Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 5/1 p. 3-5
  • 1914—Afọ ahụ nke Menyere Ụwa Egwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1914—Afọ ahụ nke Menyere Ụwa Egwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na Mberede, n’August
  • Ọ̀ Kwụsịrị Mgbe Krismas Gasịrị?
  • Oké Mgbanwe Kpam Kpam
  • Ọgbọ nke 1914—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Olee Mgbe Mbibi Ụwa E Buru Amụma Ya Ga-abịa?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ogologo Oge Ha Aṅaa Ka Usoro Ihe Nke A Ga-adịru?
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Nweenụ Ekele—Alaeze Mesaịa nke Jehova Na-achị Achị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 5/1 p. 3-5

1914—Afọ ahụ nke Menyere Ụwa Egwu

“Oké Agha nke 1914-1918 nọ dị ka ókèala nke ụwa e bibiri ebibi nke na-ekewa oge ahụ site na nke anyị. Site n’ikpochapụ ọtụtụ ndụ . . . , site n’ibibi nkwenkwe dị iche iche, n’ịgbanwe echiche, ma na-ahapụ ọnyá na-agaghị ala ala nke ihe na-abụghị ezie, o mere ka e nwee oké ọdịiche n’ụzọ anụ ahụ nakwa n’ụzọ akparamagwa n’etiti ọgbọ abụọ ahụ.”—Site n’akwụkwọ bụ́ The Proud Tower—A Portrait of the World Before the War 1890-1914, nke Barbara Tuchman dere.

“Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ—ma ọ bụchabeghị—akụkụ nke akụkọ ihe mere eme, n’ihi na ọtụtụ puku ndị na-eto eto ná mmalite narị afọ iri abụọ nke a nke oké ihe omume ka dị ndụ.”—Site n’akwụkwọ bụ́ 1914, nke Lyn MacDonald dere, bụ́ nke e bipụtara na 1987.

N’IHI gịnị ka a ga-eji nwee mmasị n’afọ ahụ bụ 1914? ‘Ọ bụ ọdịnihu bụ nchegbu m,’ ka ị pụrụ ikwu, ‘ọ bụghị oge gaworo aga.’ N’ihi inwe nsogbu ndị dị ka mmetọ ụwa, ndakpọ nke ndụ ezinụlọ, ịrị elu nke imempụ, ọrịa uche, na enweghị ọrụ, ọdịnihu nke mmadụ pụrụ iyi ihe gbara ọchịchịrị. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nyochaworo ịdị mkpa nke 1914 nwetara ihe ndabere maka inwe olileanya n’ọdịnihu ka mma.

Ruo ọtụtụ iri afọ, Ụlọ Nche akọwawo na n’afọ 1914, ihe a kpọrọ mmadụ nwere ahụmahụ nke ihe a kpọrọ “mmalite ihe mgbu.” Okwu ndị ahụ mejupụtara akụkụ nke oké amụma ahụ Jisọs Kraịst buru banyere ihe ndị ga-eme tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke mmadụ.—Matiu 24:7, 8.

Taa, ọ bụ ọnụ ọgụgụ dị nta nke ihe a kpọrọ mmadụ ka na-echeta ihe omume ahụ na-akpali akpali nke mere na 1914. Ọgbọ ahụ meworo agadi ọ̀ ga-agabiga tupu Chineke azọpụta ụwa pụọ ná mbibi? Ọ bụghị dị ka amụma Bible si kwuo. “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a nile,” ka Jisọs kwere ná nkwa, “maranụ na ọ nọ nso, n’ọnụ ụzọ. N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.”—Matiu 24:33, 34.

Iji ghọta ihe mere afọ 1914 ji dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme, tụlee ihe bụ ọnọdụ ụwa ruo n’etiti afọ 1914. Tupu oge ahụ, ndị eze dị ka Czar Nicholas nke Russia, Kaiser Wilhelm nke Germany, na Emperor Franz Josef nke Austria na Hungary nwere oké ike. Nke ọ bụla n’ime ndị ikom ndị a pụrụ ịchịkọta ihe karịrị nde ndị agha anọ ma zipụ ha ije agha. Ma ndị nna ha ochie ebinyewo aka n’akwụkwọ maka inwe ihe a kpọrọ Njikọ Aka Dị Nsọ, na-akpọsa na Chineke ezipụwo ha ịchị akụkụ dị iche iche nke otu oké “mba ndị Kristian.”

Dị ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica si kwuo, akwụkwọ nke a “metụtara ebumnuche nke atụmatụ imekọ ihe ọnụ na Europe n’ụzọ dị ike na narị afọ nke 19.” E ji ya mee ihe imegide òtù ọchịchị onye kwuo uche ya na ịkwado ihe ahụ a sịrị na ọ bụ ikike Chineke nyere ndị eze. “Anyị, bụ́ ndị Kristian bụ́ Ndị Eze,” ka Kaiser Wilhelm degaara Czar Nicholas, “nwere otu ibu ọrụ dị nsọ, nke Eluigwe nyere anyị, ya bụ ịkwalite ụkpụrụ nke [ikike ahụ Chineke nyere ndị eze].” Nke a ọ̀ pụtara na e nwere ụzọ ụfọdụ e si jikọta ndị eze Europe na Alaeze Chineke? (Tụlee 1 Ndị Kọrint 4:8.) Gịnịkwa banyere chọọchị ndị ahụ kwadoro ndị eze ahụ? Ọbụbụ ha sịrị na ha bụ ndị nọ n’Iso Ụzọ Kraịst ọ̀ bụ nke ziri ezi? Azịza nye ajụjụ ndị a ghọrọ ndị pụtara ìhè n’afọ ndị ahụ sochiri 1914 ozugbo.

Na Mberede, n’August

“Oge opupu ihe ubi na oge okpomọkụ nke afọ 1914 bụ nke e ji ịdị jụụ pụrụ iche mara na Europe,” ka onye Britain ọnụ na-eru n’okwu ọchịchị bụ Winston Churchill dere. N’ozuzu ha, ndị mmadụ nwere nchekwube banyere ọdịnihu. “Otú ụwa dị na 1914 na-eme ka e nwee olileanya na ihe ga-adị mma,” ka Louis Snyder kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ World War I.

N’eziokwu, ruo ọtụtụ afọ e nwewo oké ịma aka n’etiti Germany na Britain. Otú o sina dị, dị ka ọkọ akụkọ bụ G. P. Gooch kọwara n’akwụkwọ ya bụ́ Under Six Reigns: “Inwe ọgba aghara na Europe yiri ihe na-agaghị eme eme na 1914 karịa na 1911, 1912 ma ọ bụ 1913 . . . Mmekọrịta dị n’etiti ọchịchị abụọ ahụ ka mma karịa ka ha dịworo eri ọtụtụ afọ.” Dị ka Winston Churchill, bụ́ onye so n’òtù ndị minista Britain na 1914, si kwuo: “O yiri ka Germany ò nwere otu echiche ahụ nke anyị nwere, nke ikpebisi ike inwe udo.”

Otú ọ dị, site n’ogbugbu e gburu Sarajevo, bụ́ onye e chiri eze nke Alaeze Ukwu Austria na Hungary, na June 28, 1914, ọchịchịrị gbara n’igwe. Mgbe otu ọnwa gasịrị, Emperor Franz Josef mara ọkwa ibuso Serbia agha ma nye usuu ndị agha ya iwu ka ha wakpo alaeze ahụ. Ka ọ dị n’oge ahụ, n’abalị nke August 3, 1914, site n’iwu nke Kaiser Wilhelm nyere, oké ìgwè ndị agha Germany wakporo alaeze nke Belgium na mberede ma lụrụ ọgụ ruo France. N’ụbọchị na-esonụ, Britain mara ọkwa ibuso Germany agha. Banyere Czar Nicholas, o nyere iwu ka a chịkọta oké ìgwè ndị agha Russia maka ibuso Germany na Austria na Hungary agha. Njikọ Aka Dị Nsọ adawo n’ịkwụsị ndị eze Europe pụọ n’inubanye kọntinent ahụ gaa n’oké ịwụfu ọbara nke igburịta onwe ha. Ma ihe dị oké egwu ka na-abịa.

Ọ̀ Kwụsịrị Mgbe Krismas Gasịrị?

