Ịzụlite Mmadụ Ọhụrụ Ahụ n’ime Alụmdi Na Nwunye
“Ka e meekwa ka unu dị ọhụrụ ná mmụọ nke uche unu, ka unu yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ unu.”—NDỊ EFESỌS 4:23, 24.
1. N’ihi gịnị ka a na-agaghị eji were alụmdi na nwunye dị ka obere ihe?
ALỤMDI NA NWUNYE bụ otu n’ime nzọụkwụ ndị kasị mkpa mmadụ na-ewere ná ndụ, ya mere ọ dịghị mgbe e kwesịrị ile ya anya dị ka obere ihe. N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? N’ihi na ọ chọrọ gị na onye ọzọ ịnọ n’ihe nkekọ n’ogologo oge nile a dị ndụ. Ọ pụtara mmadụ isoro onye ahụ bie ndụ ya nile. Ime ntụle tozuru okè dị mkpa ma ọ bụrụ na ihe nkekọ ahụ ga-ezi ezi. Ọ chọkwara inwe mmetụta ziri ezi ‘ime ka uche dị ọhụrụ, sikwa otú ahụ kpụzie mmadụ ọhụrụ ahụ.’—Ndị Efesọs 4:23, 24; tụlee Jenesis 24:10-58; Matiu 19:5, 6.
2, 3. (a) Gịnị dị mkpa iji họrọ onye mmadụ ga-alụ n’ụzọ amamihe? (b) Gịnị ka alụmdi na nwunye gụnyere?
2 E nwere ezi ihe mere a na-agaghị eji banye n’alụmdi na nwunye n’ike, na-abụ onye a na-akwagharị site n’ọchịchọ dị ike nke anụ ahụ. Oge dị mkpa ka ọdịdị na àgwà mmadụ tozuru etozu wee pụta. Mgbe oge na-agakwa, a na-enweta ahụmahụ na ihe ọmụma ndị pụrụ ije ozi dị ka ntọala maka mkpebi ziri ezi. Mgbe ahụ, ịhọrọ onye mmadụ ga-alụ nke kwesịrị ya pụrụ inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ịga nke ọma dị ukwuu karị. Otu ilu ndị Spain kwuru ya n’ụzọ doro anya, sị: “Ọ ka mma ịnọ nanị gị karịa ịnọ n’alụmdi na nwunye dị njọ.”—Ilu 21:9; Eklisiastis 5:2.
3 O doro anya na ịhọrọ onye dị mmadụ mma ọlụlụ bụ ihe dị oké mkpa iji nwee alụmdi na nwunye na-aga nke ọma. Iji mee nke ahụ, onye Kraịst aghaghị ịgbaso nduzi nke Bible, ghara ịbụ onye a na-eduzi site ná ndọrọ anụ ahụ na nrụgide uche na ịhụnanya na-ekwesịghị ekwesị. Alụmdi na nwunye karịrị nnọọ ijikọ anụ ahụ abụọ ọnụ. Ọ bụ ijikọ ọdịdị mmadụ abụọ ọnụ, ezinụlọ na ọzụzụ agụmakwụkwọ abụọ, ma eleghị anya ọdịnala na asụsụ abụọ. Ijikọta mmadụ abụọ n’alụmdi na nwunye chọrọ n’ezie iji ire na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi; site n’ike nke okwu ọnụ, anyị na-etida etida ma ọ bụ na-ewuli elu. Site n’ihe ndị a nile, anyị na-ahụkwa amamihe dị na ndụmọdụ Pọl nke ‘ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị,’ ya bụ, onye kwere ekwe ibe anyị.—1 Ndị Kọrint 7:39; Jenesis 24:1-4; Ilu 12:18; 16:24.
Iche Ihe Isi Ike nke Alụmdi na Nwunye Ihu
4. N’ihi gịnị ka esemokwu na nsogbu na-eji ebilite n’alụmdi na nwunye?
4 Ọbụna ma e nwee ntọala dị mma, a ga-enwe oge esemokwu, nrụgide, na nsogbu. Ndị a bụ ihe a na-ahụ ná ndụ nye onye ọ bụla, ma ọ̀ bụ onye nọ n’alụmdi na nwunye ma ọ bụ na ọ bụghị. Nsogbu ọnọdụ akụ na ụba na ahụ ike pụrụ ịkpata ihe isi ike n’ime mmekọrịta ọ bụla. Mgbanwe nke ọnọdụ uche pụrụ iduga ná nghọtahie nke ọdịdị mmadụ n’alụmdi na nwunye nke kasị mma. Isi ihe ọzọ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịkwa ire ya nga n’ụzọ zuru okè, dị ka Jemes kwuru: “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe. Ọ bụrụ na onye ọ bụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru okè, bụrụkwa onye pụrụ ịkwa ahụ ya dum nga. . . . Ire bụkwa ihe nta dị n’ahụ, ọ na-anyakwa isi oké ihe. Lee, otu oké ọhịa hà ukwuu, bụ́ nke ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ!”—Jemes 3:2, 5.
5, 6. (a) Gịnị dị mkpa mgbe nghọtahie bilitere? (b) Ihe dị aṅaa ka ọ pụrụ ịdị mkpa ka e mee iji dozie esemokwu?
5 Mgbe nrụgide bilitere n’alụmdi na nwunye, olee ụzọ anyị pụrụ isi chịkwaa ọnọdụ ahụ? Olee ụzọ anyị pụrụ isi gbochie nghọtahie ka ọ ghara ịghọ esemokwu nakwa esemokwu ka ọ ghara ịghọ mmekọrịta e mebiri emebi? Nke a bụ ebe ikike nke ime ka uche mmadụ dị ọhụrụ na-adị irè n’ọnọdụ ahụ. Mmụọ mkpali nke a pụrụ ịbụ nke ziri ezi ma ọ bụ nke na-ezighị ezi, nke na-ewuli elu na nke bụ maka ihe ime mmụọ ma ọ bụ nke na-ewetu ala, nke ọchịchọ anụ ahụ na-akwali. Ọ bụrụ na ọ na-ewuli elu, onye ahụ ga-eme ihe iji dozie esemokwu ahụ, iji mee ka alụmdi na nwunye ya nọgide na-aga n’ihu. Arụmụka na enweghị nkwekọrịta ekwesịghị ịkwụsị alụmdi na nwunye. A pụrụ ikpezi okwu ahụ, weghachikwa nkwanyerịta ùgwù na nghọta site n’itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ.—Ndị Rom 14:19; Ndị Efesọs 4:23, 26, 27.
6 N’okpuru ọnọdụ ndị a, okwu Pọl kwesịrị nnọọ ekwesị: “Ya mere dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ ndị a hụwokwara n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi; na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a: ma n’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsị 3:12-14.
7. Nsogbu ndị dị aṅaa ka ụfọdụ pụrụ inwe n’alụmdi na nwunye ha?
7 Akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ dị mfe ọgụgụ, ma n’okpuru nrụgide nke ndụ a na-adị n’oge a, ọ naghị adịcha mfe itinye ya n’ọrụ. Gịnị pụrụ ịbụ nsogbu bụ isi? Mgbe ụfọdụ, n’amaghị banyere ya, onye Kraịst pụrụ ịdị na-agbaso ụkpụrụ abụọ dịrịtara iche. N’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ nọ n’etiti ụmụnna, ọ na-emekwa omume obi ọma na nchebara echiche. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na a laa n’ụlọ, n’ihe omume nke ezinụlọ, ọ pụrụ iyi ka ọ na-echezọ mmekọrịta ime mmụọ ya. N’ebe ahụ ọ bụ nanị nwoke na nwunye ya, “ya” na “nwunye ya.” N’okpuru nrụgide, nwoke (ma ọ bụ nwanyị) pụrụ ikwu ihe na-adịghị mma nke a na-apụghị ikwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Gịnị meworo? Na nwa oge ahụ, Iso Ụzọ Kraịst apụwo n’uche. Onye ohu Chineke echezọwo na ya ka bụkwa onye Kraịst bụ́ nwanna n’ụlọ. Ime ka uche dị ọhụrụ aghọwo nke na-ezighị ezi kama ịbụ nke ziri ezi.—Jemes 1:22-25.
8. Gịnị pụrụ isi na ya pụta mgbe ikike na-eme ka uche dị ọhụrụ bụ nke na-ezighị ezi?
8 Gịnị ka nke ahụ na-arụpụta? Onye bụ di pụrụ ịkwụsị ‘iso nwunye ya na-ebi n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ dị ka onye na-adịghị ike.’ Ọ pụrụ ịbụ na onye bụ nwunye adịghịkwa asọpụrụ di ya; ‘mmụọ ya nke dị nwayọọ dịkwa udo’ adịghịkwa. Ikike nke na-eme ka uche dị ọhụrụ aghọwo nke anụ ahụ kama ịbụ nke ime mmụọ. “Uche nke anụ ahụ” abatawo. Ya mere, gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka ike mkpali ahụ bụrụ nke ime mmụọ na nke ziri ezi? Anyị aghaghị iwusi ọnọdụ ime mmụọ anyị ike.—1 Pita 3:1-4, 7; Ndị Kọlọsi 2:18.
Iwusi Ikike ahụ Ike
9. Nhọrọ ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ime ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị?
9 Ikike mkpalị ahụ bụ ọchịchọ nke uche nke na-adị irè mgbe anyị nwere mkpebi na nhọrọ ndị anyị ga-eme. Ndụ na-ewepụta usoro nhọrọ mgbe mgbe—ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ, ọdịmma onwe onye nanị ma ọ bụ achọghị ọdịmma onwe onye nanị, omume ọma ma ọ bụ omume rụrụ arụ. Gịnị ga-enyere anyị aka ime mkpebi ziri ezi? Ikike nke na-eme ka uche dị ọhụrụ ma ọ bụrụ na e hiwe ya isi n’ime uche Jehova. Onye ọbụ abụ ahụ kpere ekpere, sị: “Zi m ụzọ ụkpụrụ gị nile: m ga-echebekwa ya ruo mgbe ikpeazụ.”—Abụ Ọma 119:33; Ezikiel 18:31; Ndị Rom 12:2.
10. Olee ụzọ anyị pụrụ isi wusiwanye ikike ahụ na-eme ka uche anyị dị ọhụrụ ike n’ụzọ ziri ezi?
10 Mmekọrịta siri ike n’ebe Jehova nọ ga-enyere anyị aka ime ihe na-atọ ya ụtọ na ichigharị pụọ n’ebe ihe ọjọọ dị, gụnyere ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye. A gbara Israel ume ka ha “na-eme ihe dị mma nke ziri ezi n’anya Jehova, bụ́ Chineke [ha].” Ma Chineke nyekwara ndụmọdụ, sị: “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” N’ihi nke asaa n’ime Iwu Iri ahụ, nke bụ: “Gị akwala iko,” ụmụ Israel aghaghị ịkpọ ịkwa iko asị. Iwu ahụ gosipụtara echiche siri ike Chineke nwere banyere ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye.—Deuterọnọmi 12:28; Abụ Ọma 97:10; Ọpụpụ 20:14; Levitikọs 20:10.
11. Olee ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi wusie ikike ahụ na-eme ka uche dị ọhụrụ ike?
11 Olee ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi wusiwanye ikike ahụ nke na-eme ka uche dị ọhụrụ ike? Ọ bụ site n’ịghọta ihe omume na uru ihe ime mmụọ. Nke ahụ pụtara na anyị aghaghị igbo mkpa nke ịmụ Okwu Chineke mgbe mgbe, mụtakwa inwe obi ụtọ n’ịtụlekọ uche na ndụmọdụ Jehova. Mmetụta sitere n’ala ala obi anyị kwesịrị ịdị ka nke onye ọbụ abụ ahụ: “Obi m nile ka m werewooro chọọ gị: ekwela ka m si n’ihe nile i nyere n’iwu jehie. N’obi m ka m zobeworo okwu ọnụ gị, ka m wee ghara imehie megide gị. Jehova, zi m ụzọ ụkpụrụ gị nile: m ga-echekwa ya ruo mgbe ikpeazụ. Mee ka m ghọta ihe, m ga-echebekwa iwu gị; m ga-ewerekwa obi m nile debe ya.”—Abụ Ọma 119:10, 11, 33, 34.
12. Ihe ndị dị aṅaa pụrụ ime ka anyị dị n’otu n’igosipụta uche nke Kraịst?
12 A na-ejigide ụdị nghọta nke a nke ụkpụrụ ezi omume Jehova ọ bụghị nanị site n’ịmụ Bible kamakwa site n’ikere òkè mgbe mgbe ná nzukọ nile nke ndị Kraịst na site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ozi ndị Kraịst. Mmetụta abụọ ndị a dị ike pụrụ mgbe nile imesiwanye ikike nke na-eme ka uche anyị dị ọhụrụ ike, ka ụzọ ndụ anyị nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị wee na-egosipụta uche nke Kraịst mgbe nile.—Ndị Rom 15:5; 1 Ndị Kọrint 2:16.
13. (a) N’ihi gịnị ka ekpere ji bụrụ isi ihe bara oké uru n’iwusi ikike ahụ na-eme ka uche dị ọhụrụ ike? (b) Ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ n’akụkụ nke a?
13 Isi ihe ọzọ bụ ihe Pọl mere ka ọ pụta ìhè n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs: “Sitekwanụ n’ekpere na arịrịọ nile na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime mmụọ nsọ.” (Ndị Efesọs 6:18) Ndị bụ di na nwunye kwesịrị ịdị na-ekpekọ ekpere ọnụ. Ọtụtụ mgbe ekpere ndị dị otú ahụ na-emeghe obi ma na-eduga ná nkwurịta okwu ndị bụ eziokwu nke na-edozi esemokwu ọ bụla. N’oge ule na ọnwụnwa, ọ dị mkpa ka anyị chigharịkwuru Chineke n’ekpere, na-arịọ ya maka enyemaka, maka ịdị ike ime mmụọ iji mee ihe kwekọrọ n’uche nke Kraịst. Ọbụna Jisọs ahụ zuru okè chigharịkwuuru Nna ya n’ekpere n’ọtụtụ oge, na-arịọ maka ike. Ekpere ya sitere n’obi, bụrụkwa nke e kpesiri ike. N’otu aka ahụ taa, n’oge ọnwụnwa, anyị pụrụ inweta ike iji mee mkpebi ziri ezi site n’ịkpọku Jehova inyere anyị aka iguzogide ọchịchọ nke ime ihe anụ ahụ na-achọ na imebi nkwa alụmdi na nwunye anyị.—Abụ Ọma 119:101, 102.
Ihe Atụ Omume Ndị Dịrịtara Iche
14, 15. (a) Olee ụzọ Josef si meghachi omume n’oge ọnwụnwa? (b) Gịnị nyeere Josef aka iguzogide ọnwụnwa?
14 Olee ụzọ anyị pụrụ isi chee ọnwụnwa ihu? N’akụkụ nke a anyị nwere ọdịiche doro anya n’etiti ụzọ Josef na Devid gbasoro. Mgbe nwunye Pọtifa nwara mgbe mgbe ịrafu Josef ahụ mara mma nwoke, bụ́ onye ihe àmà na-egosi na ọ lụbeghị nwunye n’oge ahụ, o mesịrị zaghachi ya site n’ịsị: “Ọ dịghị ukwuu n’ụlọ a karị mụ onwe m; o [di gị] gbochighịkwa ihe ọ bụla n’ebe m nọ ma ọ bụghị nanị gị, n’ihi na gị onwe gị bụ nwunye ya: m̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?”—Jenesis 39:6-9
15 Gịnị nyeere Josef aka ịgbaso ụzọ ziri ezi mgbe ọ gaara adị nnọọ mfe ikwenye? O nwere ikike dị ike nke na-eme ka uche ya dị ọhụrụ. Ọ maara nke ọma banyere mmekọrịta ya na Jehova. Ọ maara na ya isoro nwanyị a nwere ịhụnanya nzuzu kwaa iko ga-abụ mmehie n’ezie megide ọ bụghị nanị di ya, kama n’ụzọ kasị mkpa, megide Chineke.—Jenesis 39:12.
16. Olee ụzọ Devid si meghachi omume n’oge ọnwụnwa?
16 N’ụzọ dị iche, gịnị mere Devid? Ọ bụ nwoke nke lụrụ ọtụtụ nwunye dị ka Iwu ahụ nyere ohere ya. N’otu uhuruchi ọ hụrụ site n’òbíeze ya otu nwanyị nke na-asa ahụ. Ọ bụ Bat-sheba nke mara mma, bụ́ nwunye Uraịa. O doro anya na Devid nwere nhọrọ nke ihe ọ pụrụ ime—ịnọgide na-ele ka agụụ ya bilite n’ime obi ya ma ọ bụ iwepụ anya ya ma jụ ọnwụnwa ahụ. Gịnị ka ọ họọrọ ime? O mere ka a kpọta ya n’òbíeze ya, o wee kwaso ya iko. Ọbụna nke ka njọ, ọ gara n’ihu ime ka e gbuo di ya.—2 Samuel 11:2-4, 12-27.
17. Gịnị ka anyị pụrụ ịghọta banyere ọnọdụ ime mmụọ nke Devid?
17 Gịnị bụ nsogbu Devid? Site ná nkwupụta nchegharị o mesịrị mee n’Abụ Ọma 51, anyị pụrụ ịghọta eziokwu ụfọdụ. Ọ sịrị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” Ọ pụtara ìhè na n’oge ahụ nke ọnwụnwa ya, o nweghị mmụọ dị ọcha na nke na-eguzosi ike. Ma eleghị anya o legharawo ihe ọgụgụ ya nke Iwu Jehova anya, dịkwa ka ihe si na nke ahụ pụta, ọnọdụ ime mmụọ ya dara mbà. Ma ọ bụ ọ pụrụ ikweworị ka ọnọdụ ya na ike o nwere dị ka eze merụọ echiche ya nke na ọ dabara n’ọnyà nke agụụ mmekọahụ rụrụ arụ. N’ezie, ikike nke na-eme ka uche ya dị ọhụrụ n’oge ahụ chọrọ ọdịmma onwe ya nanị, na-emehiekwa emehie. Otú a, o mesịrị ghọta mkpa ya nke inwe “mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ.”—Abụ Ọma 51:10; Deuterọnọmi 17:18-20.
18. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere ịkwa iko?
18 Ụfọdụ alụmdi na nwunye ndị Kraịst abụwo nke e tikpọrọ n’ihi na otu n’ime ha ma ọ bụ mmadụ abụọ ahụ ekwewo ka ha daba n’ọnọdụ nke adịghị ike ime mmụọ yiri nke Eze Devid. Ihe atụ ya kwesịrị ịdọ anyị aka ná ntị megide ịnọgide na-ele nwanyị, ma ọ bụ nwoke ọzọ anya, na-enwe agụụ, n’ihi na ịkwa iko pụrụ imesị si na nke ahụ pụta. Jisọs gosiri na ya ghọtara mmetụta uche mmadụ n’akụkụ nke a, n’ihi na o kwuru, sị: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Akwala iko: ma mụ onwe m sị unu, na nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” N’ọnọdụ dị otú ahụ, ikike nke na-eme ka uche dị ọhụrụ na-achọ ọdịmma onwe ya, bụrụ nke anụ ahụ, ọ bụghị nke ime mmụọ. Mgbe ahụ, gịnị ka ndị Kraịst pụrụ ime iji zere ịkwa iko na idebe alụmdi na nwunye ha n’ọnọdụ obi ụtọ na nke na-eju afọ?—Matiu 5:27, 28.
Wusie Ihe Nkekọ nke Alụmdi na Nwunye Ike
19. Olee ụzọ a pụrụ isi mee ka alụmdi na nwunye dị ike?
19 Eze Solomọn dere, sị: “Ọ bụrụkwa na mmadụ enwee ike n’ahụ otu onye nanị ya dị, ma otú ọ dị, mmadụ abụọ ga-eguzo imegide ya; ọzọ, ụdọ atọ nke a tụkọtara n’otu, a dịghị adọbi ya ngwa ngwa.” N’ezie, mmadụ abụọ nọ n’alụmdi na nwunye dị n’otu pụrụ iguzokọta nke ọma n’oge ihe isi ike karị otu onye. Ma ọ bụrụ na ihe nkekọ ha dị ka ụdọ atọ a tụkọtara n’otu site n’inwe Chineke na ya, alụmdi na nwunye ahụ ga-esi ike. Olee ụzọ Chineke pụrụ isi nọrọ n’alụmdi na nwunye? Site na di na nwunye ahụ itinye ụkpụrụ na ndụmọdụ ya maka alụmdi na nwunye n’ọrụ.—Eklisiastis 4:12.
20. Ndụmọdụ Bible dị aṅaa pụrụ inyere onye bụ di aka?
20 N’ezie, ọ bụrụ na onye bụ di etinye ndụmọdụ ndị dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ n’ọrụ, alụmdi na nwunye ya ga-enwe ntọala ka mma maka ịga nke ọma:
“Ndị bụ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, dị ka unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ ndụ; ka e wee ghara igbochi ekpere unu.”—1 Pita 3:7.
“Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ ya n’anya, rarakwa onwe ya nye n’ihi ya. Otú a ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya.”—Ndị Efesọs 5:25, 28.
“Di ya kwa, ọ na-etokwa ya, sị: Ọtụtụ ụmụ ndị inyom emewo omume kwesịrị ndị inyom na-ejide onwe ha nke ọma, ma gị onwe gị kachasị ha nile.”—Ilu 31:28, 29.
“Mmadụ, ọ̀ ga-eje ije n’elu icheku ọkụ, ma ọkụ agaghị ahụ ya n’ụkwụ ya abụọ? Otú a ka onye na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya dị; a gaghị agụ onye ọ bụla nke na-emetụ nwanyị ahụ aka n’onye na-emeghị ihe ọjọọ. Onye na-akwa nwanyị iko . . . na-emebi mkpụrụ obi nke aka ya.”—Ilu 6:28, 29, 32.
21. Ndụmọdụ Bible dị aṅaa pụrụ inyere onye bụ nwunye aka?
21 Ọ bụrụ na onye bụ nwunye aṅaa ntị n’ụkpụrụ Bible ndị a na-esonụ, ọ ga-enye aka ime ka alụmdi na nwunye ya dịgide:
“Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbụna à sị na ụfọdụ ekwenyeghị okwu Chineke, ka e wee site n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu; mgbe ha na-ele ibi obi unu dị ọcha, ya na egwu [nakwa] mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo.”—1 Pita 3:1-4.
“Ka di kwụghachi nwunye ya ụgwọ [mmekọahụ] o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwụghachikwa di ya ụgwọ o ji ya. . . . Unu emegbula onwe unu, ma ọ bụghị ma eleghị anya unu ga-esite n’otu olu mee ya na nwa oge.”—1 Ndị Kọrint 7:3-5.
22. (a) Isi ihe ndị ọzọ dị aṅaa pụrụ inwe mmetụta dị mma n’alụmdi na nwunye? (b) Olee ụzọ Jehova si ele ịgba alụkwaghịm anya?
22 Bible na-egosikwa na ịhụnanya, obi ọma, ọmịiko, ndidi, nghọta, agbamume, na ịja mma bụ akụkụ ndị ọzọ dị mkpa nke ọla alụmdi na nwunye. Alụmdi na nwunye nke ha na-adịghị na ya dị ka ihe ọkụkụ nke na-adịghị enweta anwụ na mmiri—ọ na-esiri ya ike ịmà akwụkwọ. Ya mere ka ikike ahụ na-eme ka uche anyị dị ọhụrụ kpalie anyị inyerịta ibe anyị agbamume na ume ọhụrụ n’alụmdi na nwunye anyị. Cheta na Jehova ‘kpọrọ nchụpụ nwunye asị.’ Ọ bụrụ na e nwere ịhụnanya ndị Kraịst, e kwesịghị inwe ohere ọ bụla maka ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye nakwa ndakpọ nke alụmdi na nwunye. N’ihi gịnị? “Ịhụnanya adighị ada mgbe ọ bụla.”—Malakaị 2:16; 1 Ndị Kọrint 13:4-8; Ndị Efesọs 5:3-5.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị dị oké mkpa iji nwee alụmdi na nwunye obi ụtọ?
◻ Olee ụzọ ikike ahụ na-eme ka uche dị ọhụrụ pụrụ isi metụta alụmdi na nwunye?
◻ Olee ihe anyị pụrụ ime iji wusie ikike ahụ na-eme ka uche anyị dị ọhụrụ ike?
◻ Olee ụzọ Josef na Devid si mee omume dịgasị iche mgbe ha nọ n’okpuru ọnwụnwa?
◻ Ndụmọdụ Bible dị aṅaa ga-enyere ndị bụ di na ndị bụ nwunye aka iwusi ihe nkekọ nke alụmdi na nwunye ike?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ànyị na-ebi ndụ n’ụkpụrụ abụọ dịrịtara iche—obi ọma n’ọgbakọ, olu ike n’ụlọ?