Igbe Ajụjụ
◼ Ò kwesịrị ekwesị ka onye nkwusa na-edenye adres e-mail ya n’akwụkwọ ọ na-enye ndị mmadụ n’ozi?
Ụfọdụ ndị nkwusa na-eji stamp ebi adres e-mail ha ma ọ bụ bie ya n’akwụkwọ ma mapawa ya na magazin ma ọ bụ na traktị ha na-enye ndị mmadụ n’ozi. Nke a ga-eme ka ndị naara onye nkwusa ahụ akwụkwọ nwee ike ịkpọtụrụ ya iji jụtakwuo ya ihe ụfọdụ. E bu ezi ihe n’obi na-eme mgbalị ndị dị otú ahụ a na-eme iji nyere ndị nwere mmasị aka. Ma, magazin na traktị anyị na-ebu adres ebe anyị na-edebe ihe ọmụma n’Intanet n’azụ ha. N’ihi ya, ọ kacha mma ma ọ bụrụ na anyị amapawaghị adres e-mail anyị n’akwụkwọ anyị na-enye ndị mmadụ.
Ọ bụ onye nkwusa ka ọ dị n’aka ikpebi ma ọ̀ ga-enye ndị bi n’ókèala ya adres ya o dere ná mpempe akwụkwọ, karịsịa mgbe ọ gara nletaghachi. Ọ bụ anyị kwesịrị ịgaghachi na nke ndị nwere mmasị kama ichere ka ha kpọtụrụ anyị ma ha nwee ajụjụ. Anyị ga-aka enwe ike igosi ezi mmasị n’ebe mmadụ nọ ma ọ bụrụ na anyị na ya ekwurịta okwu ihu na ihu.