Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 12/1 p. 10-14
  • Jehova, Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova, Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka Jehova Ji “Na-agbaghara Mmehie”?
  • N’ókè Hà Aṅaa Ka Mgbaghara Jehova Na-ezu Ezu?
  • “M Gaghị Echetakwa Mmehie Ha Ọzọ”
  • Gịnị Banyere Ihe Ndị Ọ Na-arụpụta?
  • Chineke nke “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Agbagharala Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Jehova Bụ Onye Kacha Agbaghara Mmehie
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Uru Mgbaghara Jehova Na-abara Gị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 12/1 p. 10-14

Jehova, Chineke nke “Na-agbaghara Mmehie”

“Gị onwe gị, Onyenwe anyị, dị mma, Ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie.”—ABỤ ỌMA 86:5.

1. Ibu arọ dị aṅaa ka Eze Devid buru, oleekwa otú o si chọta nkasi obi nye obi ya nọ ná nchegbu?

EZE DEVID nke Israel oge ochie maara otú ibu arọ nke obi amamikpe pụrụ ịdịru arọ. O dere, sị: “Ajọ omume m nile agabigawo n’elu isi m: dị ka ibu arọ ha dịkara m arọ. Ahụ m esinwụwo, e gwepịawokwa m nke ukwuu: agbọwo m ụja n’ihi ịsụ ude nke obi m.” (Abụ Ọma 38:4, 8) Otú ọ dị, Devid chọtara nkasi obi maka obi ya nọ ná nchegbu. Ọ maara na ọ bụ ezie na Jehova kpọrọ mmehie asị, ọ dịghị akpọ onye mmehie ahụ asị—ma ọ bụrụ na onye ahụ enwee nchegharị n’ezie ma jụ ụzọ mmehie ya. (Abụ Ọma 32:5; 103:3) N’inwe okwukwe zuru ezu ná njikere Jehova dị imere ndị nwere nchegharị ebere, Devid kwuru, sị: “Gị onwe gị, Onyenwe anyị, dị mma, Ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie.”—Abụ Ọma 86:5.

2, 3. (a) Mgbe anyị mehiere, ibu arọ dị aṅaa ka ọ pụrụ ime ka anyị buru, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji dị mma? (b) Olee ihe ize ndụ dị n’ịbụ onye obi amamikpe ‘lodara’? (ch) Mmesi obi ike dị aṅaa ka Bible na-enye anyị banyere njikere Jehova dị ịgbaghara?

2 Mgbe anyị mere mmehie, anyị onwe anyị kwa pụrụ iburu oké ibu arọ nke akọ na uche nwere ihe mgbu. Mmetụta nke a nke ịkwa ụta kwesịrị ekwesị, ọbụna baa uru. Ọ pụrụ ịkwali anyị iwere nzọụkwụ ndị dị mma iji dozie ihie ụzọ anyị. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị Kraịst abụrụwo ndị obi amamikpe rikpuru. Obi nke na-ama ha ikpe pụrụ ịnọgide na-eche na Chineke agaghị agbaghara ha kpam kpam n’agbanyeghị otú ha si nwee nchegharị. “Ọ bụ mmetụta dị oké njọ mgbe i chere na Jehova nwere ike ghara ịhụ gị n’anya ọzọ,” ka otu nwanna nwanyị kwuru mgbe ọ na-atụgharị uche n’ihe o mehieworo. Ọbụna mgbe o chegharịrị ma nara ndụmọdụ na-enye aka sitere n’aka ndị okenye ọgbakọ, ọ nọgidere na-enwe mmetụta nke ekwesịghị mgbaghara Chineke. Ọ na-akọwa, sị: “Ọ dịghị ụbọchị gafere m na-arịọghị Jehova maka mgbaghara ya.” Ọ bụrụ na anyị abụrụ ndị obi amamikpe ‘lodara,’ Setan pụrụ ịnwa ime ka anyị chịlie aka, iche na anyị erughị eru ijere Jehova ozi.—2 Ndị Kọrint 2:5-7, 11.

3 Ma nke ahụ abụghị ụzọ Jehova si ele ihe anya ma ọlị! Okwu ya na-emesi anyị obi ike na mgbe anyị gosipụtara ezi nchegharị sitere n’obi, Jehova na-achọ, ee ọ dị njikere, ịgbaghara. (Ilu 28:13) Ya mere ọ bụrụ na ọ dịwo mgbe mgbaghara Chineke yiri gị ihe aka na-apụghị iru, ikekwe ihe dị mkpa bụ nghọta ka mma nke ihe mere o ji agbaghara na otú o si eme ya.

N’ihi Gịnị Ka Jehova Ji “Na-agbaghara Mmehie”?

4. Gịnị ka Jehova na-echeta banyere ọdịdị anyị, oleekwa otú nke a si emetụta ụzọ o si emeso anyị?

4 Anyị na-agụ, sị: “Dị ka Ihu anyanwụ si dị anya n’Ọdịda anyanwụ, otú a ka O meworo ka njehie nile anyị dị anya n’ebe anyị nọ. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya.” N’ihi gịnị ka Jehova ji dị njikere ime ebere? Amaokwu nke na-eso na-aza, sị: “N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:12-14) Ee, Jehova adịghị echefu na anyị bụ ndị e ji ájá kee, na-enwe adịghị ike dị iche iche n’ihi ezughị okè. Okwu ahụ bụ na ọ maara “otú a kpụworo anyị” na-echetara anyị na Bible ji Jehova na-atụnyere ọkpụite, jirikwa anyị na-atụnyere arịa ndị ọ na-akpụ.a (Jeremaịa 18:2-6) Ọkpụite na-ejisi ite ájá ya aka ike ma n’ụzọ dị nro, na-eburu ọdịdị ha n’uche mgbe nile. N’otu aka ahụ, Jehova, Ọkpụite Ukwu ahụ, na-agbanwe mmeso ọ na-emeso anyị ikwekọ n’adịghị ike nke ọdịdị mmehie anyị.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 4:7.

5. Olee otú akwụkwọ Ndị Rom si akọwa aka siri ike mmehie ji anụ ahụ anyị na-ezughị okè?

5 Jehova na-aghọta otú mmehie si dị ike. Akwụkwọ Nsọ na-akọwa mmehie dị ka ike dị ike nke na-ejichi mmadụ n’aka ya na-egbu egbu. Ruo nnọọ ókè ha aṅaa ka aka mmehie na-eji dịruru ike? N’akwụkwọ Ndị Rom, Pọl onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ na-akọwa nke a n’okwu ndị pụtara ìhè: Anyị nọ “n’okpuru mmehie,” otú ndị agha si anọ n’okpuru ọchịagha ha (Ndị Rom 3:9); ọ ‘bụrụwo eze’ n’elu ihe a kpọrọ mmadụ (Ndị Rom 5:21); ọ “na-ebi” n’ime anyị (Ndị Rom 7:17, 20); “iwu” ya na-anọgide n’ọrụ n’ime anyị, wee si otú ahụ na-achọ ịchịkwa ụzọ anyị. (Ndị Rom 7:23, 25) Lee ọgụ siri ike anyị nwere iguzogide aka ọjọọ nke mmehie ji anụ ahụ anyị dara ada!—Ndị Rom 7:21, 24.

6. Olee otú Jehova si ele ndị ji obi nchegharị na-achọ ebere ya anya?

6 N’ihi ya, Chineke anyị dị ebere maara na nrubeisi zuru okè agaghị ekwe anyị omume, n’agbanyeghị ókè obi anyị pụrụ ịchọ irubere ya isi. (1 Ndị Eze 8:46) O ji ịhụnanya na-emesi anyị obi ike na mgbe anyị ji obi nchegharị chọọ ebere ya dị ka nna, ọ ga-agbaghara. Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru, sị: “Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.” (Abụ Ọma 51:17) Jehova agaghị ajụ, ma ọ bụ wezụga, obi nke ibu arọ ikpe ọmụma tiwara, gwepịakwa. Lee ụzọ mara mma nke ahụ si na-akọwa njikere Jehova dị ịgbaghara!

7. N’ihi gịnị ka anyị na-agaghị eji ebere Chineke mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

7 Otú ọ dị, nke a ọ̀ na-apụta na anyị pụrụ iji ebere Chineke mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-eji ọdịdị mmehie anyị na-eme ngọpụ ime mmehie? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụghị mmetụta efu na-eduzi Jehova. Ebere ya nwere ókè. Ọ gaghị agbaghara ma ọlị ndị ji ịkpọ ekwo nkụ na ọchịchọ obi na-eme ajọ mmehie, n’enweghị nchegharị. (Ndị Hibru 10:26-31) N’aka nke ọzọ, mgbe ọ hụrụ obi nke “tiwara etiwa” na nke “e gwepịara egwepịa,” ọ “na-agbaghara mmehie.” (Ilu 17:3) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime okwu ndị jupụtara ná mmetụta ndị e ji mee ihe n’ime Bible ịkọwa izu ezu nke mgbaghara Chineke.

N’ókè Hà Aṅaa Ka Mgbaghara Jehova Na-ezu Ezu?

8. Gịnị ka Jehova na-eme, dị ka a pụrụ ikwu ya, mgbe ọ gbaghaara mmehie anyị, mmetụta dịkwa aṅaa ka nke a kwesịrị inwe n’ahụ anyị?

8 Eze Devid nwere nchegharị kwuru, sị: “Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; Gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.” (Abụ Ọma 32:5, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Okwu ahụ bụ́ “bupụkwara” na-asụgharị okwu Hibru nke pụtara n’ụzọ bụ isi “bulie elu,” “nagide, buru.” Ojiji e ji ya mee ihe n’ebe a pụtara ‘iwezụga obi amamikpe, mmehie, njehie.’ N’ihi ya Jehova buliri mmehie Devid elu, bupụkwa ha, dị ka a pụrụ ikwu ya. (Tụlee Levitikọs 16:20-22.) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a belatara obi amamikpe nke Devid nọ na-enwe. (Tụlee Abụ Ọma 32:3.) Anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe obi ike zuru ezu na Chineke onye na-agbaghara mmehie ndị na-achọ mgbaghara ya ná ndabere nke okwukwe ha n’àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst. (Matiu 20:28; tụlee Aịsaịa 53:12.) Ndị ahụ Jehova si otú a na-ebuli mmehie ha elu ma na-ebupụ ha ekwesịghị ịnọgide na-ebu ibu arọ nke obi amamikpe maka mmehie gara aga.

9. Gịnị ka okwu Jisọs bụ́: “Gbagharakwa anyị ụgwọ nile anyị ji” pụtara?

9 Jisọs ji mmekọrịta nke ndị e ji ụgwọ na ndị ji ụgwọ maa atụ otú Jehova si agbaghara. Dị ka ihe atụ, Jisọs gbara anyị ume ikpe ekpere, sị: “Gbagharakwa anyị ụgwọ nile anyị ji.” (Matiu 6:12) Jisọs si otú a were “mmehie” tụnyere “ụgwọ.” (Luk 11:4) Mgbe anyị mehiere, anyị na-aghọ ‘ndị ji Jehova ụgwọ.’ Ngwaa Grik a sụgharịrị ‘gbaghara’ pụrụ ịpụta “ilefuru anya, ịhapụ, ụgwọ, site n’achọghị ka a kwụọ ya.” N’otu echiche, mgbe Jehova gbaghaara, ọ na-akagbu ụgwọ a gaara agụnyere anyị. Ndị mmehie nwere nchegharị pụrụ isi otú ahụ nwee nkasi obi. Jehova agaghị achọ ka a kwụọ ụgwọ ọ kagbuworo!—Abụ Ọma 32:1, 2; tụlee Matiu 18:23-35.

10, 11. (a) Olee echiche okwu ahụ bụ́ “hichapụ,” nke a na-achọta n’Ọrụ 3:19, na-enye? (b) Olee otú e si gosi izu ezu nke mgbaghara Jehova?

10 N’Ọrụ 3:19, Bible ji atụmatụ okwu ọzọ doro anya mee ihe ịkọwa mgbaghara Chineke: “Ya mere chegharịanụ, chigharịakwanụ, ka e wee hichapụ mmehie nile unu.” Okwu ahụ bụ́ “hichapụ” na-asụgharị ngwaa Grik nke, mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ ikwu ihe n’ụzọ pụtara ihe ọzọ, pụrụ ịpụta “ihichapụ, kpochapụ, kagbuo ma ọ bụ bibie.” Dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta si kwuo, echiche a na-enye bụ nke ihicha ihe aka dere. Olee otú nke a si kwe omume? E ji ngwakọta nke gụnyere carbon, mgbá, na mmiri mepụta ink e jikarị mee ihe n’oge ochie. Ngwa ngwa e ji ink dị otú ahụ desịa ihe, mmadụ pụrụ iji ogbo dị mmiri hichapụ ihe odide ahụ.

11 Nke a bụ nkọwa mara mma nke izu ezu nke mgbaghara Jehova. Mgbe ọ gbaghaara mmehie anyị, ọ na-adị ka o ji ogbo hichapụ ha. Ọ dịghị anyị mkpa ịtụ egwu na mmehie ndị ahụ ga-emetụta ụzọ ọ ga-esi were anyị n’ọdịnihu n’ihi na Bible na-ekpughe ihe ọzọ dị ịrịba ama n’ezie banyere ebere Jehova: Mgbe ọ gbaghaara, ọ na-echezọ!

“M Gaghị Echetakwa Mmehie Ha Ọzọ”

12. Mgbe Bible na-ekwu na Jehova na-echezọ mmehie anyị, ọ̀ na-apụta na o nweghị ike icheta ha, gịnịkwa mere i ji zaa otú ahụ?

12 Site n’ọnụ Jeremaịa onye amụma, Jehova kwere nkwa banyere ndị ahụ nọ n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, sị: “M ga-agbaghara ajọ omume ha, M gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ.” (Jeremaịa 31:34) Nke a ọ̀ pụtara na mgbe Jehova na-agbaghara, ọ naghịkwa enwe ike echeta mmehie ọzọ? Nke ahụ apụghị ịbụ ma ọlị. Bible gwara anyị mmehie nke ọtụtụ ndị Jehova gbaghaara, tinyere Devid. (2 Samuel 11:1-17; 12:1-13) O doro anya na Jehova ka maara njehie nile ha jehiere, otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ịma. E chekwawo ihe ndekọ nke mmehie ha, nakwa nke nchegharị ha na mgbaghara nke Chineke, maka abamuru anyị. (Ndị Rom 15:4) Gịnịzi ka Bible bu n’uche mgbe ọ na-ekwu na Jehova adịghị ‘echeta’ mmehie nke ndị ọ gbaghaara?

13. (a) Gịnị ka a gụnyere n’ihe ngwaa Hibru ahụ a sụgharịrị ‘m ga-echeta’ pụtara? (b) Mgbe Jehova na-asị, “M gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ,” gịnị ka ọ na-emesi anyị obi ike banyere ya?

13 Ngwaa Hibru a sụgharịrị ‘m ga-echeta’ na-enye echiche nke karịrị nanị icheta ihe gara aga. Dị ka Theological Wordbook of the Old Testament si kwuo, ọ na-agụnye “echiche ndị ọzọ nke ime ihe kwesịrị ekwesị.” Ya mere n’echiche nke a, ‘icheta’ mmehie na-agụnye ime ihe megide ndị mmehie. Mgbe Hosea onye amụma kwuru banyere ndị Israel na-agahie agahie, sị, “Ọ [Jehova] ga-echeta ajọ omume ha,” onye amụma ahụ bu n’uche na Jehova ga-eme ihe megide ha n’ihi enweghị nchegharị ha. Ya mere, ihe fọdụrụ n’amaokwu ahụ na-agbakwụnye: “Leta mmehie nile ha.” (Hosea 9:9) N’aka nke ọzọ, mgbe Jehova na-asị, “M gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ,” ọ na-emesi anyị obi ike na mgbe ọ bụla ọ gbaghaara onye mmehie nwere nchegharị, ọ gaghị emegide ya n’ọdịnihu n’ihi mmehie ndị ahụ. (Ezikiel 18:21, 22) O si otú a na-echezọ n’echiche nke na ọ dịghị ewelite mmehie anyị ọtụtụ ugboro iji taa anyị ụta ma ọ bụ taa anyị ahụhụ ugboro ugboro. Jehova si otú ahụ na-esetịpụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya iṅomi ná mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ. Mgbe nghọtahie bilitere, ọ kasị mma ịghara ịbọlite mmejọ ndị i kwetaburu ịgbaghara.

Gịnị Banyere Ihe Ndị Ọ Na-arụpụta?

14. N’ihi gịnị ka mgbaghara na-apụtaghị na a na-atọhapụ onye mmehie nwere nchegharị n’ihe nile si n’ụzọ ọjọọ ya pụta?

14 Njikere Jehova dị ịgbaghara ọ̀ na-apụta na a na-atọhapụ onye mmehie nwere nchegharị n’ihe nile na-esi na n’ụzọ ọjọọ ya pụta? Ọ dịghị ma ọlị. Anyị apụghị ime mmehie n’anataghị ntaramahụhụ. Pọl dere, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” (Ndị Galetia 6:7) Anyị pụrụ iche ihe ụfọdụ si n’omume ma ọ bụ nsogbu anyị pụta ihu, ma mgbe ọ gbagharasịịrị, Jehova adịghị eme ka ahụhụ dakwasị anyị. Mgbe nsogbu bilitere, onye Kraịst ekwesịghị iche, sị, ‘Ikekwe Jehova na-ata m ahụhụ n’ihi mmehie m meburu.’ (Tụlee Jemes 1:13.) N’aka nke ọzọ, Jehova adịghị echebe anyị pụọ ná mmetụta nile nke omume ọjọọ anyị. Ịgba alụkwaghịm, ime a na-achọghị, ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ, enwekwaghị ntụkwasị obi ma ọ bụ nkwanye ùgwù—ihe ndị a nile pụrụ ịbụ ihe mwute ndị na-esi ná mmehie apụta, Jehova agaghị echebekwa anyị pụọ n’ebe ha dị. Cheta na ọ bụ ezie na ọ gbaghaara Devid mmehie ya n’ihe banyere Bat-sheba na Uraịa, Jehova echebeghị Devid pụọ n’ajọ ihe ndị ọ rụpụtara.—2 Samuel 12:9-14.

15, 16. Olee otú iwu ahụ e dekọrọ na Levitikọs 6:1-7 si baara ma onye e mejọrọ ma onye mejọrọ uru?

15 E nwere ihe ndị ọzọ pụkwara isi ná mmehie anyị pụta. Tụlee, dị ka ihe atụ, ihe ndekọ dị na Levitikọs isi 6. Iwu Mosis n’ebe a na-ekwu banyere ọnọdụ dị mgbe mmadụ mere ajọ mmehie site n’ijichi ihe onwunwe nke onye Israel ibe ya site n’ohi, mpụnara, ma ọ bụ wayo. E mesịa onye mmehie ahụ ekwuo na ikpe amaghị ya, ọbụna nwee anyaike nke ịṅụ iyi ụgha. Ọ bụ okwu otu onye megide nke onye ọzọ. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, akọ na uche onye mmehie ahụ mara ya ikpe, o wee kwupụta mmehie ya. Iji nweta mgbaghara Chineke, ọ ghaghị ime ihe atọ ọzọ: weghachi ihe o zuru, kwụọ onye e zunaara ihe nhá 20 pasent, wetakwa ebulu ka ọ bụrụ àjà ikpe ọmụma. Mgbe ahụ, iwu ahụ na-ekwu, sị: “Onye nchụàjà ga-ekpuchikwara ya mmehie ya n’ihu Jehova, a ga-agbagharakwa ya ya.”—Levitikọs 6:1-7; tụlee Matiu 5:23, 24.

16 Iwu a bụ ndokwa ebere si n’aka Chineke. Ọ baara onye e zunaara ihe nke e weghachiiri ihe ya uru, onye ịrụ ụka na-adịghịkwa ya na ahụ ga-eru ya nnọọ ala mgbe onye mmehie ahụ kwetara mmehie ya n’ikpeazụ. N’otu mgbe ahụ, iwu ahụ bakwaara onye akọ na uche ya mesịrị duga n’ịnakwere mmehie ya, meziekwa mmejọ ya uru. N’ezie, ọ bụrụ na ọ jụrụ ime otú ahụ, ọ gaghị enwe mgbaghara Chineke.

17. Mgbe mmehie anyị wutere ndị ọzọ, gịnị ka Jehova na-atụ anyị anya n’aka ime?

17 Ọ bụ ezie na anyị anọghị n’okpuru Iwu Mosis, ọ na-enye anyị nghọta dị oké ọnụ ahịa banyere uche Jehova, tinyere echiche ya banyere mgbaghara mmehie. (Ndị Kọlọsi 2:13, 14) Mgbe mmehie anyị wutere ma ọ bụ metụta ndị ọzọ, obi na-atọ Jehova ụtọ mgbe anyị mere ihe anyị pụrụ ime iji ‘mezie mmejọ ahụ.’ (2 Ndị Kọrint 7:11, NW) Nke a na-agụnye ikweta mmehie anyị, ịnakwere ikpe ọmụma anyị, na ọbụna ịrịọ onye ahụ e mejọrọ. Mgbe ahụ anyị pụrụ ịrịọ Jehova ná ndabere nke àjà Jisọs ma nweta ahụ efe nke akọ na uche dị ọcha na mmesi obi ike bụ́ na Chineke agbagharawo anyị.—Ndị Hibru 10:21, 22.

18. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa na mgbaghara Jehova pụrụ ịyịkọ?

18 Dị ka onye mụrụ nwa nke na-ahụ n’anya, Jehova pụrụ inyetụ ịdọ aka ná ntị mgbe ọ na-agbaghara. (Ilu 3:11, 12) Onye Kraịst nwere nchegharị pụrụ ịhapụ ihe ùgwù ya nke ije ozi dị ka okenye, ohu na-eje ozi, ma ọ bụ ọsụ ụzọ. Ọ pụrụ iwute ya ịkwụsị ruo nwa oge inwe ihe ùgwù ndị dị oké ọnụ ahịa nye ya. Otú ọ dị, ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ apụtaghị na ọ tụfuwo ihu ọma Jehova ma ọ bụ na Jehova ajụwo ịgbaghara. Ọzọkwa, anyị aghaghị icheta na ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Jehova bụ ihe àmà nke ịhụnanya ọ hụrụ anyị. Ịnakwere na itinye ya n’ọrụ bụ maka ọdịmma anyị kasị mma, ọ pụkwara iduga ná ndụ ebighị ebi.—Ndị Hibru 12:5-11.

19, 20. (a) Ọ bụrụ na i mewo ihe ọjọọ, n’ihi gịnị ka ị na-ekwesịghị iche na Jehova apụghị imere gị ebere? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Lee otú o si bụrụ ihe na-enye obi ike na anyị na-efe Chineke nke “na-agbaghara mmehie”! Jehova na-ahụ ihe karịrị mmehie na ihie ụzọ anyị. (Abụ Ọma 130:3, 4) Ọ maara ihe dị n’obi anyị. Ọ bụrụ na i chere na obi gị tiwara etiwa, gwepịakwa egwepịa n’ihi mmejọ gara aga, ekpebila na Jehova apụkwaghị imere gị ebere. N’agbanyeghị ihie ụzọ ndị ị pụworo ihie, ọ bụrụ na i chegharịwo n’ezie, were nzọụkwụ imezi mmejọ ahụ, kpesiekwa ekpere ike maka mgbaghara Jehova ná ndabere nke ọbara Jisọs a wụsịrị, ị pụrụ inwe obi ike zuru ezu na okwu 1 Jọn 1:9 metụtara gị: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, Ọ bụ Onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa Onye ezi omume, ka O wee gbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume nile.”

20 Bible na-agba anyị ume iṅomi mgbaghara Jehova ná mmekọrịta anyị na ibe anyị. Otú ọ dị, n’ókè hà aṅaa ka a pụrụ ịtụ anya na anyị ga-agbaghara ma chezọọ mgbe ndị ọzọ mehiere anyị? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ dị mma ịmara na e ji okwu Hibru ahụ a sụgharịrị “otú a kpụworo anyị” mee ihe banyere arịa ájá nke ọkpụite kpụrụ.—Aịsaịa 29:16.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka Jehova ji “na-agbaghara mmehie”?

◻ Olee otú Bible si akọwa izu ezu nke mgbaghara Jehova?

◻ Mgbe Jehova gbaghaara, n’echiche dị aṅaa ka ọ na-echezọ?

◻ Gịnị ka Jehova na-atụ anya ka anyị mee mgbe mmehie anyị wutere ndị ọzọ?

[Foto dị na peeji nke 12]

Mgbe mmehie anyị wutere ndị ọzọ, Jehova na-atụ anya ka anyị mezie ihe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya