrụ ụka adịghị ya na ezi nnwere onwe na-amasị gị. Ị chọrọ inwere onwe gị ikwupụta echiche ndị nke gị, nwere onwe gị ikpebi ebe na otú ị ga-esi bie ndụ. Ị chọrọ ịhọrọ ọrụ ị ga-arụ, họrọ nri, egwú, ndị enyi gị. I nwere nhọrọ ndị nke gị banyere ọtụtụ ihe, oké ihe na ihe nta. Ọ dịghị onye ahụ zuru okè chọrọ ịbụ ohu ndị ọchịchị o kwuchaa ọgwụ, na-enwe nnwere onwe ime nhọrọ dị nta ma ọ bụ ghara inwe ma ọlị.
2 Otú ọ dị, ọ̀ bụ na ị gaghịkwa achọ ụwa ebe ndị ọzọ dị ka gị onwe gị ga-erite uru ezi nnwere onwe? Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ụwa ebe a ga-echebe nnwere onwe ka onye ọ bụla wee bie ndụ ya n’ụzọ zuru ezu karịsịa? Ọ bụrụkwa na o kwere omume, ị̀ ga-achọkwa ụwa nweere onwe ya site n’egwu, imempụ, agụụ, ịda ogbenye, mmetọ, ọrịa, na agha? N’ezie a na-achọsi nnwere onwe ndị dị otú ahụ ike.
3. N’ihi gịnị ka anyị ji ewere nnwere onwe n’ihe dị mkpa?
3 N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji enwe mmetụta dị ike otú ahụ maka nnwere onwe? Bible na-ekwu, sị: “Ebe mmụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” New World Translation] nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Ya mere, Jehova bụ Chineke nke nnwere onwe. Ebe ọ bụkwa na o kere anyị ‘n’onyinyo na oyiyi’ ya, o kenyere anyị mmụọ inwe onwe ime nhọrọ ka anyị wee ghọta ma nweta abamuru nke nnwere onwe.—Jenesis 1:26.
E Jiri Nnwere Onwe Mee Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi
4, 5. Olee otú e siworo jiri nnwere onwe mee ihe n’ụzọ na-adịghị mma n’akụkọ ihe mere nile?
4 N’akụkọ ihe mere eme nile, e mewo ọtụtụ mmadụ ohu, taa ha ahụhụ, ma ọ bụ gbuo ha n’ihi na ndị ọzọ jiri nnwere onwe ha ime nhọrọ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Bible na-akọ na n’ihe dị ka 3,500 afọ gara aga, ‘ndị Ijipt mere ka ụmụ Israel gbaa ohu n’okpuru mkpagbu: ha wee were ịgba ohu siri ike mee ka ndụ ha dị ilu.’ (Ọpụpụ 1:13, 14) Akwụkwọ The Encyclopedia Americana na-asị na narị afọ nke anọ T.O.A., ọnụ ọgụgụ ndị ohu bi n’Atens na n’obodo Grik abụọ ndị ọzọ karịrị ọnụ ọgụgụ ụmụ amaala, na-enwe ndị ohu 4 maka 1 nwa amaala ọ bụla. Akwụkwọ nke a sịkwara: “Na Rom, ndị ohu enwebughị ikike ọ bụla. A pụrụ igbu ya n’ihi mmejọ kasị dị nta.” Akwụkwọ Compton’s Encyclopedia na-ekwu, sị: “Na Rom, ọrụ ndị ohu na-arụ bụ ntọala nke obodo ahụ. . . . N’ubi, ndị ohu na-ebukarị ụdọ ígwè e ji kee ha na-arụ ọrụ. N’abalị, a na-ekekọ ha ọnụ ma kpọchibido ha n’ime nnukwu ụlọ mkpọrọ, bụ́ ndị a rụmituru n’ime ala.” Ebe ọtụtụ ndị ohu nweere onwe ha n’oge mbụ, cheedị echiche ihe ilu nke ndụ ndị ahụ e tisasịrị!
5 Ruo ọtụtụ narị afọ, Krisendọm tinyere aka n’ịzụ ahịa ohu nke mmegbu. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-asị: “Malite n’afọ ndị 1500 ruo n’afọ ndị 1800, ndị Europe ji ụgbọ mmiri buru ihe dị ka 10 nde ndị isi ojii bụ ndị ohu site n’Africa gaa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa.” N’ime narị afọ nke a nke 20, e mere ka ọtụtụ nde ndị e jidere ejide rụgbuo onwe ha n’ọrụ ma ọ bụ gbuo ha n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi dị ka ụkpụrụ iwu gọọmenti si dị. Ndị o metụtara gụnyere ọtụtụ Ndịàmà Jehova bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ n’ihi na ha jụrụ ịkwado ọchịchị igbu ọchụ nke Nazi.
Ịnọ n’Agbụ nye Okpukpe Ụgha
6. Olee otú okpukpe ụgha si mee ndị mmadụ ohu na Kenean oge ochie?
6 E nwekwara ịnọ n’agbụ nke na-esite n’ịrapara n’okpukpe ụgha. Dị ka ihe atụ, na Kenean oge ochie, a chụrụ ụmụaka n’àjà nye Mọlek. A sịrị na e nwere oké ọkụ na-enwu enwu n’ime nnukwu ihe onyinyo nke chi ụgha nke a. A na-atụbanye ụmụaka dị ndụ n’ógwè aka abụọ a gbatịrị agbatị nke ihe onyinyo ahụ, si n’ime ha na-adabanye n’ime ọkụ ahụ na-enwu n’okpuru. Ọbụna ndị Israel ụfọdụ fere ofufe ụgha nke a. Chineke sịrị na ha mere ‘ka ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom si n’ọkụ gabiga ruo Mọlek; bụ́ ihe nke Ọ na-enyeghị ha n’iwu, ọ bataghịkwa n’obi ya, ka ha wee mee ihe arụ a.’ (Jeremaịa 32:35) Abamuru ndị dị aṅaa ka Mọlek wetaara ndị na-efe ya ofufe? Ebee ka mba ndị Kenean ndị ahụ na ofufe Mọlek dị taa? Ha nile apụwo n’anya. Nke ahụ bụ ofufe ụgha, ofufe nke na-adabereghị n’eziokwu kama n’ụgha.—Aịsaịa 60:12.
7. Omume ajọ arụrụala dị aṅaa bụ akụkụ okpukpe Aztec?
7 Ọtụtụ narị afọ gara aga n’Etiti Kọntinenti America, ndị Aztec banyere n’ohu nye okpukpe ụgha. E nwere chi onwe onye dị iche iche, e fere ikike okike ndị dị iche iche ofufe dị ka chi, ihe dị iche iche a na-eme ná ndụ kwa ụbọchị nwere chi nke ya, ihe ọkụkụ nwere chi nke ha, ọbụna igbu onwe onye nwere chi. Akwụkwọ bụ́ The Ancient Sun Kingdoms of the Americas na-akọ, sị: “A haziri gọọmenti Aztec Mexico malite n’elu ruo n’ala inwe ike ịkwado, wee si otú ahụ mee ka obi dajụọ ikike ndị a na-adịghị ahụ anya site n’inye ha ọtụtụ mkpụrụ obi mmadụ dị ka o kwere mee inye ha. Ọbara bụ ihe ọṅụṅụ nke chi ndị ahụ. Iji nweta ndị mkpọrọ kwesịrị ekwesị a ga-achụrụ chi ndị a àjà, a nọgidere na-alụ ọtụtụ agha nta.” Mgbe a raara otu nnukwute ụlọ nsọ nye na 1486, ‘a kwụwara ọtụtụ puku ndị e jidere n’agha n’ahịrị n’ahịrị na-echere ka a gbasaa ha n’elu nkume e ji achụ àjà. A ghụpụtara mkpụrụ obi ha ma chee ha n’ihu anyanwụ ná mkpirikpi oge’ iji mee ka obi jụrụ chi anyanwụ. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-asị: “Mgbe ụfọdụ ndị ahụ na-efe ofufe na-eri akụkụ ahụ nke onye ahụ e gburu egbu.” Ma ihe omume ndị ahụ azọpụtaghị Alaeze Ukwu Aztec ma ọ bụ okpukpe ụgha ya.
8. Gịnị ka otu onye na-edugharị ndị nleta kwuru banyere otu igbu ọchụ n’oge ndị a nke karịrị nke ukwuu ihe weere ọnọdụ n’etiti ndị Aztec?
8 N’otu mgbe, ndị ọbịa nọ na-ejegharị ikiri otu ụlọ ndebe ihe mgbe ochie ebe otu ọkwá ihe ngosi na-egosipụta ndị nchụàjà Aztec ka ha na-aghụpụta mkpụrụ obi otu onye na-eto eto. Mgbe onye ahụ na-edugharị ha kọwara ihe ahụ ha hụrụ, ụfọdụ ndị nọ n’òtù ngagharị ahụ mara ọsụ. Mgbe ahụ onye na-edugharị ha kwuru, sị: “Ahụrụ m na omume ndị Aztec nke ịchụ ndị ikom na-eto eto n’àjà nye chi ndị ọgọ mmụọ na-ewute unu. Ma, n’ime narị afọ nke 20 nke a, a chụwo ọtụtụ nde ndị ikom na-eto eto n’àjà nye chi nke agha. Nke ahụ ọ̀ ka mma?” Ọ bụ ihe bụ eziokwu na n’agha, ndị ndú okpukpe nke mba nile na-ekpe ekpere maka mmeri ma na-agọzi ndị agha ọ bụ ezie na ndị nọ n’otu okpukpe na-anọkarị n’akụkụ ndị na-emegiderịta onwe ha, na-egburịta ibe ha.—1 Jọn 3:10-12; 4:8, 20, 21; 5:3.
9. Olee ihe omume na-ewere ndụ ọtụtụ ndị na-eto eto karịa ihe omume ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme?
9 Ogbugbu a na-egbu ụmụ ọhụrụ a na-amụbeghị amụ site n’isikwopụ afọ ime akarịwo ọchụchụ a chụrụ ndị na-eto eto n’àjà nye Mọlek, nye chi dị iche iche nke Aztec, ma ọ bụ nye agha n’ịdị ukwu, ihe dị ka 40 ma ọ bụ 50 nde kwa afọ gburugburu ụwa. Ọnụ ọgụgụ ụmụ ọhụrụ e sikwopụrụ n’ime nanị afọ atọ gara aga karịrị otu narị nde mmadụ e gburu n’agha nile nke narị afọ nke a. Kwa afọ, a na-esikwopụ afọ ime nke ọnụ ọgụgụ ka ukwuu karịa ndị nile e gburu n’afọ 12 nke ịchịisi Nazi. N’ime ọtụtụ iri afọ ndị na-adịbeghịkwa anya, e sikwopụwo ọtụtụ puku okpukpu ọnụ ọgụgụ ụmụaka karịa ndị nile a chụworo n’àjà nye Mọlek ma ọ bụ chi dị iche iche nke Aztec. Ma ọtụtụ ndị, (ma ọ bụghị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ) nke ndị sikwopụworo afọ ime, ma ọ bụ na-esikwopụ ha, na-asị na ha nọ n’otu okpukpe.
10. Olee ụzọ ọzọ e si jide ụmụ mmadụ n’ohu nye okpukpe ụgha?
10 Okpukpe ụgha na-eduba ndị mmadụ n’ohu n’ụzọ ndị ọzọ kwa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ kweere na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ n’ala mmụọ. Otu ihe nkwenkwe ụgha dị otú ahụ rụpụtara bụ ụjọ na ofufe nke ndị nna ochie iji nweta abamuru ndị e chere na a pụrụ inweta site n’aka ha. Nke a na-eduba ndị mmadụ gaa n’ịbụ ohu nye ndị dibịa amoosu, ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị ụkọchukwu, bụ́ ndị a na-ejekwuru n’ihi na e chere na ha ga-enyere ndị dị ndụ aka ime ka obi jụrụ ndị nwụrụ anwụ. O ziri nnọọ ezi ịjụ ajụjụ ahụ bụ, È nwere ụzọ mgbapụ ọ bụla site n’ịbụ ohu dị otú ahụ?—Deuterọnọmi 18:10-12; Eklisiastis 9:5, 10.
[Foto dị na peeji nke 5]
N’akụkọ ihe mere eme nile, ụfọdụ ejiriwo nnwere onwe ha ime nhọrọ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’ime ndị ọzọ ohu