Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 1 p. 5-6
  • Ihe Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Tinyere Isiakwụkwọ na Amaokwu Ndị Dị́ na Baịbụl?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Irite Uru Site n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ihe I Nwere Ike Ịmụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Baịbụl Baara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 1 p. 5-6
Ebe otu nwaanyị ji ihe ndị e ji amụ Baịbụl na-amụ Baịbụl

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Ihe Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ

Ịgụ Baịbụl ọ̀ na-atọ gị ụtọ, ka ọ̀ na-agwụ gị ike? Nke ọ bụla ọ bụ nwere ike ịbụ n’ihi otú i si na-agụ ya. Ka anyị leba anya n’ihe ndị ga na-eme ka ịgụ Baịbụl na-agụ gị agụụ, ma na-atọkwu gị ụtọ.

Jiri Baịbụl a sụgharịrị nke ọma na nke e ji asụsụ a na-ede n’oge a na-agụ ya. Ọ bụrụ na ị na-agụ akwụkwọ, gụta ọtụtụ okwu na-esiri gị ike ịghọta, ma ọ bụkwanụ okwu ndị mgbe ochie ị na-amaghị ihe ha pụtara, akwụkwọ ahụ nwere ike ịgbụ gị. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka ị chọta Baịbụl e ji asụsụ dị mfe ga-eru gị n’obi sụgharịa. O kwesịkwara ịbụ nke a sụgharịrị nke ọma.a

Danloduo ya n’ekwentị na ihe ndị yiri ya, ma ọ bụ gị ana-agụ ya n’Ịntanet. N’oge anyị a, e nwere Baịbụl ndị e biri ebi, nweekwa ndị nke dị n’Ịntanet, kọmputa, ekwentị na ihe ndị yiri ya. E nwekwara ihe ndị dị na kọmputa ma ọ bụ n’ekwentị ụfọdụ nwere ike inyere gị aka ịchọta amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru banyere ihe ị na-agụ. Ha nwekwara ike inyere gị aka ịhụ otú e si sụgharịa amaokwu ị na-agụ ná nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ. E nwekwara Baịbụl ndị a gụrụ agụ i nwere ike igere egere. Ụfọdụ na-egere ya ma ha nọrọ n’ụgbọala na-eme njem, ma ha na-asa ákwà, ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị ọzọ. Leenụ ma ò nwere nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị a ga-akara gị mma isi gụọ Baịbụl.

Jiri ihe ndị e ji amụ Baịbụl na-agụ Baịbụl. E nwere ihe ndị e ji amụ Baịbụl nwere ike inyere gị aka ịghọtakwu Baịbụl ị na-agụ. Otu n’ime ha bụ map ndị na-egosi obodo ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl. Ha nwere ike inyere gị aka ịmata ebe ihe ndị ị na-agụ mere, meekwa ka ị ghọtakwuo ihe ị na-agụ. Isiokwu ndị gbara n’akwụkwọ anyị ụfọdụ dị ka ndị dị n’Ụlọ Nche a nwere ike inyere gị aka ịghota ọtụtụ ihe e kwuru na Baịbụl. E nwekwara ndị dị na jw.org/ig, n’ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi.”

Gbanwee otú i si na-agụ ya. Ọ bụrụ na isi n’isi gụrụ Baịbụl ruo ná ngwụcha na-esiri gị ike, i nwere ike ịmalite n’akwụkwọ Baịbụl ndị kacha atọ gị ụtọ. Ị chọọ ịmatakwu ụfọdụ ndị a na-anụkarị aha ha na Baịbụl, i nwere ike malite ịgụ gbasara ha. E nwere igbe dị n’isiokwu a nwere ike inyere gị aka ma ị chọọ ịgụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Isiokwu ya bụ “Gụọ Gbasara Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl Ka Ị Ghọtakwuo Baịbụl.” I nwekwara ike ịgụ Baịbụl n’isiokwu n’isiokwu ma ọ bụ otú ihe ndị a kọrọ na ya si mee. Gbalịa mee otu n’ime ihe ndị a ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ.

a Ọtụtụ ndị achọpụtala na a sụgharịrị Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke ọma, nakwa na ọ dị mfe ọgụgụ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa n’ihe karịrị asụsụ otu narị na iri atọ. I nwere ike ịdanlodu ya na jw.org/ig ma ọ bụkwanụ na JW Library app. Ị chọọkwa nke e biri ebi, Ndịàmà Jehova nwere ike iwetara gị ya n’ụlọ gị.

GỤỌ GBASARA NDỊ A KỌRỌ AKỤKỌ HA NA BAỊBỤL KA Ị GHỌTAKWUO BAỊBỤL

Ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị fere Chineke

Abigel

1 Samuel isi nke 25

Esta

Esta isi nke 2-5, 7-9

Hana

1 Samuel isi nke 1-2

Meri

(Nne Jizọs) Matiu isi nke 1-2; Luk isi nke 1-2; gụọkwa Jọn 2:1-12; Ọrụ Ndịozi 1:12-14; 2:1-4

Rehab

Jọshụa isi nke 2, 6; gụọkwa Ndị Hibru 11:30, 31; Jems 2:24-26

Ribeka

Jenesis isi nke 24-27

Sera

Jenesis isi nke 17-18, 20-21, 23; gụọkwa Ndị Hibru 11:11; 1 Pita 3:1-6

Ụfọdụ ụmụ nwoke ndị fere Chineke

Ebreham

Jenesis isi nke 11-24; see also 25:1-11

Devid

1 Samuel isi nke 16-30; 2 Samuel isi nke 1-24; 1 Ndị Eze isi nke 1-2

Jizọs

Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn

Mozis

Ọpụpụ isi nke 2-20, 24, 32-34; Ọnụ Ọgụgụ isi nke 11-17, 20, 21, 27, 31; Diuterọnọmi isi nke 34

Noa

Jenesis isi nke 5-9

Pọl

Ọrụ Ndịozi isi nke 7-9, 13-28

Pita

Matiu isi nke 4, 10, 14, 16-17, 26; Ọrụ Ndịozi isi nke 1-5, 8-12

IHE NDỊÀMÀ JEHOVA NWERE E JI AMỤ BAỊBỤL

  • JW.ORG​—Ọ bụ ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Ọtụtụ ihe e ji amụ Baịbụl dị na ya. E nwere ebe a na-akpọ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” E nwekwara ebe e dere otú ị ga-esi danloduo JW Library app

  • ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’—Broshọ a, nwere map na foto ebe dị iche iche a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl

  • Insight on the Scriptures (Bekee)—Akwụkwọ a kọwara ebe ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, kọwaakwa okwu ndị dị na Baịbụl na ndị e kwuru gbasara ha na Baịbụl. O nwere nke mbụ na nke abụọ

  • “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial” (Bekee)—Akwụkwọ a kwuru mgbe e dere akwụkwọ Baịbụl nke ọ bụla, ebe a nọ dee ya, na ihe mere e ji dee ya. Ọ kọwatụrụ ihe dị n’akwụkwọ Baịbụl nke ọ bụla

  • The Bible—God’s Word or Man’s? (Bekee)—Akwụkwọ a dị obere. A sara anya na mmiri dee ya. Ihe ndị e dere na ya na-egosi n’eziokwu na e si n’ike mmụọ nsọ dee Baịbụl

  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?—Akwụkwọ a dị peeji iri atọ na abụọ. Ọ kọwara isi ihe Baịbụl na-ekwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya