Ọrụ nke Na-enye Ume Ọhụrụ
1 Ozi Bible na-enye ndị nile na-anakwere ma na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ ha ume ọhụrụ. (Ọma 19:7, 8) Ọ na-enyere ha aka inwere onwe ha pụọ n’ozizi ụgha nakwa n’omume ndị na-emerụ ahụ́, na-emekwa ka ha nwee olileanya a pụrụ ịdabere na ya maka ọdịnihu. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị na-anabata ozi ọma ahụ na-erite uru na ya. Ndị na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible, bụ́ nke na-enye ume ọhụrụ, na-enwetakwa ume ọhụrụ n’onwe ha.—Ilu 11:25.
2 Ndị Ozi ahụ Mere Ka Ha Nwekwuo Ume Ọhụrụ: Jizọs kwuru na ndị na-anakwere yok nke ịbụ ndị na-eso ụzọ dị ka Ndị Kraịst, bụ́ nke na-agụnye ọrụ ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ, “ga-enwetakwara mkpụrụ obi [ha] ume ọhụrụ.” (Mat. 11:29) Ya onwe ya nwetara ume ọhụrụ site n’ịgbara ndị ọzọ àmà. Ọ dịịrị ya ka ihe oriri. (Jọn 4:34) Mgbe o zipụrụ ndị na-eso ụzọ 70 ka ha gaa mee nkwusa, ha ṅụrịrị ọṅụ ka ha hụrụ na Jehova kwadoro mgbalị ndị ha mere.—Luk 10:17.
3 N’otu aka ahụ, ọtụtụ Ndị Kraịst taa na-enweta ume ọhụrụ site n’ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Otu nwanna nwanyị kwuru, sị: “Ozi ahụ na-enye m ume ọhụrụ n’ihi na ọ na-eme ka ndụ m nwee ebe o chere ihu ma nwee nzube. Nsogbu na nchegbu ndị m na-enwe kwa ụbọchị adịghịzi abụ oké ihe nye m mgbe m na-ekere òkè n’ozi.” Onye ozi ọzọ na-anụ ọkụ n’obi kwuru, sị: “Ozi ahụ . . . na-eme ka Jehova dị adị n’ezie nye m kwa ụbọchị, ọ na-emekwa ka m nwee udo na ụdị obi ụtọ a na-apụghị inweta n’ụzọ ọ bụla ọzọ.” Lee ihe ùgwù ọ bụụrụ anyị ịbụ ndị “ha na Chineke na-arụkọ ọrụ”!—1 Kọr. 3:9.
4 Yok Kraịst Adịghị Egbu Mgbu: Ọ bụ ezie na a na-agba Ndị Kraịst ume ‘itinyesi mgbalị ike,’ Jizọs adịghị achọ ka anyị mee ihe karịrị ihe anyị ga-emeli. (Luk 13:24) N’eziokwu, o ji ịhụnanya akpọ anyị isoro ya banye n’okpuru yok ya. (Mat. 11:29) Ndị nọ n’ọnọdụ ndị tara akpụ pụrụ inwe obi ike na ozi ha ji obi ha dum na-eje na-atọ Chineke ezi ụtọ ọbụna ma a sị na o bughị ibu.—Mak 14:6-8; Kọl. 3:23.
5 Lee ihe na-enye ume ọhụrụ ọ bụ ijere Chineke nke na-enwe ekele maka ihe ọ bụla anyị mere maka aha ya, ozi! (Hib. 6:10) Ka anyị nọgide na-agbalịsi ike imere ya ihe kasị mma anyị pụrụ ime.