Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 11/15 p. 15-20
  • Ụgwọ Ọrụ Job—Isi Iyi nke Olileanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụgwọ Ọrụ Job—Isi Iyi nke Olileanya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Job Ejiri Anyaike Gbaa Àmà
  • Elaịhu Ekwuo Okwu
  • Jehova Azaa Job
  • Òtòbò na Leviathan
  • Ụgwọ Ọrụ Ndị E Kwere Nkwa Ha Na-enye Anyị Olileanya
  • Job Toro Aha Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Nwoke Kwesịrị Nṅomi nke Nakweere Mgbazi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Job
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ihe Mmụta n’Ụzọ E Si Edozi Nsogbu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 11/15 p. 15-20

Ụgwọ Ọrụ Job​—⁠Isi Iyi nke Olileanya

“Jehova gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.” ​—⁠JOB 42:12.

1. Gịnị ka Jehova na-emere ndị ya, ọbụna mgbe ule dị iche iche mere ka ike gwụ ha nke ukwuu?

JEHOVA “na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọ na-akpalikwa ndị ya raara onwe ha nye iji obi ike na-agba àmà, a sịgodi na ule dị iche iche emee ka ha ghọọ ndị ike gwụrụ dị ka ndị nwụrụ anwụ. (Job 26:5; Mkpughe 11:​3, 7, 11) Nke ahụ bụ eziokwu banyere Job na-ata ahụhụ. Ọ bụ ezie na ndị nkasi obi ụgha atọ kwuru ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere ya, ụjọ mmadụ emeghị ya ka o kpuchie ọnụ. Kama nke ahụ, o ji anyaike gbaa àmà.

2. Ọ bụ ezie na ha enwetawo mkpagbu na ihe isi ike, olee otú Ndịàmà Jehova siworo merie ule ha dị iche iche?

2 Ọtụtụ Ndịàmà Jehova nke oge a enwetawo oké mkpagbu na ihe isi ike dị otú ahụ nke na ha anọwo n’ọnụ ọnwụ. (2 Ndị Kọrint 11:23) Otú ọ dị, dị ka Job, ha egosiwo ịhụnanya maka Chineke, meekwa ezi omume. (Ezikiel 14:​14, 20) Ha alanarịwokwa ule ha dị iche iche na-ekpebisi ike ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ, bụrụ ndị e nyere ume iji anyaike gbaa àmà, jupụtakwa n’ezi olileanya.

Job Ejiri Anyaike Gbaa Àmà

3. Ụdị àmà dị aṅaa ka Job gbara n’okwu ikpeazụ ya?

3 N’okwu ikpeazụ ya, Job gbara ọbụna àmà ka ukwuu karịa ka o mere na mbụ. O mere ka ọnụ kpuchie ndị nkasi obi ụgha ya kpam kpam. N’iji ịkwa emo na-agba agba, ọ sịrị: “Ì siwo aṅaa nyere ya aka, bụ́ onye na-enweghị ike?” (Job 26:2) Job buliri Jehova elu, onye ike ya na-ekokwasị ụwa anyị n’ihe na-abụghị ihe n’ime mbara ikuku ma na-ekokwasị urukpuru mmiri juru n’ime ya n’elu ụwa. (Job 26:​7-⁠9) Ma, Job kwuru na ihe ijuanya ndị dị otú ahụ ‘bụ nanị nsọtụ ụzọ Jehova nile.’​—⁠Job 26:14.

4. Gịnị ka Job kwuru banyere iguzosi ike n’ezi ihe, n’ihi gịnịkwa ka ọ pụrụ iji kwupụta echiche ya otú ahụ?

4 Na-ejide n’aka na aka ya dị ọcha, Job kwupụtara: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m.” (Job 27:5) N’ụzọ dị iche n’ebubo ụgha nile e boro ya, ọ dịghị ihe ọ bụla o mere nke mere ihe nile dakwasịrị ya ga-eji dakwasị ya. Job maara na Jehova adịghị aza ekpere nke ndị si n’ezi ofufe dapụ ma ọ ga-akwụghachi ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ụgwọ ọrụ. Nke a pụrụ ichetara anyị nnọọ na n’isi nso oké ifufe nke Amagedọn ga-ebupụ ndị ajọ omume n’ọnọdụ ha nke ike, ha agaghịkwa alanarị aka Chineke nke na-agaghị eme ebere. Ruo mgbe ahụ, ndị Jehova ga-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe ha.​—⁠Job 27:​11-⁠23.

5. Olee otú Job si kọwaa ezi amamihe?

5 Cheedi echiche banyere mmadụ atọ ahụ maara ihe n’ụzọ nke ụwa ka ha nọ na-ege ntị ka Job na-egosi na mmadụ ejiwo nkà ya mee ihe iji chọọ ọlaedo, ọlaọcha, na akụ̀ ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa n’ime ala na n’ime osimiri. “Ee,” ka ọ sịrị, “nnweta amamihe karịrị ruby.” (Job 28:18) Ndị nkasi obi ụgha nke Job apụghị ịzụta ezi amamihe. Isi iyi ya bụ Onye Okike nke ifufe, mmiri ozuzo, àmụ̀mà, na égbè eluigwe. N’ezie, ‘egwu nsọpụrụ Jehova, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, isi n’ihe ọjọọ pụta bụ nghọta.’​—⁠Job 28:28.

6. N’ihi gịnị ka Job ji kwuo okwu banyere ndụ ya tupu mgbe ahụ?

6 N’agbanyeghị ahụhụ ya nile, Job akwụsịghị ijere Jehova ozi. Kama ichigharị si n’ebe Onye Kasị Ihe Nile Elu nọ pụọ, “izu nzuzo Chineke” nke o nweburu gụsiri nwoke a na-eguzosi ike n’ezi ihe agụụ ike. (Job 29:4) Job adịghị etu ọnụ mgbe ọ kọrọ otú o si ‘mee ka onye e wedara n’ala wepụga onwe ya, yikwasị onwe ya ezi omume, bụkwaara ndị ogbenye nna.’ (Job 29:​12-⁠16) Kama nke ahụ, ọ na-ehota ihe ndị mere eme ná ndụ ya dị ka ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. Ì wulitewo ihe ndekọ ọma dị otú ahụ? N’ezie, Job na-ekpughekwa ịbụ ụgha nke ebubo ndị aghụghọ atọ ahụ na-eme nsọ nsọ.

7. Ụdị onye dị aṅaa ka Job buwororịị?

7 Ụmụ okorobịa ndị ‘ọ na-agaghị edo ndị bụ́ nna ha n’etiti nkịta nke ìgwè ewu na atụrụ nke ya’ chịrị Job ọchị. A sọrọ ya oyi ma gbụkwasị ya ọnụ mmiri. Ọ bụ ezie na ọ nọ n’oké mmekpa ahụ, e gosighị Job nchebara echiche. (Job 30:​1, 10, 30) Otú ọ dị, n’ihi na ọ raara onwe ya kpam kpam nye Jehova, o nwere akọ na uche dị ọcha, nweekwa ike ikwu, sị: “Ka Ọ tụọ m n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ezi omume, ka Chineke marakwa izu okè m.” (Job 31:6) Job abụghị onye na-akwa iko ma ọ bụ onye na-ezupụta ihe ọjọọ, ọ dịghịkwa mgbe ọ hapụrụ inyere ndị nọ ná mkpa aka. Ọ bụ ezie na ọ bụrịị aka ji akụ̀, ọ dịghị mgbe ọ tụkwasịrị obi n’ihe onwunwe. Ọzọkwa, Job etinyeghị aka n’ikpere arụsị site n’inye ihe ndị na-adịghị ndụ dị ka ọnwa ofufe. (Job 31:​26-⁠28) N’ịtụkwasị obi na Chineke, o setịpụrụ ihe nlereanya dị mma dị ka onye na-eguzosi ike n’ezi ihe. N’agbanyeghị ahụhụ ya nile na ọnụnọ nke ndị nkasi obi ụgha, Job mere ngọpụ nke e ji nkà mee ma gbaa àmà magburu onwe ya. Ebe okwu ya bịaworo ná njedebe, o legaara Chineke anya dị ka Onye Ikpe na Onye Nkwụghachi Ụgwọ ya.​—⁠Job 31:​35-⁠40.

Elaịhu Ekwuo Okwu

8. Ònye bụ Elaịhu, oleekwa otú o si gosipụta ma nkwanye ùgwù ma obi ike?

8 Nwa okorobịa ahụ bụ́ Elaịhu nọ n’ebe dị nso, bụ́ onye sitere n’usoro ọmụmụ nke nwa Nehoa bụ́ Buz si otú a bụrụ onye ikwu dịpụrụ adịpụ nke enyi Jehova bụ́ Abraham. (Aịsaịa 41:8) Elaịhu gosiri nkwanye ùgwù maka ndị ka ya mee okenye site n’ịṅa ntị n’akụkụ abụọ nke arụmụka ahụ. Ma, o ji obi ike kwuo okwu banyere ihe dị iche iche mgbe ha hiere ụzọ. Dị ka ihe atụ, iwe ya dị ọkụ megide Job n’ọgụgụ “ọ gụrụ onwe ya n’onye ezi omume karị Chineke.” Iwe Elaịhu bụ karịsịa megide ndị nkasi obi ụgha ahụ. Okwu ha yiri ka ha na-ebuli Chineke elu ma n’ezie na-akọcha ya site n’ịkwado akụkụ nke Setan n’ihe iseokwu ahụ. ‘Na-ejupụta n’okwu,’ bụrụkwa onye mmụọ nsọ kwaliri, Elaịhu bụ onye àmà na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu nke Jehova.​—⁠Job 32:​2, 18, 21.

9. Olee otú Elaịhu si kwutatụ okwu banyere mweghachi nye Job?

9 Job echegbuwo onwe ya banyere mwepụ nke onwe ya n’ụta karịa nke Chineke. N’ezie, o sesawo Chineke okwu. Otú ọ dị, ka mkpụrụ obi Job na-abịaru ọnwụ nso, e nwere ihe àmà nke mweghachi. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, a kpaliri Elaịhu ikwu na Jehova gosiri Job amara site n’ozi nke a: “Dọpụta ya n’ịrịda n’olulu, achọtawo m ihe mgbapụta. Anụ ahụ ya ga-adị ọhụrụ karị nke nwata; ọ na-alaghachikwuru ụbọchị okorobịa ya.”​—⁠Job 33:​24, 25.

10. Ruo n’ókè ha aṅaa ka a ga-anwaru Job, ma gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka na-eburu ihe dị ná 1 Ndị Kọrint 10:13 n’uche?

10 Elaịhu gbaziri Job olu n’ihi ikwu na ọ dịghị uru ọ bụla dị n’inwe ọṅụ n’ebe Chineke nọ site n’ijigide iguzosi ike n’ezi ihe. Elaịhu sịrị: “Ya bụrụkwa Chineke ihe arụ, bụ́ imebi iwu; ya bụrụ Onye pụrụ ime ihe nile ihe arụ, bụ́ ime ajọ omume. N’ihi na ọrụ mmadụ ka Ọ ga-akwụghachi ya.” Job mere ihe n’ọkụ n’ọkụ n’imesi ezi omume nke ya ike, ma o mere otú ahụ n’enweghị ihe ọmụma na nghọta zuru ezu. Elaịhu gbakwụnyere, sị: “Ka a nwaruo Job n’isi n’ihi nzaghachi ya n’etiti ndị ajọ omume.” (NW) (Job 34:​10, 11, 35, 36) N’otu aka ahụkwa, a pụrụ ịnwapụta okwukwe na iguzosi ike anyị n’ezi ihe n’ụzọ zuru ezu nanị ma ọ bụrụ na ‘a nwaruo anyị n’isi’ n’ụzọ ụfọdụ. Ka o sina dị, Nna anyị nke eluigwe nke na-ahụ n’anya agaghị ekwe ka a nwaa anyị karịa ihe anyị pụrụ ịnagide.​—⁠1 Ndị Kọrint 10:13.

11. Mgbe a nwara anyị ọnwụnwa n’ụzọ siri ike, gịnị ka anyị kwesịrị icheta?

11 Ka Elaịhu gara n’ihu, o gosiri ọzọkwa na Job na-emesibiga ezi omume nke onwe ya ike. E kwesịrị ịtụkwasị uche n’ebe Onye Ukwu Mere anyị nọ. (Job 35:​2, 6, 10) Chineke ‘agaghị echebe ndụ nke onye na-emebi iwu: ma ọ na-enye ndị e wedara n’ala ikpe,’ ka Elaịhu kwuru. (Job 36:6) Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ikpe ụzọ Chineke ikpe wee kwuo na o meworị ajọ omume. Ọ dị elu karịa otú anyị pụrụ ịmara, ọnụ ọgụgụ afọ ya adịghịkwa agwụ agwụ n’ụzọ na-enweghị nchọpụta. (Job 36:​22-⁠26) Mgbe a nwara gị n’ụzọ siri ike, cheta na Chineke anyị na-adị ndụ mgbe nile bụ onye ezi omume, ọ ga-akwụghachikwa anyị ụgwọ ọrụ maka ọrụ ikwesị ntụkwasị obi anyị nile iji nye ya otuto.

12. Gịnị ka okwu mmechi ndị nke Elaịhu na-egosi banyere Chineke imezu ikpe ya n’ahụ ndị ajọ omume?

12 Ka Elaịhu nọ na-ekwu okwu, oké ifufe nọ na-ejikere. Ka ọ na-akpụdewe nso, obi ya malitere iti eti na ịma jijiji. O kwuru banyere oké ihe ndị Jehova meworo wee kwuo, sị: “Ṅaa ntị na nke a, Job: guzoo, ghọta oké ọrụ nile nke Chineke.” Dị ka Job, ọ dị anyị mkpa ichebara oké ọrụ dị iche iche na ịdị ebube na-akpali ịtụ egwu nke Chineke echiche. “Onye pụrụ ime ihe nile, anyị achọpụtaghị Ya,” ka Elaịhu kwuru. “Ọ dị ukwuu n’ike: n’ikpe na ịba ụba nke ezi omume Ọ dịghị eweda n’ala. N’ihi ya mmadụ na-atụ egwu Ya.” (Job 37:​1, 14, 23, 24) Okwu mmechi ndị nke Elaịhu na-echetara anyị na mgbe Chineke mezuru ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ndị ajọ omume n’isi nso, ọ gaghị eleda ikpe ziri ezi na ezi omume anya, ọ ga-echebekwa ndị ahụ na-atụ egwu ya dị ka ndị na-efe ya ofufe nsọpụrụ. Lee ihe ùgwù ọ bụ iso n’etiti ndị dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ezi ihe bụ́ ndị matara Jehova dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala! Tachie obi dị ka Job tachiri, ekwekwala mgbe ọ bụla ka Ekwensu dọpụ gị n’ọnọdụ gị a gọziri agọzi n’etiti ìgwè mmadụ a nwere obi ụtọ.

Jehova Azaa Job

13, 14. (a) Banyere gịnị ka Jehova malitere ịgba Job ajụjụ? (b) Isi ihe dịgasị aṅaa ka a pụrụ ịmụta site n’ajụjụ ndị ọzọ Chineke jụrụ Job?

13 Lee ka ọ na-aghaghị isiworị ju Job anya mgbe Jehova gwara ya okwu site n’oké ifufe! Oké ifufe ahụ bụ ọrụ aka Chineke, n’adịghị ka oké ikuku ahụ Setan jiri mee ihe itida ụlọ ahụ wee gbuo ụmụ Job. Job enweghị ọnụ okwu ka Chineke jụrụ, sị: “Olee ebe ị nọ mgbe M tọrọ ntọala ụwa? . . . Ònye tọgbọrọ nkume nkuku ya, mgbe kpakpando ụtụtụ na-etikọ mkpu ọṅụ, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọṅụ ike?” (Job 38:​4, 6, 7) Jehova jụrụ Job ajụjụ ọ jụpụ ọ jụkwa ọzọ banyere osimiri, uwe igwe ojii ya, chi ọbụbọ, ọnụ ụzọ ámá nke ọnwụ, ìhè na ọchịchịrị, na ụyọkọ kpakpando dị iche iche. Job apụghị ikwu ihe ọ bụla mgbe a jụrụ ya, sị: “Ị̀ mawo ụkpụrụ nile nke eluigwe?”​—⁠Job 38:33.

14 Ajụjụ ndị ọzọ gosiri na tupu e kee mmadụ wee nye ya ike n’ahụ azụ, nnụnụ, anụ ọhịa, na ihe ndị na-akpụ akpụ, Chineke na-enye ha ihe ndị dị ha mkpa​—⁠n’enwetaghị enyemaka ma ọ bụ okwu ndụmọdụ nke mmadụ. Ajụjụ ndị ọzọ nke Jehova hotara ihe ndị e kere eke ndị dị ka atụ́, enyí nnụnụ, na ịnyịnya. A jụrụ Job, sị: “Ọ̀ bụ n’okwu ọnụ gị ka ugo na-efeli elu, ma ọ bụ mee àkwụ́ ya ka ọ dị elu?” (Job 39:27) Ọ dịghị ma ọlị! Cheedi echiche ihe bụ́ mmeghachi omume Job mgbe Chineke jụrụ ya, sị: “Onye na-adọ aka ná ntị, ọ̀ na-alụso Onye pụrụ ime ihe nile ọgụ?” Ka a sịkwa ihe mere Job ji kwuo, sị: “Lee, abụ m onye e lelịworo; gịnị ka m ga-azaghachi Gị? Atụkwasịwo m aka m n’ọnụ m.” (Job 40:​2, 4) Ebe ọ bụ na Jehova ziri ezi mgbe nile, ọ bụrụ na ọ dị mgbe ọ bụla a ga-anwa anyị ime mkpesa megide ya, anyị kwesịrị ‘ịtụkwasị aka n’ọnụ anyị.’ Ajụjụ dị iche iche nke Chineke bulikwara ịdị elu, ịdị ebube, na ike ya elu, dị ka e gosipụtara n’okike.

Òtòbò na Leviathan

15. A na-ewerekarị òtòbò ịbụ anụ dị aṅaa, gịnịkwa bụ ụfọdụ n’ime ihe e ji mara ya?

15 Ọzọ, Jehova hotara òtòbò, nke a na-ewerekarị na ọ bụ enyí mmiri. (Job 40:​15-⁠24) N’ịbụ nke a rịbara ama n’ihi oké ibu, oké ịdị arọ, na akpụkpọ ya siri ike, anụ nke a ahịhịa bụ nri ya ‘na-ata ahịhịa ndụ.’ Ike ya dị n’úkwù ya na akwara nile nke afọ ya. Ọkpụkpụ ụkwụ ya siri ike dị ka “ogidi ọla nwere ụmị.” Òtòbò adịghị atụ ụjọ ná mmiri ndị na-achị ọkụ kama ọ na-eji nnọọ ntụsara ahụ na-egwu mmiri alaghachi azụ ebe si asọpụta.

16. (a) Nkọwa e nyere Leviathan kwekọrọ n’ihe okike dị aṅaa, gịnịkwa bụ eziokwu ụfọdụ banyere ya? (b) Ike nke òtòbò na Leviathan pụrụ igosi gịnị banyere ịrụzu ọrụ n’ozi Jehova?

16 Chineke jụkwara Job, sị: “Ị̀ ga-eji nko azụ dọrọ [Leviathan, NW]? Ma ọ bụ ị̀ ga-eji ụdọ bịada ire ya?” Nkọwa e nyere Leviathan kwekọrọ nnọọ n’oké agụ iyi. (Job 41:​1-⁠34) Ọ gaghị eso onye ọ bụla gbaa ndụ maka udo, ọ dịghịkwa onye ọ bụla bụ́ mmadụ nke maara ihe nke nwere anya ike nke na ọ gaje ịkpọte anụ a na-akpụ akpụ. Akụ́ adịghị eme ka ọ gbalaga, “ọ na-achịkwa mkpọtụ árụ̀a ọchị.” Leviathan nke na-akpa ike na-eme ka ogbu mmiri gbọọ dị ka ite mmanụ otite na-agbọ agbọ. Eziokwu ahụ bụ́ na Leviathan na òtòbò dị ike nke ukwuu karịa Job nyere aka iweda ya ala. Anyị aghaghịkwa iji ịdị umeala n’obi mata na anyị adịghị ike n’onwe anyị. Amamihe na ike nke sitere n’aka Chineke dị anyị mkpa iji gbanahụ ihe ọgbụgba Setan, bụ́ Agwọ ahụ, na iji rụzuo ọrụ anyị nile n’ozi Jehova.​—⁠Ndị Filipaị 4:13; Mkpughe 12:9.

17. (a) Olee otú Job si “hụ Chineke”? (b) Gịnị ka a nwapụtara site n’ajụjụ ndị Job na-enweghị ike ịza, oleekwa otú nke a pụrụ isi nyere anyị aka?

17 N’ịbụ onye e wedara ala kpam kpam, Job nakweere echiche ya na-ezighị ezi ma kweta na ya ekwuwo okwu n’enweghị ihe ọmụma. Ma, o gosipụtaworị okwukwe na ya gaje ‘ịhụ Chineke.’ (Job 19:​25-⁠27) Olee otú nke ahụ pụrụ isi mee, ebe ọ bụ na ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịhụ Jehova ma nọgide na-adị ndụ? (Ọpụpụ 33:20) N’ezie, Job hụrụ ngosipụta nke ike Chineke, nụ okwu Chineke, e megheekwa anya nghọta ya ịhụ ihe bụ eziokwu banyere Jehova. N’ihi ya Job ‘jụrụ onwe ya ajụ wee chegharịa n’elu ájá na ntụ.’ (Job 42:​1-⁠6) Ọtụtụ ajụjụ ahụ ndị ọ na-enweghị ike ịza anwapụtawo ịdị elu nke Chineke, gosikwa ịdị nta nke mmadụ, ọbụna onye raara onwe ya nye Jehova dị ka Job. Nke a na-enyere anyị aka ịhụ na a gaghị ebute ọdịmma anyị nile ụzọ n’ebe ido aha Jehova nsọ na iwepụ ọkaaka ya n’ụta dị. (Matiu 6:​9, 10) Nchegbu anyị bụ́ isi kwesịrị ịbụ ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova na ịsọpụrụ aha ya.

18. Gịnị ka ọ dị ndị nkasi obi ụgha nke Job mkpa ka ha mee?

18 Otú ọ dị, olee banyere ndị nkasi obi ụgha ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha? Jehova n’ụzọ ziri ezi gaara egbuworị Elifaz, Bildad na Zofa n’ihi ekwughị ihe bụ́ eziokwu banyere ya, dị ka Job meworo. “Chịrịnụ n’onwe unu oké ehi asaa na ebulu asaa, jekwuru ohu m, bụ́ Job,” ka Chineke kwuru, “sureere onwe unu àjà nsure ọkụ; Job, bụ́ ohu m, ga-ekpekwa ekpere banyere unu.” Mmadụ atọ ahụ aghaghị iweda onwe ha ala iji mee ihe e kwuru. Job na-eguzosi ike n’ezi ihe ga-ekpere ha ekpere, Jehova nabatakwara ekpere ya. (Job 42:​7-⁠9) Ma olee banyere nwunye Job, bụ́ onye gbara ya ume ịgbakụta Chineke azụ ma nwụọ? O yiri ka ya na ya edozighachiri okwu ha site n’ebere Chineke.

Ụgwọ Ọrụ Ndị E Kwere Nkwa Ha Na-enye Anyị Olileanya

19. N’ihe banyere Job, olee otú Jehova si gosi nkarị Ọ karịrị Ekwensu?

19 Ozugbo Job kwụsịrị ichegbu onwe ya banyere ahụhụ ya nile, bụrụkwa onye e weghachiri n’ozi Chineke, Jehova gbanwere ọnọdụ ya. Mgbe Job kpesịịrị mmadụ atọ ahụ ekpere, Chineke ‘mere ka ndọta n’agha Job lata,’ wee nye ya ‘ihe nile o nwere okpukpu abụọ.’ Jehova gosiri nkarị Ọ karịrị Ekwensu site n’igbochi aka Setan nke na-akpata ọrịa na ịgwọ Job n’ụzọ ọrụ ebube. Chineke chụghachikwara ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ahụ ma gbochie ha ịbịa nso site n’iji usuu ndị mmụọ ozi Ya wee gbaa Job ogige gburugburu ọzọkwa.​—⁠Job 42:10; Abụ Ọma 34:7.

20. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova si kwụghachi Job ụgwọ ma gọzie ya?

20 Ụmụnne ndị nwoke, ndị nwanyị, na ikwu na ibe Job ndị mbụ nọgidere na-abịa isoro ya rie ihe, gosi ya ebere, kasiekwa ya obi n’ọdachi nke Jehova kwererị ka ọ bịakwasị ya. Onye ọ bụla n’ime ha nyere Job ego na mgbaaka ọlaedo. Jehova gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya, o wee nwee 14,000 atụrụ, 6,000 camel, 1,000 ehi e jikọrọ abụọ abụọ, 1,000 nne ịnyịnya ibu. Job bịakwara nwee ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ ndị inyom atọ, bụ́ ọnụ ọgụgụ ahụ o nweburu. Ụmụ ya ndị inyom​—⁠Jemaịma, Kezaịa, na Keren-hapuk⁠—​bụ ndị inyom kasị maa mma n’ala ahụ, Job nyekwara ha ihe nketa n’etiti ụmụnne ha ndị ikom. (Job 42:​11-⁠15) Ọzọkwa, Job dịrị ndụ 140 afọ ọzọkwa wee hụ ọgbọ anọ nke ụmụ ya. Ihe ndekọ ahụ mechiri: “Job wee nwụọ, bụrụ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.” (Job 42:​16, 17) Mgbatị nke afọ ndụ ya bụ ọrụ ebube nke Jehova Chineke.

21. Olee otú ihe ndekọ ahụ nke Akwụkwọ Nsọ banyere Job si enyere anyị aka, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

21 Ihe ndekọ nke Akwụkwọ Nsọ banyere Job na-eme ka anyị mata karị banyere atụmatụ dị iche iche nke Setan ma na-enyere anyị aka ịhụ otú e si jikọta ọkaaka eluigwe na ala na iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụ mmadụ. Dị ka Job, a ga-ele ndị nile hụrụ Chineke n’anya ule. Ma anyị pụrụ ịtachi obi dị ka Job tachiri obi. O ji okwukwe na olileanya lanarị ule ya dị iche iche, ụgwọ ọrụ ya dịkwa ọtụtụ. Dị ka ndị ohu Jehova taa, anyị nwere ezi okwukwe na olileanya. Leekwa aha olileanya ndị dị ebube nke Onye Nkwụghachi Ụgwọ Ukwu ahụ setịpụworo n’ihu onye ọ bụla n’ime anyị! Iburu nkwụghachi ụgwọ eluigwe ahụ n’uche ga-enyere ndị ahụ e tere mmanụ aka ịnọgidesi ike n’ihe na-ejere Chineke ozi n’ogologo ndụ ha nile fọdụrụ n’elu ala. Ọtụtụ ndị nwere olileanya elu ala agaghị anwụ ma ọlị, ma a ga-eji mbilite n’ọnwụ n’ime Paradaịs n’elu ala kwụghachi ndị nwụrụnụ ụgwọ ọrụ, tinyere Job n’onwe ya. N’iburu ezi olileanya ndị dị otú ahụ n’uche na n’obi, ka ndị nile hụrụ Chineke n’anya gosipụta Setan dị ka onye ụgha site n’iguzosi ike n’akụkụ nke Jehova dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe na ndị nkwado siri ike nke ọkaaka eluigwe na ala ya.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?

◻ Gịnị bụ isi ihe ụfọdụ Job kwupụtara ná nzaghachi ikpeazụ ya nye ndị nkasi obi ụgha ya?

◻ Olee otú Elaịhu si gosi onwe ya ịbụ onye àmà na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu nke Jehova?

◻ Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị Chineke jụrụ Job, mmetụta dịkwa aṅaa ka ha nwere?

◻ Olee otú i siworo rite uru site n’ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ banyere Job?

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Okwu ndị nke Jehova banyere òtòbò na Leviathan nyere aka iweda Job ala

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya