ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 24
Ị Ga-emeli Ihe Ndị I Kpebiri Ime n’Ofufe Jehova
“Ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.”—GAL. 6:9.
ABỤ NKE 84 Na-enyekwu Aka n’Ozi Chineke
IHE ISIOKWU A NA-EKWUa
1. Olee ihe na-esiri ọtụtụ n’ime anyị ike?
È NWEELA ihe i kpebiri ime n’ofufe Jehova ma ya ana-esiri gị ike ime ya?b Ọ bụrụ na e nweela, ọ bụghị naanị gị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Philip chọrọ iwepụtakwu oge na-ekpe ekpere, na-emekwa ka ekpere ya kakwuo mma. Ma, o siiri ya ike iwepụta oge na-ekpe ekpere. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Erika kpebiri na ọ ga na-aga nzukọ ozi ubi n’oge. N’agbanyeghị ya, ọ gaghị nzukọ ozi ubi n’oge ọtụtụ ugboro. Otu nwanna aha ya bụ Tomáš gbalịrị ugboro ole na ole ịgụcha Baịbụl niile. Ọ sịrị: “N’oge ahụ, ịgụ Baịbụl anaghị amasị m. M gbalịrị ugboro atọ ka m gụchaa Baịbụl. Ma, ọ na-abụ, m gụruo Levitikọs, mụ akwụsị.”
2. Gịnị mere na i kwesịghị ịda mbà ma ọ bụrụ na e nwere ihe i kpebiri ime n’ofufe Jehova ma i mebeghị ya?
2 Ọ bụrụ na e nwere ihe i kpebiri ime ugbu a ma i mebeghị ya, biko adala mbà. Ọtụtụ mgbe, anyị ga-agba ezigbo mbọ, ya eweekwa anyị oge, tupu anyị emee ihe anyị kpebiri ime, ọ bụrụgodị obere ihe. Ebe ọ bụ na ị ka na-agbalịsi ike ime ihe ahụ i kpebiri, ọ pụtara na i ji adịm ná mma gị na Jehova kpọrọ ihe. Ị chọkwara inye ya ihe kacha mma i nwere. Jehova ji mbọ ị na-agba kpọrọ ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ naghị atụ anya ka i mee ihe ị na-agaghị emeli. (Ọma 103:14; Maị. 6:8) N’ihi ya, ihe i kpebiri ime kwesịrị ịbụ ihe ị ga-emeli. Ọ bụrụ ihe ị ga-emeli, olee ihe ị ga-eme ka i nwee ike ime ya? Ka anyị leba anya n’aro ụfọdụ ga-enyere gị aka.
KA Ọ NA-AGỤSI GỊ AGỤỤ IKE IME IHE I KPEBIRI IME
Kpee ekpere ka ọ na-agụsikwu gị agụụ ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 na nke 4)
3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ọ na-agụsi gị agụụ ike ime ihe i kpebiri ime?
3 Ihe ga-enyere mmadụ aka ime ihe ndị o kpebiri ime n’ofufe Jehova bụ ma ọ na-agụsi ya agụụ ike ime ha. Onye ọ na-agụsi agụụ ike ime ihe o kpebiri na-agba ezigbo mbọ ka o nwee ike ime ihe ahụ. Anyị nwere ike iji ya tụnyere ifufe nke na-enyere ụgbọ mmiri aka iru ebe ọ na-aga. Ọ bụrụ na ifufe ana-efe n’akwụsịghị akwụsị, onye na-akwọ ụgbọ mmiri nwere ike ịkwọrọ ụgbọ ya ruo ebe ọ na-aga. Ọ bụrụkwa na ifufe ahụ na-efesi ike, o nwedịrị ike iru ebe ahụ tupu mgbe a tụrụ anya ya. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe gbasara ihe ndị anyị kpebiri ime n’ofufe Jehova. Ọ bụrụ na ọ na-agụsi anyị agụụ ike, anyị nwere ike ime ya. Otu nwanna aha ya bụ David, bi n’El Salvadọ, sịrị: “Ọ bụrụ na ọ na-agụsi gị agụụ ike ime ihe i kpebiri, ị ga na-agbakwu mbọ. Ị ga-agbalịsi ike ka ị ghara ikwe ka ihe ọ bụla gbochie gị ime ya.” N’ihi ya, gịnị ka ị ga-eme ka ihe i kpebiri ime na-agụsikwu gị agụụ ike?
4. Olee ihe anyị nwere ike ikpe ekpere maka ya? (Ndị Filipaị 2:13) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
4 Kpee ekpere ka Jehova mee ka ọ gụsikwuo gị agụụ ike. Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya nyere gị aka ka ọ na-agụsi gị agụụ ike ime ihe i kpebiri ime n’ofufe ya. (Gụọ Ndị Filipaị 2:13.) Mgbe ụfọdụ, anyị na-ekpebi ihe anyị chọrọ ime n’ofufe Jehova n’ihi na anyị ma na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. Ime otú ahụ adịghị njọ. Ma, o nwere ike ịbụ na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya. Ọ bụ ihe mere otu nwanna nwaanyị bi na Yuganda aha ya bụ Norina. O kpebiri na ya ga-amalitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’agbanyeghị na ọ naghị agụsi ya agụụ ike ime ya n’ihi na ọ dị ya ka ya amaghị otú e si akụzi ihe. Gịnị nyeere ya aka? Ọ sịrị: “M malitere ịrịọ Jehova kwa ụbọchị ka o mee ka ọ na-agụsikwu m agụụ ike inweta otu onye m ga-amụwara Baịbụl. M mere ihe dabara n’ekpere ahụ m kpere, gbakwuo mbọ mụta ịna-akụzi ihe nke ọma. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, m chọpụtara na ọ na-agụsikwu m agụụ ike ịmalite ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl. N’afọ ahụ, m malitere ịmụrụ mmadụ abụọ Baịbụl.”
5. Gịnị ka anyị nwere ike ichebara echiche ga-eme ka ọ na-agụsi anyị agụụ ike ime ihe anyị kpebiri ime?
5 Chebara ihe Jehova meere gị echiche. (Ọma 143:5) Pọl onyeozi chebaara amara Jehova meere ya echiche. O mekwara ka ọ rụsiere Jehova ọrụ ike. (1 Kọr. 15:9, 10; 1 Tim. 1:12-14) Ọ bụrụkwa na ị na-echebara ihe ndị Jehova meere gị echiche, ọ ga-eme ka ị chọọ ime ihe i kpebiri ime n’ofufe ya. (Ọma 116:12) Legodị ihe nyeere otu nwanna nwaanyị bi na Họnduras aka ime ihe o kpebiri, nke bụ́ ịghọ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ sịrị: “M chere echiche nke ọma gbasara otú Jehova si hụ m n’anya. O nyeere m aka ịchọta ndị ya. Ọ na-elekọta m, na-echebekwa m. Ichebara ihe a echiche mere ka m hụkwuo ya n’anya, meekwa ka m chọsie ike ime ihe m kpebiri ime n’ofufe ya.”
6. Olee ihe ọzọ nwere ike ime ka ọ na-agụsikwu anyị agụụ ike ime ihe anyị kpebiri ime?
6 Lekwasị anya n’uru ọ ga-abara gị. Legodị ihe nyeere Nwanna Nwaanyị Erika anyị kwuburu okwu ya aka ịgawa nzukọ ozi ubi n’oge otú o kpebiri. Ọ sịrị: “M chọpụtara na e nwere nnukwu ihe na-akwa m maka na anaghị m aga nzukọ ozi ubi n’oge. Ma, ọ bụrụ na mụ agaa n’oge, m ga-enwe ike ikele ụmụnna, mụ na ha anọrịakwa. M ga-egerekwa aro ndị ga-eme ka ozi ọma na-atọ m ụtọ, meekwa ka m na-eme nke ọma n’ozi ọma.” Nwanna Nwaanyị Erika lekwasịrị anya n’uru ịbịa n’oge ga-abara ya. O mere ka o mee ihe ahụ o kpebiri. Olee uru ndị ị ga-elekwasị anya na ha? Ọ bụrụ na i kpebiri ịna-emekwu nke ọma n’ịgụ Baịbụl na ikpe ekpere, chee otú ọ ga-esi mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. (Ọma 145:18, 19) Ọ bụrụkwanụ na e nwere otu àgwà Ndị Kraịst ị chọrọ ịna-akpa, lekwasị anya n’otú ọ ga-esi eme ka gị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma. (Kọl. 3:14) Gbalịa depụta ihe niile mere i ji chọọ ime ihe i kpebiri ime. Ị nọtụ, gị eleruo ha anya. Nwanna Tomáš anyị kwuburu okwu ya sịrị: “E nwee ọtụtụ ihe mere m ga-eji mee ihe m kpebiri ime, ọ ga-eme ka m na-agbasi mbọ ike ime ya.”
7. Gịnị nyeere Nwanna Julio na nwunye ya aka ime ihe ha kpebiri ime?
7 Ka gị na ndị ga-eme ka ọ na-agụsi gị agụụ ike ime ihe i kpebiri ime na-anọkọ. (Ilu 13:20) Legodị ihe nyeere otu nwanna aha ya bụ Julio na nwunye ya aka ịgbakwu mbọ n’ozi ọma otú ha kpebiri. Nwanna Julio sịrị: “Ndị anyị metara enyi bụ ndị na-agba anyị ume ka anyị gbalịa na-eme ihe anyị kpebiri. Anyị na ha na-ekwurịtakwa ihe ahụ anyị kpebiri ime. Ọtụtụ n’ime ha emeela ụdị ihe ahụ. N’ihi ya, ha gwara anyị ihe ndị nyeere anyị aka. Ndị enyi anyị na-ajụkwa anyị otú anyị si eme n’ihe ndị ahụ anyị kpebiri, na-agbakwa anyị ume mgbe ọ dị anyị mkpa.”
Ọ BỤRỤ NA Ọ NAGHỊ AGỤ ANYỊ AGỤỤ IME IHE ANYỊ KPEBIRI IME
Na-agbasi mbọ ike ka i mee ihe i kpebiri ime (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)
8. Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na naanị mgbe anyị na-eme ihe anyị kpebiri ime bụ mgbe ọ na-agụ anyị agụụ ime ya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
8 Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere mgbe ụfọdụ ọ na-anaghị agụ anyị agụụ ime ihe anyị kpebiri ime. Ọ̀ pụtara na anyị agaghị emeli ya? Mba. Iji maa atụ, ifufe nwere ike inyere ụgbọ mmiri aka iru ebe ọ na-aga. Ma, ọ bụghị ụbọchị niile ka ifufe na-efesi ike. E nwekwara ụbọchị ndị ifufe na-anaghị efe chaa chaa. Ọ̀ pụtara na onye na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ agaghịzi aga ebe ọ chọrọ ịga? Mba. Ụfọdụ ụgbọ mmiri na-enwe njin. Ụfọdụ na-enwekwa ụmara. Onye na-akwọ ụgbọ mmiri nwere ike iji nke ọ bụla n’ime ha kwọrọ ụgbọ ya gaa ebe ọ chọrọ ịga. Ọ bụrụ na ọ na-agụsi anyị agụụ ike ime ihe anyị kpebiri ime, e nwere ike iji ya tụnyere ifufe na-ebu ụgbọ mmiri. Mana, ọ bụghị ụbọchị niile ka ọ na-agụsi anyị agụụ ike. N’ụbọchị ụfọdụ, o nwere ike ọ gaghị na-agụ anyị agụụ ime ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ bụ naanị n’ụbọchị ọ na-agụ anyị agụụ ime ihe anyị kpebiri ime ka anyị ga-eme ya, e nwere ike anyị agaghị eme ihe ahụ anyị kpebiri ime. Ma, otú ahụ onye na-akwọ ụgbọ mmiri nwere ike ịchọta otú ọzọ ọ ga-esi ruo ebe ọ na-aga ka anyị nwekwara ike ịgbasi mbọ ike ime ihe anyị kpebiri ime ọ bụrụgodị na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya. Ọ bụ eziokwu na ọ gaghị adịrị anyị mfe, ma obi ga-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe ahụ anyị kpebiri ime. Tupu anyị eleba anya n’ihe anyị nwere ike ime ma ụdị ihe ahụ mee, ka anyị burugodị ụzọ zaa otu ajụjụ.
9. Ò nwere ihe o mere ma anyị gbasie mbọ ike ime ihe anyị kpebiri ime ọ bụrụgodị na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya? Kọwaa.
9 Jehova chọrọ ka anyị jiri obi ụtọ na-efe ya nakwa ka ofufe anyị na-efe ya si anyị n’obi. (Ọma 100:2; 2 Kọr. 9:7) N’ihi ya, ànyị kwesịrị ịgba mbọ na-eme ihe anyị kpebiri ime n’ofufe Jehova ọ bụrụgodị na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya? Legodị ihe Pọl onyeozi mere. Ọ sịrị: “M na-ejidesi onwe m ike, na-eme ka ahụ́ m bụrụ ohu m.” (1 Kọr. 9:25-27) Pọl gbasiri mbọ ike mee ihe Jehova chọrọ ka o mee ma mgbe ọ na-anaghị agụ ya agụụ. Ihe ahụ Pọl mere ọ̀ masịrị Jehova? Eheenụ. Jehova gọzikwara ya maka mbọ ọ gbara.—2 Tim. 4:7, 8.
10. Olee uru ọ na-abara anyị ma anyị gbasie mbọ ike na-eme ihe anyị kpebiri ime ọ bụrụgodị na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya?
10 Obi na-adịkwa Jehova ụtọ ịhụ ka anyị na-agbasi mbọ ike ime ihe anyị kpebiri ime ma mgbe ọ na-anaghị agụ anyị agụụ ime ya. Obi na-adị ya ụtọ maka ihe anyị na-eme ọ bụrụgodị na ihe ahụ anaghị atọ anyị ụtọ. Ọ ma na ihe mere anyị ji eme ya bụ na anyị hụrụ ya n’anya. Jehova ga-agọzi anyị maka mbọ anyị gbara otú ahụ ọ gọziri Pọl. (Ọma 126:5) Ọ bụrụkwa na anyị ahụ otú Jehova si agọzi anyị, o nwere ike ime ka ọ na-agụ anyị agụụ ime ihe ahụ. Otu nwanna nwaanyị si Poland aha ya bụ Lucyna sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ naghị agụ m agụụ ịga ozi ọma, karịchaa mgbe ike gwụrụ m. Ma, m gachaa ozi ọma lọta, ụdị obi ụtọ m na-enwe na-adị m ka è nyere m ihe pụrụ iche.” N’ihi ya, ka anyị hụ ihe anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ihe anyị kpebiri ime.
11. Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị?
11 Kpee ekpere ka Jehova mee ka ị na-ejide onwe gị. Onye na-ejide onwe ya anaghị eme ihe ọjọọ na-agụ ya agụụ. Ma, mmadụ kwesịkwara ịna-ejide onwe ya ka o nwee ike ime ihe ọma o kwesịrị ime, karịchaa ma ọ bụrụ na ime ihe ahụ siiri ya ike ma ọ bụ na ọ naghị agụ ya agụụ ime ya. Cheta na mmadụ ijide onwe ya so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. N’ihi ya, rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya ka o nyere gị aka ịna-akpa àgwà a dị ezigbo mkpa. (Luk 11:13; Gal. 5:22, 23) Nwanna David anyị kwuburu okwu ya kọwara otú ekpere si nyere ya aka. Ọ chọrọ ịna-amụchikwu ihe anya. Ọ sịrị: “M rịọrọ Jehova ka o nyere m aka ka m na-ejide onwe m. Jehova nyeere m aka, mụ ewepụtakwuo oge m ji na-amụ ihe n’onwe m, na-amụchikwa ya anya.”
12. Olee otú ihe e kwuru n’Ekliziastis 11:4 nwere ike isi nyere anyị aka ime ihe anyị kpebiri ime n’ofufe Jehova?
12 Echela ka ihe niile dị otú ha kwesịrị ịdị. N’ụwa ochie a, e nwere ike o nweghị mgbe ihe niile ga-adị otú ha kwesịrị ịdị. Ọ bụrụ na anyị echewe ka ihe dịrị otú o kwesịrị, e nwere ike anyị agaghị eme ihe anyị kpebiri ime. (Gụọ Ekliziastis 11:4.) Otu nwanna aha ya bụ Dayniel sịrị: “O nweghị mgbe ihe niile na-adị otú ha kwesịrị ịdị. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ichewe. Ihe anyị kwesịrị ime bụ ịmalite mewe ihe anyị chọrọ ime.” Otu nwanna bi na Yuganda aha ya bụ Paul kwuru ihe ọzọ mere na anyị ekwesịghị igbuwe oge tupu anyị ebido ime ihe anyị kpebiri ime. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na anyị emewe ihe ahụ n’agbanyeghị ihe ndị na-eme ka o siere anyị ike, Jehova ga-agọzi anyị.”—Mal. 3:10.
13. Gịnị mere o ji adị mma ka anyị malite obere obere mewe ihe anyị kpebiri ime?
13 Malite ime ya obere obere. Ihe ga-eme ka ihe anyị kpebiri ime ghara ịna-agụ anyị agụụ nwere ike ịbụ na o yiri ihe siiri anyị ike omume. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, gbalịa kebie ya obere obere. Ọ bụrụ na e nwere àgwà ị chọrọ ịmụta ịna-akpa, gbalịa bido ịkpa ya obere obere. Ọ bụrụ na ihe i kpebiri ime bụ ịgụcha Baịbụl, hazie ka ị malite iji obere oge na-agụ ya. O siiri Nwanna Tomáš anyị kwuburu okwu ya ike ịgụcha Baịbụl n’otu afọ otú o kpebiri. Ọ sịrị: “Achọpụtara m na ebe m kpebiri ịna-agụ otu oge buru ibu. N’ihi ya, m kpebiri ịgbalị ọzọ. Ma, m kpebiziri ịna-agụ paragraf ole na ole kwa ụbọchị ma na-echebara ha echiche. O mere ka ịgụ ya tọwa m ụtọ.” Ka ọ na-atọkwu Nwanna Tomáš ụtọ, ọ malitere iji oge bukwuru ibu na-agụ ya. O mechakwara gụchaa Baịbụl otú o kpebiri.c
IKE AGWỤLA GỊ MA E NWEE IHE NDỊ MERE KA Ọ NA-ESIRI GỊ IKE
14. Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ime ihe anyị kpebiri ime?
14 Ọ dị mwute na n’agbanyeghị otú o si na-agụsi anyị agụụ ike ma ọ bụ otú anyị si na-ejide onwe anyị ka anyị nwee ike ime ihe anyị kpebiri ime, ihe ụfọdụ nwere ike ime ka o siere anyị ike. Dị ka ihe atụ, ‘ihe anyị na-atụghị anya ya’ nwere ike ime ka anyị ghara inwe oge anyị ga-eji na-eme ya. (Ekli. 9:11) Nsogbu nwere ike ime ka anyị daa mbà, ike agaghịzi adị anyị ime ya. (Ilu 24:10) N’ihi ezughị okè, anyị nwere ike imejọ ihe, ya emee ka o siere anyị ike ime ihe anyị kpebiri ime. (Rom 7:23) Ike nwekwara ike ịgwụ anyị. (Mat. 26:43) Gịnị nwere ike inyere anyị aka ma e nwee ihe mere ka anyị ghara ime ihe anyị kpebiri ime?
15. Ọ bụrụ na e nwee ihe mere ka o siere anyị ike ime ihe anyị kpebiri ime, ọ̀ pụtara na anyị agaghịzi emeli ya? Kọwaa. (Abụ Ọma 145:14)
15 Cheta na e nwee ihe mere ka o siere gị ike ime ihe i kpebiri ime, ọ pụtaghị na ị gaghị emeli ya. Baịbụl kwuru na nsogbu nwere ike ịbịara anyị ọtụtụ ugboro. Ma, o mekwara ka o doo anya na anyị ka ga-emeli ihe anyị kpebiri ime, karịchaa ma Jehova nyere anyị aka. (Gụọ Abụ Ọma 145:14.) Nwanna Philip anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Anaghị m elekwasị anya n’oge ndị m na-emelighị ihe m kpebiri ime, kama m na-elekwasị anya n’oge ndị m malitere mewekwa ya.” Nwanna David anyị kwuburu okwu ya sịrị: “E nwee ihe ndị mere ka o sieere m ike ime ihe m kpebiri ime, m na-ele ha anya ka ohere m ga-eji gosi otú m hụruru Jehova n’anya, ọ bụghị ka ihe ga-egbochi m ime ihe ahụ.” N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ ka anyị mee ihe anyị kpebiri ime, ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike, anyị na-egosi Jehova na anyị chọrọ ime ihe dị ya mma. Obi ga-adịkwa ya ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-agbalịsi ike ime ihe anyị kpebiri ime.
16. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta ma o siere anyị ike ime ihe anyị kpebiri ime?
16 Mụta ihe n’ihe ndị mere ka o siere gị ike. Chee gbasara ihe kpatara ya. Jụọ onwe gị, sị: ‘È nwere ihe m ga-eme ka ihe a ghara ime n’oge ọzọ?’ (Ilu 27:12) Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na o siiri anyị ike ime ihe anyị kpebiri ime, o nwere ike igosi na anyị agaghị emeli ihe ahụ. I chee na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị, lebagharịa ihe ahụ i kpebiri ime anya ka ị mata ma ọ̀ bụ ihe gịnwa ka ga-emeli ya.d Jehova agaghị ewere ya na i meela ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na i meghị ihe i kpebiri ime, bụ́kwanụ ihe ị na-agaghị emeli.—2 Kọr. 8:12.
17. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eche gbasara ihe ndị anyị merela?
17 Na-eche gbasara ihe ndị i merela. Baịbụl kwuru, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu.” (Hib. 6:10) N’ihi ya, gịnwa ekwesịghịkwa ichefu ihe ndị i merela. Na-eche banyere ha. O nwere ike ịbụ na i mere ka gị na Jehova bido ịdị ná mma, na ị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya, ma ọ bụkwanụ na i meela baptizim. Ị ka nwere ike ịna-agba mbọ na-eme ihe ndị i kpebiri ime ugbu a otú ahụ ị gbara mbọ mee n’oge gara aga.—Fil. 3:16.
Mata otú Jehova si enyere gị aka ka ị na-agbalị ime ihe ndị i kpebiri ime (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)
18. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-echeta ka anyị na-agba mbọ ime ihe anyị kpebiri ime? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
18 N’enyemaka Jehova, ị ga-emeli ihe i kpebiri ime. Obi ga-adị gị ụtọ otú ahụ ọ na-adị onye na-akwọ ụgbọ mmiri ma o ruo ebe ọ na-aga. Ma, cheta na ọtụtụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri na-eji obi ụtọ na-aga ebe ha na-aga. Ka ị na-agbasikwa mbọ ike ime ihe ndị i kpebiri ime n’ofufe Jehova, i kwesịkwara ịgbalị na-ahụ otú Jehova si enyere gị aka. I mee otú ahụ, obi ga-adị gị ụtọ ka ị na-agbalị ime ihe ndị i kpebiri ime n’ofufe ya. (2 Kọr. 4:7) Ọ bụrụ na ike agwụghị gị, Jehova ga-agọzikwu gị n’ọdịnihu.—Gal. 6:9.
ABỤ NKE 126 Mụrụ Anya, Ka Okwukwe Gị Sie Ike, Dị Ike
a Nzukọ Jehova na-agwa anyị mgbe niile ka anyị kpebie otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova. Ma ọ bụrụkwanụ na e nweela ihe anyị kpebiri ime, ma ya ana-esiri anyị ike ime ya? N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime iji mee ihe ndị anyị kpebiri ime.
b NKỌWAKWU: Ihe i kpebiri ime n’ofufe Jehova nwere ike ịbụ ihe ọ bụla ị na-agbasi mbọ ike ime ma ọ bụ imekwu nke ọma na ya ka i nwee ike jekwuoro Jehova ozi ma mee ya obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ikpebi ịmụta àgwà Onye Kraịst kwesịrị ịna-akpa, ma ọ bụkwanụ imekwu nke ọma n’ihe ị na-eme n’ofufe Jehova, dị ka ịgụ Baịbụl, ịmụ ihe n’onwe gị, ma ọ bụ izi ozi ọma.
c Gụọ akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, peeji nke 10 ruo na nke 11, paragraf nke 4.
d Ị chọọ ịgụkwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ị Ga-eruli ma Nwee Ọṅụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche July 15, 2008.