Ntiwapụ nke agha emeghị ka ndị mmadụ kwụsị inwe nchekwube. Ọtụtụ kwenyere na ọ ga-eme ka e nwee ụwa ka mma, oké ìgwè mmadụ zukọtakwara n’akụkụ nile nke Europe ikwupụta nkwado ha na-enye ya. “Ọ dịghị onye ọ bụla nọ na 1914,” ka A. J. P. Taylor dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Struggle for Mastery in Europe—1848-1918, “ji ihe ize ndụ nke agha kpọrọ ihe ma e wezụgakwa n’ihe metụtara okwu agha. . . . Ọ dịghị onye ọ bụla tụrụ anya na a ga-enwe ọdachi ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya.” Kama nke ahụ, ọtụtụ buru amụma na ọ ga-akwụsị n’ọnwa ole na ole.

Otú o sina dị, ogologo oge tupu ndị Europe enwee ike ime ememe Krismas ha nke 1914, oké mwụfu ọbara ebilitewo n’okporo ụzọ a rụrụ n’ime ala nke gbatịrị ruo ihe karịrị 700 kilomita site na Switzerland nke dị n’ebe ndịda ruo n’ụsọ osimiri Belgium nke dị n’ebe ugwu. A kpọrọ nke a Ọgbọ Agha Ebe Ọdịda Anyanwụ, onye Germany na-ede akwụkwọ bụ́ Herbert Sulzbach kwuru okwu banyere ya n’otu ihe o denyere na diary ya n’ụbọchị ikpeazụ nke afọ 1914. Ihe odide ahụ na-agụ, sị: “Ajọ agha nke a nọgidere na-aga n’ihu, ọ bụkwa ezie na e chere na ná mmalite ọ ga-akwụsị n’izu ole na ole, ugbu a a maghị mgbe ọ ga-akwụsị.” Ka ọ dị n’oge ahụ, n’akụkụ Europe ndị ọzọ, agha ndị a na-awụfu ọbara na ha na-akpọtụ n’etiti usuu ndị agha Russia, Germany, Austria na Hungary, na Serbia. Ọgụ ahụ gbasara gabiga Europe, a lụkwara agha n’oké osimiri dị iche iche nakwa n’Africa, Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, nakwa n’agwaetiti dị iche iche nke Pacific.

Mgbe afọ anọ gasịrị e bibiri Europe. Nke ọ bụla n’ime Germany, Russia, na Austria na Hungary tụfuru ihe nọ n’agbata otu nde ndị agha na nde abụọ. Ọbụna na Russia atụfuwo usoro ọchịchị ndị eze ya n’ihi nkwatu ọchịchị ndị Kọmunist nke 1917. Lee ihe dị oké egwu nke ahụ bụụrụ ndị eze Europe na ndị ụkọchukwu na-akwado ha! Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge a ka na-ekwupụta na nke ahụ juru ha anya. N’akwụkwọ ya bụ́ Royal Sunset, Gordon Brook-Shepherd jụrụ, sị: “Olee otú o si bụrụ na ndị ọchịchị, bụ́ ndị ọbara na alụmdi na nwunye jikọtara ihe ka ọtụtụ n’ime ha, bụrụkwa ndị raara onwe ha nye n’ichebe ọbụbụeze ha, hapụrụ onwe ha ka ha daba ná mwụfu ọbara nke ụmụnne bụ́ nke kpochapụrụ ọtụtụ n’ime ha ma mee ka ike gwụ ndị nile lanarịrịnụ?”

Mba France tụfukwara ihe karịrị otu nde ndị agha, Alaeze Ukwu Britain, bụ́ nke usoro ọchịchị ndị eze ya na-enwekwaghị ike ogologo oge tupu agha ahụ amalite, tụfukwara ihe karịrị 900,000 ndị agha. Na ha nile, ihe karịrị nde ndị agha 9 nwụrụ, e merụkwara 21 nde ndị ọzọ ahụ. Banyere ndị na-ejeghị agha nwụrụ anwụ, akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Ọ dịghị onye maara ndị nkịtị ole nwụrụ n’ihi ọrịa, agụụ, na ihe ndị ọzọ agha na-akpata. Ụfọdụ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme kwenyere na ndị nkịtị nwụrụnụ ruru ka ndị agha nwụrụnụ.” Ntiwapụ nke oké ahụ ọkụ ndị Spain nke afọ 1918 lara 21,000,000 ndụ ndị ọzọ n’iyi gbaa ụwa gburugburu.

Oké Mgbanwe Kpam Kpam

Ụwa abụkwaghị ihe ọ bụ na mbụ mgbe Oké Agha ahụ gasịrị, dị ka a kpọrọ ya n’oge ahụ. Ebe ọ bụ na ọtụtụ chọọchị nke Krisendọm ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi kere òkè na ya, ọtụtụ ndị lanarịrịnụ, bụ́ ndị ihe ha tụrụ anya ya na-emeghị, gbahapụrụ okpukpe ma nakwere ekweghị na Chineke. Ndị ọzọ chigharịkwuuru nchụso nke ihe onwunwe na ihe ụtọ. Dị ka Professor Modris Eksteins si kwuo n’akwụkwọ ya bụ́ Rites of Spring, afọ ndị 1920 “hụrụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị ịrịba ama nke ịchụso ihe ụtọ na inwe mmekọahụ.”

“Agha ahụ,” ka Professor Eksteins kọwara, “mebiri ụkpụrụ omume ọma.” Ndị ndú okpukpe, agha, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị akụziworo ndị ikom nọ n’akụkụ abụọ ahụ ile igbu mmadụ n’ìgwè anya dị ka omume ọma. Nke a, ka Eksteins kwetara, “bụ nnọọ mmebi kasị njọ e mebiri ụkpụrụ omume ọma nke a sịrị na ọ gbanyere mkpọrọgwụ n’ụkpụrụ okpukpe ndị Juu na ndị Kraịst.” “N’Ọgbọ Agha Ebe Ọdịda Anyanwụ,” ka o kwukwara, “ụlọ ndị akwụna ghọrọ n’oge na-adịghị anya ogige ndị agha weghaara mgbe nile . . . Banyere omume ndị nkịtị, ma ndị ikom ma ndị inyom ghọrọ ndị na-eme omume rụrụ arụ. Ịgba akwụna rịrị elu n’ụzọ pụtara ìhè.”

N’ezie, 1914 gbanwere ọtụtụ ihe. O mebeghị ka e nwee ụwa ka mma, agha ahụ emesịghịkwa ghọọ “agha ga-akwụsị agha nile,” dị ka ọtụtụ mmadụ nweworo olileanya na ọ ga-eme. Kama nke ahụ, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Barbara Tuchman kwuru: “Echiche ndị dị elu na mkpali ndị e nwere ruo na 1914 jiri nwayọọ mikpuo n’okpuru ndakpọ olileanya.”

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị hụrụ ọdachi mere na 1914 bụ ndị ihe mere n’afọ ahụ juru anya. N’ezie, tupu agha ahụ etiwapụ, ha anọwo na-atụ anya “oge dị oké njọ nke nsogbu.” Olee ndị ha bụ? Gịnịkwa ka ha maara nke ndị ọzọ na-amaghị?

[Igbe dị na peeji nke 5]

Nchekwube Ndị Britain na 1914

“Ruo ihe dị ka otu narị afọ, ọ dịghị onye iro ọ bụla pụtaworo n’osimiri ndị dị n’agwaetiti anyị. . . . E nwere ihe isi ike ọbụna n’ịtụ anya na a ga-enwe ihe iyi egwu nye ụsọ osimiri ndị a dị n’udo. . . . Ọ dịbeghị mgbe London mara mma ma baa ụba karịa otú ọ dị n’oge ahụ. Ọ dịbeghị mgbe e nwere ọtụtụ ihe dị mma omume, na olile, na ọnụnụ karịa ka e nwere n’oge ahụ. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị meworo agadi ma ọ bụ ndị na-eto eto chetụrụ echiche na ihe ha na-ahụ, n’oge ahụ na-enweghị atụ nke 1914, bụ, n’ezie, ọgwụgwụ nke otu ọgbọ.”—Before the Lamps Went Out, nke Geoffrey Marcus dere.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya