Igbe Ajụjụ
◼ Ànyị kwesịrị iji Ịntanet na-ezi onye bi ná mba ọzọ ozi ọma ma ọ bụ na-amụrụ ya Baịbụl?
Ụfọdụ ụmụnna na-eji Ịntanet amụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’obodo ndị a machiri anyị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ n’obodo ndị ụmụnna anyị na-ehighị nne. Ndị mmadụ na-esi na ya amụta eziokwu dị na Baịbụl mgbe ụfọdụ. Ma, isi n’Ịntanet amụrụ mmadụ ihe nwere nsogbu ndị ha na ya so. (Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke Julaị 2007, peeji nke atọ.) Ọ bụ eziokwu na ihe e ji eme ya bụ ka e nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma, ma nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ime ka nwanna na onye dapụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị ọjọọ na-akpa. (1 Kọr. 1:19-25; Kọl. 2:8) Ihe ọzọ bụ na n’obodo ndị a machiri anyị ikwusa ozi ọma, anya ndị gọọmenti nwere ike ịdị n’ozi anyị na ndị obodo ahụ na-ezirịta n’Ịntanet. Ihe ọ bụla gbasara ozi ọma anyị ha hụrụ nwere ike itinye ụmụnna anyị ná nsogbu. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-achọ ndị nọ ná mba ọzọ anyị ga-eji Ịntanet na-ezi ozi ọma.
Ọ bụrụ na anyị ezie onye si mba ọzọ ozi ọma, ya emechaa laghachi obodo ya, anyị ekwesịghị ịchọwa otú anyị ga-esi na-amụrụ ya ihe, ọ gwụkwala ma alaka ụlọ ọrụ ọ̀ gwara anyị mụwara ya ihe. Kama ịmụwara ya ihe, anyị nwere ike igosi ya otú o nwere ike isi gaa na jw.org nweta ihe ọ chọrọ ma ọ bụkwanụ otú ọ ga-esi degara alaka ụlọ ọrụ anyị na-elekọta obodo ya akwụkwọ ozi. Anyị nwekwara ike ịgwa ya ka ọ gbalịa na-aga ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla dị ya nso. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere obodo ndị Ụlọ Nzukọ Alaeze na-adịghị. Ọ bụrụ na ọ ga-achọ ka Ndịàmà Jehova bịa mụwara ya ihe n’ụlọ ya, anyị kwesịrị idejupụta fọm Please Follow Up (S-43) ma nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ anyị ka o si na jw.org ziga ya n’obodo onye ahụ. Alaka ụlọ ọrụ na-elekọta obodo ahụ onye ahụ bi ga-aka ama otú ihe si dịrị ebe ahụ, ha makwa otú ka mma a ga-esi hazie ka a mụwara ya Baịbụl.—Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke Jun 2014, peeji nke asaa, na Ozi Alaeze Anyị nke Nọvemba 2011, peeji nke anọ.
Ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ ihe ugbu a akwaga mba ọzọ ma ọ bụkwanụ na e nwere onye nọ mba ọzọ anyị na ya na-amụ ihe n’Ịntanet, anyị kwesịrị ime ihe e kwuru n’isiokwu a. Anyị ka nwere ike ịnọ na-amụrụ ya ihe ruo mgbe e nwetara nwanna ga na-amụrụ ya ihe n’obodo ya. Anyị kwesịrị icheta na ọ bụrụ na o bi n’ebe a machiri anyị ikwusa ozi ọma, anyị kwesịrị ịkpachapụ anya ma anyị jiri akwụkwọ ozi, ekwentị, ma ọ bụ Ịntanet na-ezi ya ozi ọma.—Mat. 10:16.