Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 10/1 p. 28-31
  • Ndị E Wusiri Ike Ịjụ Ihe Ọjọọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị E Wusiri Ike Ịjụ Ihe Ọjọọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịsị Ee E Dị Mkpa Taa Karịsịa
  • Ịmụta Ihe Site n’Aka Nwa Okoro nke Sịrị Ee E
  • Ịjụ Nrụgide Ndị Ọgbọ
  • Ịsị Ee E—Okwu Metụtara Ọnwụ na Ndụ
  • “Olee Otú M Ga-esi Mee Oké Ihe Ọjọọ A?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ụzọ Chineke Si Ele Ịdị Ọcha n’Omume Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Jehova Na-eme Ka Ihe Anyị Na-eme Na-aga Nke Ọma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ụmụ Okoro na Agbọghọ Ndị Jere Ozi n’Oge Bible
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 10/1 p. 28-31

Ndị E Wusiri Ike Ịjụ Ihe Ọjọọ

“MGBE m ka dị afọ iri na ụma ma na-arụ ọrụ n’ụlọ ahịa a na-ere ihe e ji esi nri,” ka Timothy na-akọwa, “onye ọrụ ibe m kpọrọ m òkù ka m bịa n’ụlọ ya. Ọ sịrị na nne na nna ya agaghị anọ ya, ụmụ agbọghọ ga-anọ n’ebe ahụ, a ga-enwekwa ohere inwe mmekọahụ.” Ọtụtụ ndị na-eto eto taa ga-eji ọsọ nakwere ọkpụkpọ òkù dị otú ahụ. Ma gịnị bụ nzaghachi Timothy? “Agwara m ya ozugbo na agajeghị m ịbịa nakwa n’ihi akọ na uche onye Kraịst m, achọghị m isoro onye na-abụghị nwunye m nwee mmekọahụ.”

Mgbe ọ na-akọwa ihe mere o ji jụ, Timothy amaghị na otu nwa agbọghọ e were n’ọrụ n’ebe ahụ na-ege ntị. Omume ọma ya kpaliri mmasị nwa agbọghọ ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya, ịsị ya ee e chekwara Timothy ihu—ọtụtụ oge, dị ka anyị ga-ahụ ma e mesịa.

N’ezie, inweta ọnwụnwa abụghị nanị n’oge anyị ka ọ dịworo. Ihe dị ka afọ 3,000 gara aga, Eze Solomọn dere, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie araa gị ụra, ekwela. . . . Gbochie ụkwụ gị n’ịga n’okporo ụzọ ha.” (Ilu 1:10, 15) Jehova n’onwe ya nyere mba Israel iwu, sị: “Esola ọtụtụ mmadụ n’azụ baa n’ihe ọjọọ dị iche iche.” (Ọpụpụ 23:2) Ee, mgbe ụfọdụ anyị aghaghị ịsị ee e, na-ajụ ọnwụnwa nke ime ihe ọjọọ, n’agbanyeghị na o nwere ike ghara ịbụ ihe na-ewu ewu.

Ịsị Ee E Dị Mkpa Taa Karịsịa

Ịjụ ihe ọjọọ enwebeghị mgbe ọ dị mfe, n’ụbọchị ndị a kwa, ọ pụrụ isi ike karịsịa, n’ihi na anyị na-ebi n’ihe Bible na-akpọ “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a. Dị nnọọ ka amụma Bible si kwuo, ihe ka n’ọtụtụ mmadụ aghọwo ndị na-ahụ ihe ụtọ na ime ihe ike n’anya, n’enweghịzi ma ọnọdụ ime mmụọ ma omume ọma. (2 Timoti 3:1-5) Onyeisi nke mahadum ndị Jesuit kwuru, sị: “Anyị enwewo ụkpụrụ ọdịnala ndị a maworo aka ma hụ na o rughị eru ma ọ bụ na o kwesịghịzi oge anyị. Ugbu a o yighịzi ka e nwere ụkpụrụ nduzi omume ma ọlị.” N’echiche yiri nke ahụ, ọkàikpe nke otu ụlọikpe ka elu kwuru, sị: “Ọ dịghịzi ihe doro anya. Ihe nile dị inyoghi inyoghi. . . . Ọ bụ mmadụ ole na ole na-amata ọdịiche e nwere n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Ihe bụ́ mmehie ugbu a bụ mmadụ ịbụ onye e jidere, ọ bụghị imebi iwu.”

Pọl onyeozi dere banyere mmadụ ndị nwere omume dị otú ahụ, sị: “E mewo ka ha gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha, e meekwa ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị n’ihi amaghị ihe dị n’ime ha, n’ihi na a na-eme ka obi ha mee etili; mmadụ ndị, ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ, ha raara onwe ha nye n’aka agụụ ịkwa iko, ịrụpụta adịghị ọcha nile n’ime anyaukwu.” (Ndị Efesọs 4:18, 19) Ma nsogbu na-echere ha. Aịsaịa kwupụtara, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ; ndị na-etinye ọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, na ìhè n’ọnọdụ ọchịchịrị.” (Aịsaịa 5:20) Ọ bụghị nanị na ndị a na-aghọrọ mkpụrụ ha kụrụ ugbu a kamakwa ha ga-enweta “ahụhụ” ha kasịnụ n’oge na-adịghị anya—amamikpe sitere n’aka Jehova.—Ndị Galetia 6:7.

“Mgbe ndị na-emebi iwu na-ama akwụkwọ dị ka ihe ọkụkụ, mgbe ndị nile nke na-arụ ajọ ihe na-awakwa okooko osisi; ọ bụ ka e wee kpochapụ ha ruo mgbe nile ebighị ebi,” ka Abụ Ọma 92:7 na-ekwu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe ọkụkụ a bara ụba nke mmebi iwu agaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, na-eme ka ndụ na-esiri mmadụ nile ike. N’ezie, Jisọs kwuru na “ọgbọ” nke na-akwalite ajọ omume a ga-abụ kpọmkwem nke Chineke ga-ebibi ná “mkpagbu ukwu.” (Matiu 24:3, 21, 34) Ya mere ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị e chebere gabiga mkpagbu ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmara ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ dị ka ụkpụrụ Chineke si dị; n’ezie, ikike ime omume ọma dịkwa anyị mkpa iji jụ ihe ọjọọ n’ụdị ya nile. Ọ bụ ezie na nke a adịghị mfe, Jehova enyewo anyị ihe nlereanya ụfọdụ na-agba ume n’oge Bible nakwa n’oge a.

Ịmụta Ihe Site n’Aka Nwa Okoro nke Sịrị Ee E

Ịjụ ịkwa iko nile yiri ka o siri ike karịsịa, ọbụna nye ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst. Timothy, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na paragraf mmeghe, chetara ihe nlereanya nke Josef na-eto eto, nke e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ na Jenesis 39:1-12. Josef gosipụtara ikike nke ime omume ọma mgbe nwunye nke onye so n’ọchịchị Ijipt bụ́ Pọtịfa gwara ya ugboro ugboro ka o soro ya nwee mmekọahụ. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu na Josef “jụrụ, sị . . . m̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?”

Olee otú Josef si nweta ikike nke ime omume ọma iji sị nwunye Pọtịfa ee e kwa ụbọchị? Nke mbụ, o ji mmekọrịta ya na Jehova kpọrọ nnọọ ihe karịa ka o ji ihe ụtọ na-adịru nwa oge kpọrọ. Tụkwasị na nke a, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’okpuru usoro iwu sitere n’aka Chineke (Iwu Mosis adịbeghị mgbe ahụ), Josef ghọtara ụkpụrụ omume ọma n’ụzọ doro anya; ọ maara na ya isoro nwunye Pọtịfa nwere ịhụnanya nzuzu n’ahụ ya kwaa iko ga-abụ mmehie megide ọ bụghị nanị di ya kamakwa megide Chineke.—Jenesis 39:8, 9.

Ihe àmà na-egosi na Josef ghọtara mkpa ọ dị ịhapụ ọbụna ịkpali ọchịchọ nke pụrụ ịrụpụta mmetụta a na-apụghị ịchịkwa achịkwa. Onye Kraịst ga-abụ onye maara ihe ma ọ bụrụ na ọ gbasoo ihe nlereanya Josef. Ụlọ Nche (Bekee) nke July 1, 1957 kwuru, sị: “Ọ ghaghị ịmata adịghị ike nke anụ ahụ ya ma ghara iche na ya pụrụ ịgbaso ọchịchọ anụ ahụ ruo n’ebe Akwụkwọ Nsọ kpara ókè ma kwụsị n’ebe ahụ. Ọbụna ọ bụrụ na ọ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ime nke ahụ ruo oge ụfọdụ, ọ ga-emesị bụrụ onye a dọọrọ gabiga n’ókè ahụ baa ná mmehie. Nke a aghaghị ime, ebe ọ bụ na agụụ ihe ọjọọ ndị a na-azụlite azụlite na-esiwanye ike ma na-ejigidesikwu mmadụ aka ike. Mgbe ahụ ọ ga-esikwuru ya ike iwepụ uche ya n’ebe ha dị. Ihe nchebe kasị mma o nwere bụ ịjụ ha ná mmalite.”

Ịjụ ha ná mmalite na-aka adị mfe ka anyị na-azụlite ịhụnanya maka ezi ihe na ịkpọasị maka ihe ọjọọ. (Abụ Ọma 37:27) Ma ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-arụ ọrụ na ya, na-agbalịsi ike. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, site n’enyemaka Jehova, ịhụnanya anyị hụrụ ezi ihe na asị anyị kpọrọ ihe ọjọọ ga-esiwanye ike. N’ezie, ka ọ dịgodị, anyị aghaghị ịmụrụ anya dị ka Jisọs nyere ntụziaka ya, na-ekpe ekpere mgbe nile ịbụ ndị e chebere pụọ n’ọnwụnwa nakwa ịbụ ndị a napụtara n’aka ajọ onye ahụ.—Matiu 6:13; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17.

Ịjụ Nrụgide Ndị Ọgbọ

Mmetụta ọzọ na-eduga n’omume ọjọọ bụ nrụgide ndị ọgbọ. Otu onye ntorobịa kwetara, sị: “Ana m ebi ụdị ndụ abụọ—otu ụdị n’ụlọ akwụkwọ na ụdị ọzọ n’ụlọ. N’ụlọ akwụkwọ ana m eso ụmụaka ndị na-ekwu okwu rụrụ arụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ oge nile ha meghere ọnụ ha na-akpakọrịta. Ana m adịzi nnọọ ka ha. Gịnị ka m kwesịrị ime?” Ihe dị mkpa bụ inwe obi ike ịdị iche, otu ụzọ isi nweta ya bụ site n’ịgụ na ịtụgharị uche n’ihe ndekọ Bible ndị na-akọrọ anyị banyere ndị ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe dị ka Josef. Ndị nlereanya ọma ndị ọzọ bụ Daniel, Shedrak, Mishak, na Abednego—ụmụ okorobịa anọ nwere obi ike ịdị iche n’ebe ndị ọgbọ ha nọ.

Ka ha so ụmụ okoro ndị ọzọ nọ n’obí eze Babilọn na-enweta ọzụzụ, a chọrọ n’aka ụmụ Israel anọ a na-eto eto ka ha na-eri “òkè nke ụbọchị ọ bụla . . . site n’ihe oriri ọma nke eze.” N’ịbụ ndị na-achọghị imebi akụkụ Iwu Mosis metụtara ihe oriri, ha jụrụ nri a. Ime nke ahụ were ikike—karịsịa ebe ọ bụ na nri ndị ahụ bụ “ihe oriri ọma eze,” ma eleghị anya ọ na-adọ akpịrị. Lee ihe nlereanya ọma ụmụ okorobịa a setịpụụrụ ndị Kraịst taa bụ́ ndị a pụrụ ịnwa ọnwụnwa, ọbụna rụgide, ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè ma ọ bụ iji ọgwụ ọjọọ na ụtaba na-eme ihe!—Daniel 1:3-17.

Shedrak, Mishak, na Abednego gosipụtakwara eziokwu dị n’ihe Jisọs Kraịst mesịrị kwuo: “Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe.” (Luk 16:10) Obi abụọ adịghị ya na nguzo obi ike ha weere n’okwu ahụ dị nnọọ nta banyere nri na ihe ọma Jehova mere ka ọ rụpụta, wusiri ha ike maka ọnwụnwa bịara mgbe e mesịrị, bụ́ nke siri ike karị. (Daniel 1:18-20) Ule a bịara mgbe e nyere ha iwu ka ha kere òkè n’ikpere arụsị, ma ọ́ bụghị ya na a ga-egbu ha site n’ịgba ha ọkụ. N’obi ike, ụmụ okorobịa atọ a kpebisiri ike ife nanị Jehova, na-atụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ pụrụ ịrụpụta. Ọzọkwa Jehova gọziri ha maka okwukwe na obi ike ha—na nke ugbu a site n’ichebe ha n’ụzọ ọrụ ebube n’ire ọkụ ahụ mgbe a tụbara ha n’oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.—Daniel 3:1-30.

Okwu Chineke nwere ọtụtụ ihe nlereanya ọzọ nke ndị jụrụ ihe ọjọọ. Mosis jụrụ “ka a kpọọ ya nwa nwoke nke nwa nwanyị Fero,” ọ bụ ezie na nke a gaara enyewo ya ohere zuru ezu “inwe ihe ụtọ nke mmehie na nwa oge” n’Ijipt. (Ndị Hibru 11:24-26) Onye amụma bụ́ Samuel jụrụ iji ikike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’ịnara aka azụ. (1 Samuel 12:3, 4) Mgbe e nyere ndị ozi Jisọs Kraịst iwu ka ha kwụsị ime nkwusa ha ji obi ike sị ee e. (Ọrụ 5:27-29) Jisọs n’onwe ya ji obi ike jụ ihe ọjọọ nile—ruo nnọọ n’oge ikpeazụ nke ndụ ya mgbe ndị agha nyere ya “mmanya vine nke a gwara myrrh.” Ịnakwere ya nwere ike ibelatawo mkpebisi ike ya n’oge ahụ dị oké mkpa.—Mak 15:23; Matiu 4:1-10.

Ịsị Ee E—Okwu Metụtara Ọnwụ na Ndụ

Jisọs sịrị: “Sinụ n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.”—Matiu 7:13, 14.

Ụzọ ahụ dị obosara na-ewu ewu n’ihi na ọ dị mfe ime njem na ya. Ndị na-eme njem na ya na-emeju ọchịchọ onwe ha, na-eche echiche, na-emekwa ihe n’ụzọ anụ ahụ, ha na-achọkwa ikwekọ n’ụwa Setan, ọ bụghị ịdị iche na ya. Ọ na-adị ha ka iwu na ụkpụrụ Chineke ò kere ha agbụ n’ụzọ omume. (Ndị Efesọs 4:17-19) Ma, Jisọs kwuru hoo haa na ụzọ ahụ dị obosara na-eduba “n’ịla n’iyi.”

Ma n’ihi gịnị ka Jisọs ji sị na ọ bụ nanị ole na ole na-ahọrọ ụzọ ahụ dị mkpagide? N’ụzọ bụ́ isi ọ bụ n’ihi na nanị ọnụ ọgụgụ dị nta na-achọ ka iwu na ụkpụrụ Chineke na-achịkwa ndụ ha ma na-enyere ha aka ịjụ ọtụtụ mkpali na ohere ndị gbara ha gburugburu ime ihe ọjọọ. Ọzọkwa, nanị ole na ole dị njikere ịlụso ọchịchọ rụrụ arụ, nrụgide ndị ọgbọ, na ụjọ maka ịkwa emo nke pụrụ ịbịara ha n’ihi ụzọ ha họwooro, ọgụ.—1 Pita 3:16; 4:4.

Ndị a na-aghọta nke ọma mmetụta Pọl onyeozi nwere mgbe ọ kọwara ọgụ ọ lụrụ n’ịjụ mmehie. Dị ka ụwa nke taa, ógbè ndị Rom na ndị Gris nke oge Pọl nyere ohere sara mbara iji mikpuo onwe onye n’omume ọjọọ. Pọl kọwara na uche ya, bụ́ nke maara ihe bụ́ ezi ihe, na anụ ahụ ya, bụ́ nke na-achọ ime ihe ọjọọ, burịtara “agha” n’ụzọ na-aga n’ihu. (Ndị Rom 7:21-24) Ee, Pọl maara na ahụ ya bụ ezi ohu ma bụrụ ajọ nna ukwu, ya mere ọ mụtara ịsị ya ee e. “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m,” ka o dere. (1 Ndị Kọrint 9:27) Olee otú o si nwee ike nchịkwa dị otú ahụ? Ọ bụghị n’ike nke onwe ya, bụ́ nke ya na ọrụ ahụ na-ahaghị, kama ọ bụ site n’enyemaka nke mmụọ Chineke.—Ndị Rom 8:9-11.

N’ihi ya, ọ bụ ezie na Pọl ezughị okè, o guzosiri ike n’ezi ihe nye Jehova ruo ọgwụgwụ. N’oge na-adịghị anya tupu ọ nwụọ, ọ pụrụ ide, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ: nke fọdụrụ bụ na e debeworo m okpueze nke ezi omume ahụ.”—2 Timoti 4:7, 8.

Ka anyị na-alụso ezughị okè anyị agha, lee ihe nlereanya na-agba ume anyị nwere, ọ bụghị nanị n’ebe Pọl nọ, kamakwa n’ebe ndị bụụrụ ya ihe nlereanya nọ—Josef, Mosis, Daniel, Shedrak, Mishak, Abednego, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na ha bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, nke ọ bụla n’ime ndị ikom a nwere okwukwe jụrụ omume ọjọọ, ọ bụghị n’ihi ịkpọ ekwo nkụ ma ọ bụ isi ike, kama ọ bụ n’ihi ikike ime omume ọma nke mmụọ Jehova nyere ha. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ha bụ ndị ikom ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Agụụ nke ihe ọ bụla si n’ọnụ Jehova pụta gụrụ ha. (Deuterọnọmi 8:3) Okwu ya bụ ndụ nye ha. (Deuterọnọmi 32:47) Karịsịa, ha hụrụ Jehova n’anya ma na-atụ egwu ya, sitekwa n’enyemaka ya, ha ji ndidi zụlite ịkpọasị maka ihe ọjọọ.—Abụ Ọma 97:10; Ilu 1:7.

Ka anyị dị ka ha. N’ezie, iji nọgide na-ajụ ihe ọjọọ n’ụdị ya nile, mmụọ Jehova dị anyị mkpa dị nnọọ ka ọ dịrị ha. Jehova na-enye anyị mmụọ ya n’ụba ma ọ bụrụ na anyị ejiri ezi obi rịọ maka ya, na-amụ Okwu ya, na-agachikwa nzukọ ndị Kraịst anya.—Abụ Ọma 119:105; Luk 11:13; Ndị Hibru 10:24, 25.

Timothy, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, nwere obi ụtọ na o legharaghị mkpa ime mmụọ ya anya. Nwa agbọghọ ahụ e were n’ọrụ, bụ́ onye nụpeere nkwurịta okwu ya na onye ọrụ ibe ya nwere ma bụrụ onye omume ọma Timothy dọọrọ mmasị ya n’ụzọ na-ezighị ezi, mesịrị jiri nwayọọ kpọọ Timothy òkù ka ọ bịa n’ụlọ ya mgbe di ya na-anọghị n’ụlọ. Timothy jụrụ. N’ịbụ onye ike na-agwụghị, ọ kpọrọ ya òkù ahụ ọtụtụ ugboro, dị ka nwunye Pọtịfa. Timothy ji ịkwụsi ike ma n’ụzọ obiọma jụ n’oge nke ọ bụla. Ọbụna ọ gbaara nwanyị a ezigbo àmà site n’Okwu Chineke. N’ịbụ onye nwere ekele miri emi n’ebe Jehova nọ maka inye ya ikike ime omume ọma nke ịsị ee e, Timothy alụọla onye Kraịst ibe ya mara mma ugbu a, ha na-enwekwa obi ụtọ. N’ezie, Jehova ga-agọzi ma wusie ndị nile chọrọ ijigide nguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Kraịst ha site n’ịjụ omume ọjọọ.—Abụ Ọma 1:1-3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya