Isi nke 18
Ala Ọma Jijiji n’Ụbọchị Onyenwe Anyị
1, 2. (a) Olee otú ọ na-adị ịhụ mgbe e nwere oké ala ọma jijiji? (b) Gịnị ka Jọn kọwara mgbe e meghere akara nke isii ahụ?
Ọ̀ DỊWO mgbe ị nọrọ ebe e nwere ala ọma jijiji siri ike? Ọ bụghị ahụmahụ dị ụtọ. Nnukwute ala ọma jijiji pụrụ iji mkpọtụ na-eyi egwu malite. Otú ihe nile si adagharị pụrụ ịdịwanye njọ nke ukwuu mgbe ị na-agbagharị ịchọ ebe ị ga-ezobe onwe gị—ma eleghị anya n’okpuru oche. Ọ pụkwara ịbịa dị ka oké nnugharị mberede, nke ihe sochiri ya bụ ntiwasị nke efere, ihe ndị dị n’ụlọ, ọbụna ụlọ dị iche iche. Ihe o bibiri pụrụ ihi nne nke ukwuu, ahụ ịma jijiji a na-enwe mgbe ọ gasịrị na-emekwa ka ọnọdụ ọjọọ ahụ dịkwuo njọ.
2 N’iburu nke a n’uche, tụlee ihe Jọn kọwara mgbe e meghere akara nke isii ahụ: “M wee hụ mgbe ọ saghere akara nke isii, oké ala ọma jijiji wee daa.” (Mkpughe 6:12a) Nke a aghaghị ịdaba n’otu agbata oge ahụ dị ka mmeghe nke akara ndị nke ọzọ. Kpọmkwem olee mgbe n’ime ụbọchị Onyenwe anyị ahụ ka ala ọma jijiji nke a dara, ụdị ịma jijiji dị aṅaa ka ọ bụkwa?—Mkpughe 1:10.
3. (a) Ihe omume dịgasị aṅaa ka Jisọs kwuru na ha gaje ime n’amụma ya banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya? (b) Njikọ dị aṅaa dị n’etiti ala ọma jijiji ndị nkịtị na oké ala ọma jijiji ihe atụ ahụ e kwuru banyere ya ná Mkpughe 6:12?
3 A kpọtụrụ aha ala ọma jijiji dị iche iche ma ndị nke nkịtị ma ndị nke ihe atụ n’ebe dị iche iche n’ime Bible. N’oké amụma ya banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya n’ike Alaeze, Jisọs buru amụma na “ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” Ndị a ga-abụ akụkụ nke “mmalite ihe mgbu.” Kemgbe 1914, ka ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa na-aba ụba nke ukwuu na-eru ọtụtụ ijeri mmadụ, ọtụtụ ala ọma jijiji nkịtị emewo ka ihe isi ike nke oge anyị a jọwanye njọ n’ụzọ pụtara ìhè. (Matiu 24:3, 7, 8) Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ha na-emezu amụma, ala ọma jijiji ndị ahụ abụwo ọdachi nkịtị ndị mere n’ụzọ a hụrụ anya. Ha bụ ndị a ga-enwe tupu oké ala ọma jijiji ihe atụ ahụ nke Mkpughe 6:12. N’ezie, nke a na-abịa dị ka ihe omume ikpeazụ na-eweta oké mbibi, nke ga-achịkọta ala ọma jijiji ndị bu ụzọ na-akwagharị usoro ihe Setan nke ụmụ mmadụ nọ n’elu ala mejupụtara ruo na ntọala ya nile.a
Nnugharị Ndị E Nwere n’Òtù Ụmụ Mmadụ
4. (a) Eri olee mgbe ka ndị Jehova malitere ịtụ anya na ihe ndị na-akpata mbibi ga-amalite ime na 1914? (b) Ogologo oge dị aṅaa ka 1914 ga-aka akara ọgwụgwụ ya?
4 Site n’etiti afọ ndị 1870, ndị Jehova anọwo na-atụ anya na ihe ndị na-akpata mbibi ga-amalite ime na 1914, na ha ga-akakwa akara ọgwụgwụ nke Oge ndị Jentaịl. Nke a bụ ogologo “oge asaa” (2,520 afọ) nke malitere site ná nkwatu nke alaeze Devid dị na Jerusalem n’afọ 607 T.O.A. ruo nnọkwasị Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze na Jerusalem eluigwe na 1914 O.A.—Daniel 4:24, 25; Luk 21:24, King James Version.b
5. (a) Ọkwa dị aṅaa ka C. T. Russell mara n’October 2, 1914? (b) Ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị dịgasị aṅaa meworo kemgbe 1914?
5 N’ihi ya, mgbe C. T. Russell pụtara maka ofufe ụtụtụ nke ya na ezinụlọ Betel dị na Brooklyn, New York, n’ụtụtụ nke October 2, 1914, ọ mara ọkwa ahụ na-akpali akpali, bụ́: “Oge ndị Jentaịl agwụsịwo; ụbọchị nile nke ndị eze ha agabigawo.” N’eziokwu, ọgba aghara zuru ụwa ọnụ nke malitere na 1914 siri oké ike nke na e bibiri ọtụtụ usoro ndị eze kpam kpam. Nkwatu nke usoro ndị eze ná mgbanwe ọchịchị ndị Bolshevik ahụ nke 1917 mere ka usoro ọchịchị kọmunist nke Marx na nke ndị aka ji akụ nwee esemokwu ruo ogologo oge. Ala ọma jijiji nke mgbanwe usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọgidere na-enye òtù ụmụ mmadụ nsogbu gburugburu ụwa. Taa, ọtụtụ ọchịchị anaghị adịru otu afọ ma ọ bụ abụọ. E mere ihe atụ nke eguzosighị ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihe banyere Itali, nke nweworo ọchịchị ọhụrụ 47 n’ime afọ 42 kemgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ. Otú ọ dị, obere nkwagharị ndị a na-ebu ụzọ eme bụ nanị ihe mgbaàmà nye oké ọgba aghara a gaje inwe n’ọchịchị. Gịnị ga-esi na ya pụta? Alaeze Chineke ga-eweghara ike wee bụrụ nanị nke na-achị ụwa.—Aịsaịa 9:6, 7.
6. (a) Olee otú H. G. Wells si kọwaa oge ọhụrụ ahụ dị oké egwu? (b) Gịnị ka otu onye ọkà nchepụta echiche na otu onye nnọchianya ọchịchị dere banyere oge ahụ malitere na 1914?
6 Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, ndị ọkà nchepụta echiche, na ndị ndú ọchịchị ezowo aka na 1914 dị ka mmalite nke oge ọhụrụ pụrụ iche. Mgbe afọ 17 nke oge ahụ gasịrị, odeakụkọ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells dere, sị: “Ọ ga-amasị nnọọ onye amụma ahụ ibu amụma banyere ihe ndị dị mma. Ma ọrụ ya bụ ikwu ihe ọ hụrụ. Ọ hụrụ ụwa nke ka nọgidesiri ike n’aka ndị agha, ndị hụrụ mba nke ha n’anya, ndị anyaukwu, na ndị ji ego achụ ego; ụwa ebe onye ọ bụla na-enyo ibe ya enyo, jupụtakwa n’ịkpọasị, ebe ihe nile fọdụrụ ná mmadụ inwere onwe ya na-apụ n’anya ngwa ngwa, nke sọọrọ ìsì na-eje n’ịkpa iche iche n’ihi ọkwá, na-akwadebekwa maka agha ndị ọhụrụ.” Na 1953, onye ọkà nchepụta echiche bụ́ Bertrand Russell dere, sị: “Kemgbe 1914, onye ọ bụla maara ihe na-aga n’ụwa enweela mwute dị ukwuu n’ihi ihe yiworo ịzọ ije e bu ụzọ kaa aka ijeru ọdachi ka ukwuu. . . . Ha na-ahụ agbụrụ mmadụ dị ka dike nke akụkọ ọdachi ndị Grik, nke chi ndị iwe ji na-achụgharị, onye na-abụkwaghị ya na-achịkwa ihe na-eme ya.” Na 1980, otu onye ji ọkwá dị elu n’ọchịchị bụ́ Harold Macmillan, mgbe ọ na-atụgharị uche n’ọnọdụ udo nke narị afọ nke 20 ji malite, kwuru, sị: “Ihe nile ga na-adịwanye mma. Nke ahụ bụ ụwa a mụnyere m n’ime ya. . . . Ná mberede, n’oge a na-atụghị anya ya, n’otu ụtụtụ na 1914, ihe nile ahụ bịaruru njedebe ya.”
7-9. (a) Ọgba aghara dịgasị aṅaa metụtaworo òtù ụmụ mmadụ kemgbe 1914? (b) Ọgba aghara ndị dị n’etiti òtù ụmụ mmadụ n’oge ọnụnọ Jisọs ga-emesị gụnye ọnọdụ dị aṅaa n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ?
7 Agha Ụwa nke Abụọ wetara usoro ọgba aghara ndị ọzọ. Ụmụ obere agha nakwa iyi ọha egwu anọgidewo na-akwagharị ụwa. Oké iyi egwu nke ndị na-eyi ọha egwu ma ọ bụ mba ndị nwere ngwá agha ọgwụrụ mba emewo ka ọtụtụ mmadụ na-eche echiche.
8 Otú ọ dị, ihe ndị ọzọ na-abụghị agha emewokwa ka òtù ụmụ mmadụ mee mkpatụ ruo ntọala ya nile kemgbe 1914. Oké ndakpọ nke ahịa ụlọ ahịa dị iche iche nke mba U.S. dakpọrọ n’October 29, 1929, kpaliri otu n’ime ọgba aghara ndị kasị ukwuu. Nke a kpọbatara Oké Ndakpọ ahụ, nke metụtara mba nile na-agbaso usoro ọchịchị ndị aka ji akụ. Oké ndakpọ ahụ gwụsịrị n’agbata afọ 1932 na 1934, ma anyị ka na-enwe mmetụta ya. Kemgbe 1929, e jiriwo atụmatụ ndị ụkwụ na-esichaghị ike n’ala na-akwado ụwa nke nọ n’ọnọdụ akụ na ụba dị njọ. Ọchịchị dị iche iche nọ na-eme atụmatụ imefu ego karịrị nke ha nwere. Ọgba aghara ahịa mmanụ nke 1973 na ndakpọ nke ụlọ ahịa dị iche iche na 1987 kpatakwara nnugharị nke usoro akụ na ụba. Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ nde mmadụ na-azụrụ ihe n’akwụghị ụgwọ ozugbo. Ọtụtụ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ na-abụkwa ndị e ji atụmatụ akụ na ụba dị iche iche aghọgbute, atụmatụ iji ego nta nweta ego dị ukwuu, igwu lottery na ụzọ ịgba chaa chaa ndị ọzọ, nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị gọọmentị na-akwado ha, bụ́ ndị kwesịrị ichebe ndị mmadụ pụọ n’aghụghọ ndị dị otú ahụ. Ọbụna ndị Krisendọm na-ekwu okwuchukwu na telivishọn na-esetịpụkwa aka ha ịnara òkè ha nke ruru ọtụtụ ijeri naira!—Tụlee Jeremaịa 5:26-31.
9 Tupu ihe ndị a, nsogbu akụ na ụba megheere Mussolini na Hitler ụzọ iweghara ike ọchịchị. Babilọn Ukwu ahụ atụfughị oge ọ bụla ịchọ ihu ọma ha, mba Vatican banyekwara ná nkwekọrịta dị iche iche ya na Itali na 1929, ya na Germany na 1933. (Mkpughe 17:5) Oge oké ọchịchịrị nke sochirinụ bụ n’ezie akụkụ nke mmezu amụma Jisọs banyere ọnụnọ ya, nke ga-emesị gụnye ‘mkpagbu nke mba dị iche iche, ndị na-amaghị ụzọ mgbapụ . . . ebe mmadụ na-atụbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi.’ (Luk 21:7-9, 25-31)c Ee, ala ọma jijiji ndị malitere ịkwagharị òtù ụmụ mmadụ na 1914 agawo n’ihu, na-ahapụ mmetụta ndị siri ike n’ahụ ụmụ mmadụ.
Jehova Emee Ka Ala Mee Mkpatụ
10. (a) N’ihi gịnị ka e ji enwe ọtụtụ nnugharị n’ihe omume mmadụ? (b) Gịnị ka Jehova na-eme, ọ̀ bụkwa iji kwadebe maka gịnị?
10 Ihe na-akpata ịma jijiji dị otú ahụ n’ihe omume mmadụ bụ n’ihi na mmadụ enweghị ike iduzi nzọụkwụ nke ya. (Jeremaịa 10:23) Karịsịa, agwọ ochie ahụ, bụ́ Setan, “onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi,” na-akpata ahụhụ dị iche iche ná mgbalị ikpeazụ ya ịdọrọ ụmụ mmadụ pụọ n’ife Jehova. Nkànụzụ ọgbara ọhụrụ emewo ka ụwa bụrụ otu ógbè dị nta, ebe ịhụ mba n’anya na ịkpọasị nke agbụrụ na-akpa òtù ụmụ mmadụ aka ọjọọ ruo na ntọala ya nile, òtù United Nations kwa, dị ka a na-akpọ ya, apụghị ịchọta ngwọta ọ bụla dị irè. Dị ka ọ na-adịbeghị mbụ, mmadụ na-enwe ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya. (Mkpughe 12:9, 12; Eklisiastis 8:9) N’agbanyeghị nke ahụ, Eze Onyenwe anyị Jehova, Onye Mere eluigwe na ala, anọgidewo na-eme ka ụwa mee mkpatụ n’ụzọ nke ya ruo afọ 90, ná nkwadebe iji dozie nsogbu nile nke ụwa nanị otu ugbo. N’ụzọ dị aṅaa?
11. (a) Gịnị bụ ime ka ala mee mkpatụ nke a kọwara na Hagaị 2:6, 7? (b) Olee ụzọ e si na-emezu amụma Hagaị?
11 Na Hagaị 2:6, 7 anyị na-agụ, sị: “N’ihi na otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa mgbe nta ka ọ bụ, mụ onwe gaje ime ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala kpọrọ nkụ mee mkpatụ; m ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, m ga-emejukwa ụlọ m n’ebube, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” Karịsịa, kemgbe afọ 1919, Jehova emewo ka ndịàmà ya kpọsaa ikpe ya n’etiti ihe nile mejupụtara òtù ụmụ mmadụ dị n’elu ala. E mewo ka usoro ihe elu ala nke Setan nụ ịdọ aka ná ntị nke a zuru ụwa ọnụ.d Ka ịdọ aka ná ntị ahụ na-esiwanye ike, ụmụ mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke, bụ́ “ihe a na-achọsi ike nke mba nile,” abụrụwo ndị a kpaliri ikewapụ onwe ha site ná mba nile. Ọ bụghị na a na-ayọchapụta ha site n’ime ka nzukọ Setan mee mkpatụ. Kama, ka ha na-aghọta ọnọdụ ahụ, ha na-eme mkpebi n’onwe ha isoro òtù Jọn ahụ e tere mmanụ kere òkè n’iji ebube mejupụta ụlọ ofufe nke Jehova. Olee ụzọ e si na-emezu nke a? Site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ nke Alaeze Chineke e guzobeworo. (Matiu 24:14) Alaeze nke a, nke ihe mejupụtara ya bụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, ga-eguzosi ike na-ewetara Jehova otuto dị ka “alaeze nke a na-apụghị ime ka o mee mkpatụ.”—Ndị Hibru 12:26-29.
12. Ọ bụrụ na ị malitewo ịnụ ozi ọma nke e buru amụma ya na Matiu 24:14, gịnị ka i kwesịrị ime tupu oké ala ọma jijiji ahụ nke dị ná Mkpughe 6:12 emee?
12 Ị̀ bụ onye maliteworo ige ntị n’ozi ọma ahụ? Ì so, ma eleghị anya n’ọtụtụ nde mmadụ ndị jeworo Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga? Ya bụrụ otú ahụ, nọgide na-enwe ọganihu n’ọmụmụ ị na-amụ eziokwu Bible. (2 Timoti 2:15; 3:16, 17) Gbakụta ụzọ ndụ rụrụ arụ nke òtù ụmụ mmadụ a maworo ikpe mbibi ndị nọ n’ime ụwa Setan azụ kpam kpam! Bata kpọmkwem n’ime òtù ụwa ọhụrụ nke ndị Kraịst, kerekwa òkè n’ụzọ zuru ezu n’ọrụ ya nile tupu “ala ọma jijiji” ikpeazụ ahụ etipịasịa ụwa Setan dum. Ma gịnị bụ oké ala ọma jijiji ahụ? Ka anyị lee ugbu a.
Oké Ala Ọma Jijiji Ahụ!
13. N’ụzọ dị aṅaa ka oké ala ọma jijiji ahụ si bụrụ nnọọ ihe ọhụrụ n’ahụmahụ mmadụ?
13 Ee, mgbe ikpeazụ nke a dị oké egwu abụwo oge e nwere ọtụtụ ala ọma jijiji—nke nkịtị na nke ihe atụ. (2 Timoti 3:1) Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị a bụ oké ala ọma jijiji ikpeazụ ahụ Jọn hụrụ mgbe e meghere akara nke isii ahụ. Oge a ga-enwe obere ala ọma jijiji ndị nọ dị ka ihe mgbaàmà agabigawo. Ihe a gaje inwe ugbu a bụ oké ala ọma jijiji nke bụ nnọọ ihe ọhụrụ n’ahụmahụ mmadụ. Ọ dị ukwuu hie nne nke na a pụghị iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Richter ma ọ bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla ọzọ mmadụ mepụtara tụọ ọgba aghara na nnugharị ndị ọ ga-akpata. Nke a abụghị mkpatụ a gaje inwe nanị n’otu ógbè, kama ọ ga-abụ oké ala ọma jijiji nke gaje ibibi “elu ụwa” dum, ya bụ, òtù rụrụ arụ nke ụmụ mmadụ dum.
14. (a) Olee amụma nke kwuru banyere otu oké ala ọma jijiji na ihe ndị ga-esi na ya pụta? (b) Na gịnị ka amụma Joel na Mkpughe 6:12, 13 na-aghaghị izo aka?
14 Ndị amụma Jehova ndị ọzọ buru amụma banyere ala ọma jijiji dị otú a na mbibi ọ ga-eweta. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka afọ 820 T.O.A., Joel kwuru okwu banyere ‘ọbịbịa nke ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu,’ na-ekwu na n’oge ahụ, “anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara.” O mesịrị kwuo okwu ndị a, sị: “Ọtụtụ ìgwè mmadụ, ọtụtụ ìgwè mmadụ n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe! N’ihi na ụbọchị Jehova dị nso n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe. Anyanwụ na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achịkọpụwokwa onwunwu ha. Jehova ga-esikwa na Zaịọn bigbọọ, mee ka olu ya si na Jerusalem daa; eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ: ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba, ọ ga-abụkwara ụmụ Israel ebe siri ike.” (Joel 2:31; 3:14-16) Ime ka ala mee mkpatụ nke a aghaghị ịbụ nanị metụta mmezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe n’oge mkpagbu ukwu ahụ. (Matiu 24:21) Mgbe ahụ, ihe ndekọ ahụ yiri ya nke dị ná Mkpughe 6:12, 13 aghaghịkwa inwe otu nkọwa ahụ.—Leekwa Jeremaịa 10:10; Zefanaịa 1:14, 15.
15. Oké mkpatụ dị aṅaa ka onye amụma bụ Habakuk buru amụma ya?
15 N’ihe dị ka 200 afọ mgbe oge Joel gasịrị, onye amụma bụ Habakuk kwuru mgbe ọ na-ekpeku Chineke ekpere, sị: “Jehova, anụwo m ihe a nụrụ banyere gị, m tụọ egwu: Jehova, tụtee ọrụ gị n’etiti afọ nile, n’etiti afọ nile ka ị ga-eme ka a mara ya; n’oké iwe cheta obi ebere.” Gịnị ka “oké iwe” ahụ ga-abụ? Habakuk gara n’ihu inye nkọwa pụtara ìhè banyere mkpagbu ukwu ahụ, na-ekwu banyere Jehova, sị: “O guzoro, wee tụọ ụwa; o lere anya, wee mee ka mba nile kụja. . . . N’oké iwe ka ị na-azọ ije n’ala, n’iwe ka ị na-azọcha mba dị iche iche dị ka ọka. Ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, m ga-etegharị egwu ọṅụ n’ime Chineke nke nzọpụta m.” (Habakuk 3:1, 2, 6, 12, 18) Lee nnọọ oké mkpatụ Jehova ga-eme n’elu ala dum mgbe ọ ga-azọcha mba nile dị ka ọka!
16. (a) Gịnị ka onye amụma bụ Ezikiel buru amụma ya maka oge mgbe Setan ga-eme mbuso agha ikpeazụ ya megide ndị Chineke? (b) Gịnị ga-esi n’oké ala ọma jijiji nke Mkpughe 6:12 pụta?
16 Ezikiel bukwara amụma na mgbe Gọg nke Megọg (Setan ahụ e wedaworo n’ala) buliri mbuso agha ikpeazụ ya megide ndị Chineke, Jehova ga-eweta “ime mkpatụ ukwu . . . n’elu ala Israel.” (Ezikiel 38:18, 19) Ọ bụ ezie na ndị a pụrụ ịgụnye ala ọma jijiji nkịtị, anyị kwesịrị icheta na e gosiri Mkpughe ahụ dị ka ihe àmà dị iche iche. Amụma nke a na amụma ndị ọzọ a kpọtụrụ uche n’ebe a pụtara n’ụzọ ihe atụ ruo n’ókè dị ukwuu. N’ihi ya, o yiri ka mmeghe nke akara nke isii ahụ ọ̀ na-egosi ọgwụgwụ nke mkpatụ nile a ga-eme ka o mee n’usoro ihe elu ala nke a—oké ala ọma jijiji ahụ nke a ga-eji bibie mmadụ nile na-emegide ọbụbụeze Jehova Chineke.
Oge Ọchịchịrị
17. Olee otú oké ala ọma jijiji ahụ ga-esi metụta anyanwụ, ọnwa, na kpakpando?
17 Dị ka Jọn gara n’ihu igosi, ihe ga-esochi oké ala ọma jijiji ahụ bụ ihe ndị na-eyi egwu ndị ga-emetụta ọbụna eluigwe n’onwe ha. Ọ sịrị: “Anyanwụ wee ghọọ oji dị ka ákwà mkpe na-eji nji nke e ji ajị anụ kpaa, e wee mee ọnwa ka ọ dịzuo ka ọbara: kpakpando nile nke eluigwe wee daa ruo ala, dị ka osisi fig na-atụpụ mkpụrụ ya na-achaghị acha, mgbe oké ifufe na-efegharị ya.” (Mkpughe 6:12b, 13) Lee nnọọ oké ihe omume nke a bụ! Ị̀ pụrụ iche echiche ụdị ọchịchịrị na-eyi egwu a gaje inwe ma ọ bụrụ na amụma ahụ emezuo n’ụzọ nkịtị? A gaghị enwekwa ìhè anyanwụ na-ekpo ọkụ n’ehihie! A gaghị enwekwa ìhè ọnwa dị mma, nke yiri ọlaọcha n’anyasị! Ọtụtụ ìgwè kpakpando agaghị egbukepụkwa na mbara igwe dị oji. Kama nke ahụ, a gaje inwe oké ọchịchịrị jụrụ oyi.—Tụlee Matiu 24:29.
18. N’ụzọ dị aṅaa ka ‘eluigwe si gbaa ọchịchịrị’ nye Jerusalem n’afọ 607 T.O.A.?
18 N’ụzọ ime mmụọ, e buru amụma nke ọchịchịrị dị otú ahụ banyere Israel oge ochie. Jeremaịa dọrọ aka ná ntị, sị: “Ebe tọgbọrọ n’efu ka ala nke a nile ga-abụ; ma m gaghị eme ka ọ gwụsịa. N’ihi nke a ka ụwa ga-eru újú, eluigwe nke dị n’elu ga-ejikwa nji.” (Jeremaịa 4:27, 28) N’afọ 607 T.O.A. mgbe amụma ahụ mezuru, ndị Jehova nọ n’ọchịchịrị n’ezie. Isi obodo ha bụ Jerusalem dabara n’aka ndị Babilọn. E bibiri ụlọ nsọ ha, meekwa ka ala ha tọgbọrọ n’efu. Nye ha, e nweghị ìhè ọ bụla na-enye nkasi obi site n’eluigwe. Kama nke ahụ, ọ bụ dị ka Jeremaịa ji iru újú gwa Jehova, sị: “I gbuwo, i nweghị ọmịiko. I werewo igwe ojii kpuchie onwe gị, ka ekpere anyị ghara ịgabiga.” (Abụ Akwa 3:43, 44) Nye Jerusalem, ọchịchịrị eluigwe nke ahụ pụtara ọnwụ na mbibi.
19. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka onye amụma Chineke bụ Aịsaịa si kọwaa ọchịchịrị nke dị n’eluigwe n’ihe banyere Babilọn oge ochie? (b) Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka e si mezuo amụma Aịsaịa ahụ?
19 Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọchịchịrị eluigwe dị otú ahụ gbara àmà mbibi nye Babilọn oge ochie. Banyere nke a, a kpaliri onye amụma Chineke ide, sị: “Lee, ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị na-enweghị obi ebere, na-abịa, ya na nrubiga ókè nke iwe na iwe dị ọkụ; ime ka ala nke a ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu na ikpochapụ ndị mmehie n’ime ya. N’ihi na kpakpando nile nke eluigwe na Orion ha nile agaghị eme ka ìhè ha nwuo: anyanwụ ga-agba ọchịchịrị n’ọwụwa ya, ọzọ, ọnwa agaghị eme ka ìhè ya tie. M ga-ewerekwa ihe ọjọọ ya leta elu ụwa dum mmadụ bi, werekwa ajọ omume ha leta ndị na-emebi iwu.” (Aịsaịa 13:9-11) Amụma nke a mezuru n’afọ 539 T.O.A. mgbe Babilọn dabara n’aka ndị Midia na ndị Peasia. Ọ kọwara n’ụzọ dị mma ọchịchịrị ahụ, enweghị olileanya, enweghị ìhè ọ bụla na-enye nkasi obi nke bịakwasịrị Babilọn mgbe ọ na-ada ruo mgbe ebighị ebi site n’ọnọdụ ya nke ịbụ ọchịchị bụ isi n’elu ụwa.
20. Ihe egwu dị aṅaa na-echere usoro ihe nke a mgbe oké ala ọma jijiji ahụ tiwapụrụ?
20 N’ụzọ dị otú ahụ, mgbe oké ala ọma jijiji ahụ mere, a gaje ịtụba usoro ihe nile nke ụwa nke a n’ọnọdụ ọjọọ nke ọchịchịrị zuru ebe nile. Ihe ndị na-egbukepụ egbukepụ, ndị na-enye ìhè nke usoro ihe Setan dị n’elu ala agaghị enye ìhè ọ bụla nke olileanya. Ka ọ dị ugbu a, ndị ndú ọchịchị, karịsịa n’ime Krisendọm, bụ ndị a ma ama n’ihi ịrụ arụ ha, ịgha ụgha, na ndụ na-adịghị ọcha ha na-ebi. (Aịsaịa 28:14-19) A pụkwaghị ịtụkwasị ha obi ọzọ. Ìhè ha nke na-adịghị enwusi ike ga-adanyụ kpam kpam mgbe Jehova mezuru ihe o kpere n’ikpe. A gaje ikpughe ike ha nke dị ka ìhè nke ọnwa, bụ́ nke ha nweworo n’ihe ndị na-eme n’ụwa dị ka nke jupụtara n’ọbara, nke na-eweta ọnwụ. A gaje imenyụsị ndị ọkà a ma ama n’etiti ha dị ka ibe nkume mbara igwe ndị na-ada n’ala, dịkwa ka mkpụrụ fig na-achaghị acha si adasị n’oge ifufe. Elu ala anyị dum ga-eme mkpatụ n’okpuru ‘mkpagbu ukwu nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe ahụ, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.’ (Matiu 24:21) Lee nnọọ olileanya dị egwu nke a bụ!
E Kewapụrụ “Eluigwe”
21. N’ọhụụ ya, gịnị ka Jọn hụrụ banyere “eluigwe” na “ugwu nile na agwaetiti nile ọ bụla”?
21 Ọhụụ Jọn gara n’ihu, sị: “E wee kewapụ eluigwe dị ka akwụkwọ odide mgbe a na-apịakọta ya; e wee wepụ ugwu nile na agwaetiti nile ọ bụla n’ọnọdụ ha.” (Mkpughe 6:14) O doro anya na ndị a abụghị eluigwe nkịtị ma ọ bụ ugwu na agwaetiti nkịtị dị iche iche. Ma, gịnị ka ha bụ ihe atụ ha?
22. N’Edọm, ụdị “eluigwe” dị aṅaa ka a ‘pịakọtara dị ka akwụkwọ odide’?
22 N’ihe banyere “eluigwe,” a na-enyere anyị aka ịghọta ya site n’otu amụma ọzọ yiri nke a nke na-ekwu banyere iwe Jehova megide mba nile: “Usuu nile nke ihe eluigwe ga-edekwa, a ga-apịakọtakwa eluigwe dị ka akwụkwọ odide.” (Aịsaịa 34:4) N’ụzọ pụtakarịsịrị ìhè, Edọm gaje ịta ahụhụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ndị Babilọn meriri ya n’oge na-adịghị anya mgbe e bibisịrị Jerusalem n’afọ 607 T.O.A. N’oge ahụ, e nweghị oké ihe omume ndị e dekọrọ na ha mere n’eluigwe nkịtị. Ma e nwere oké mbibi ‘n’eluigwe’e nke Edọm. A kwaturu ọchịchị mmadụ ha site n’ọnọdụ ha dị elu dị ka n’eluigwe. (Aịsaịa 34:5) ‘A pịakọtara’ ha wee debe ha n’ụsọ, dị ka a pụrụ ikwu ya, dị ka akwụkwọ mpịakọta ochie nke na-abaghịkwara onye ọ bụla uru.
23. Gịnị bụ “eluigwe” ahụ nke ‘a ga-ewepụ dị ka akwụkwọ odide,’ oleekwa otú okwu Pita si kwadoo nghọta nke a?
23 Ya mere, “eluigwe” ahụ nke a gaje ‘iwepụ dị ka akwụkwọ odide’ na-ezo aka n’ọchịchị ndị na-emegide Chineke ndị na-achị ụwa nke a. Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ gaje iwepụ ha ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 19:11-16, 19-21) E mesiri nke a ike site n’ihe Pita onyeozi kwuru mgbe ọ na-elepụ anya maka ihe omume ndị mmeghe nke akara nke isii ahụ sere onyinyo ha: “Eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ . . . ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:7) Ma gịnị banyere okwu ahụ bụ “e wee wepụ ugwu nile na agwaetiti nile ọ bụla n’ọnọdụ ha”?
24. (a) Olee mgbe, n’amụma Bible, ka e kwuru na a ga-eme ka ugwu na agwaetiti dị iche iche mee mkpatụ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ‘ugwu si mee mkpatụ’ mgbe Nineve dara?
24 N’amụma Bible, a na-ekwukarị na oké ugwu na agwaetiti dị iche iche na-eme mkpatụ ma ọ bụ bụrụ ndị e nugharịrị n’ụzọ ọzọ n’oge oké ọgba aghara nke ọchịchị. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-ebu amụma banyere ikpe Jehova megide Nineve, onye amụma ahụ bụ Nehum dere, sị: “Ugwu nile emewo mkpatụ site na ya, ugwu nta nile agbazewokwa; ala wee bulie onwe ya site n’ihu ya.” (Nehum 1:5) E nweghị ihe ndekọ ọ bụla banyere ntiwa nke oké ugwu efu mgbe Nineve mesịrị daa n’afọ 632 T.O.A. Ma, otu alaeze ụwa nke yiburu oké ugwu n’ihi ike ya dara na mberede.—Tụlee Jeremaịa 4:24.
25. N’ọgwụgwụ usoro ihe nke a nke na-abịanụ, n’ụzọ dị aṅaa ka a ga-esi wepụ “ugwu nile na agwaetiti nile ọ bụla” n’ọnọdụ ha?
25 N’ihi nke a, “ugwu nile na agwaetiti nile ọ bụla” dị ka a kpọtụrụ uche mgbe e meghere akara nke isii ahụ aghaghị ịbụ ọchịchị dị iche iche na òtù dị iche iche nke ụwa nke a ndị dabeere na ha, ndị yiworo ihe ndị guzosiri ike nye ọtụtụ ndị n’etiti ụmụ mmadụ. A ga-eme ka ha mee mkpatụ wee pụọ n’anya kpam kpam, na-abụ oké ihe ijuanya na egwu nye ndị ahụ tụkwasịworo obi na ha. Ọ gaghị abụ ihe a na-enyo enyo, dị ka amụma ahụ gara n’ihu ịkọ, na oké ụbọchị nke iwe Jehova na nke Ọkpara ya—bụ́ nnugharị ikpeazụ nke ga-ewepụ nzukọ Setan kpam kpam—ejiriwo ịbọ ọ́bọ̀ bịa!
“Dakwasịnụ Anyị, Zopụ Anyị”
26. Olee otú mmadụ ndị na-emegide ọbụbụeze Chineke ga-esi mee ihe n’oké egwu ha, okwu dị aṅaa nke na-egosipụta oké egwu ka ha ga-ekwupụtakwa?
26 Okwu Jọn gara n’ihu, sị: “Ndị eze nke ụwa, na ndị amadị, na ndị isi ọchịagha, na ndị ọgaranya, na ndị dị ike, na ohu ọ bụla, na onye ọ bụla nweere onwe ya, wee zobe onwe ha n’ime ọgba na n’ime oké nkume nke ugwu; ha na-asịkwa ugwu na oké nkume ahụ, Dakwasịnụ anyị, zopụ anyị n’ihu Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, zopụkwa anyị n’iwe nke Nwa Atụrụ ahụ: n’ihi na oké ụbọchị nke iwe ha abịawo; ònye pụkwara iguzo?”—Mkpughe 6:15-17.
27. Mkpu dịgasị aṅaa ka ndị Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi na Sameria tiri, è sikwa aṅaa mezuo okwu ndị ahụ?
27 Mgbe Hosea na-ama ọkwa ikpe Jehova megide Sameria, bụ́ isi obodo nke alaeze ebe ugwu nke Israel, ọ sịrị: “A ga-ekpochapụkwa ebe nile dị elu nke Even, bụ́ mmehie Israel: ogwu na uke ga-epulite n’ebe ịchụàjà nile ha; ha ga-asịkwa ugwu nile, Kpuchienụ anyị; ha ga-asịkwa ugwu nta nile, Dakwasịnụ anyị.” (Hosea 10:8) N’ụzọ dị aṅaa ka okwu ndị a si mezuo? N’ezie, mgbe Sameria dabara n’aka ndị Asiria obi tara mmiri n’afọ 740 T.O.A., ndị Israel enweghị ebe ọ bụla ha ga-agbalaga. Okwu Hosea gosipụtara mmetụta nke enweghị enyemaka ọ bụla, oké egwu, na echiche ịbụ ndị a gbahapụworo nke ndị ahụ e meriri emeri nwere. Ma ugwu efu ma òtù dị iche iche dị na Sameria ndị yiri oké ugwu apụghị ichebe ha, ọ bụ ezie na ha yiri ihe ndị guzosiri nnọọ ike n’oge gara aga.
28. (a) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs nyere ụmụ nwanyị Jerusalem? (b) È si aṅaa mezuo ịdọ aka ná ntị Jisọs?
28 N’otu aka ahụ, mgbe ndị Rom na-eduru Jisọs na-eje ebe a ga-egbu ya, ọ gwara ụmụ nwanyị Jerusalem okwu, sị: “Ụbọchị na-abịa, mgbe ha ga-asị, Ngọzi na-adịrị ndị inyom aga, na afọ nke na-amụghị nwa, na ara nke na-azụghị nwa. Mgbe ahụ ka ha ga-amalite ịsị ugwu, Dakwasịnụ anyị; na ịsị ugwu nta, Kpuchienụ anyị.” (Luk 23:29, 30) E nwere ezi ihe ndekọ banyere mbibi nke ndị Rom bibiri Jerusalem n’afọ 70 O.A., e nwekwara ihe àmà gosiri na okwu ndị ahụ Jisọs kwuru nwere mmetụta yiri nke ahụ Hosea kwuru. N’oge ahụ, ndị Juu ahụ fọdụrụ na Judia enweghị ebe ọ bụla ha ga-ezobe onwe ha. Ebe ọ bụla ha nwara izo onwe ha, ma ọ bụ n’ime Jerusalem ma ọ bụ ọbụna ịnwa ịgbapụ jee n’ebe nchebe ahụ dị n’elu ugwu nke Masada, ha apụghị ịgbanarị mmezu dị ike nke ihe Jehova kpere n’ikpe.
29. (a) Mgbe ụbọchị iwe Jehova bịara, gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị ahụ nọgidere na-akwado usoro ihe nke a? (b) Amụma dị aṅaa nke Jisọs ka a ga-emezu mgbe Jehova gosipụtara oké iwe Ya?
29 Ugbu a, mmeghe nke akara nke isii ahụ egosiwo na ihe yiri nke ahụ gaje ime n’ụbọchị iwe Jehova nke na-abịanụ. Mgbe a ga-eme ka usoro ihe ụwa nke a mee mkpatụ ikpeazụ ya, ndị ahụ nọgidere na-akwado ya ga-agbagharị na-achọ ebe ha ga-ezobe onwe ha, ma ọ dịghị nke ha ga-achọta. Okpukpe ụgha, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, emechuworị ha ihu nke ukwuu. Ma ọgba nkume ndị dị n’ugwu nkịtị ma ọ bụ n’ugwu ihe atụ nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na azụmahịa dị iche iche agaghị enwe ike ime ka ndị gbabara na ha nọrọ ná ntụkwasị obi n’ihi ego ma ọ bụ ụdị enyemaka ọ bụla ọzọ. Ọ dịghị ihe ga-echebe ha pụọ n’iwe Jehova. Jisọs kọwara egwu ha nke ọma, sị: “Mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.”—Matiu 24:30.
30. (a) Gịnị ka ọ pụtara, bụ́ ajụjụ ahụ bụ: “Ònye pụkwara iguzo?” (b) Ọ̀ dị ndị ọ bụla ga-enwe ike iguzo n’oge ahụ nke ikpe Jehova?
30 Ee, ndị ahụ jụrụ ịnakwere ikike nke Onye ahụ na-emeri emeri nke na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ ka a ga-amanye ịghọta na ha emehiewo ihe. Ụmụ mmadụ ndị jiworo ọchịchọ obi ha bụrụ akụkụ nke mkpụrụ nke agwọ ahụ ga-eche mbibi ihu mgbe ụwa nke Setan na-agabiga. (Jenesis 3:15; 1 Jọn 2:17) N’oge ahụ, ụwa ga-anọ n’ọnọdụ nke ga-eme ka ọtụtụ ndị jụọ, sị: “Ònye pụkwara iguzo?” O doro anya na ha ga-eche na ọ dịghị onye ọ bụla ma ọlị pụrụ iguzo n’atụghị egwu n’ihu Jehova n’oge ikpe ahụ. Echiche ha nke a agaghị ezi ezi, dị ka akwụkwọ Mkpughe gara n’ihu igosi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Tupu ala ọma jijiji nkịtị emee, a na-enwekarị nnugharị nke ala ndị na-eme ka nkịta malite ịgbọ ụja ma ọ bụ na-agbagharị, na-akpasukwa anụmanụ ndị ọzọ na azụ, ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ pụrụ ịnọ n’atụghị egwu ihe ọjọọ ọ bụla ruo mgbe ala ọma jijiji ahụ malitere ime kpọmkwem.—Lee Teta! (Bekee), July 8, 1982, peji nke 14.
b Maka nkọwa sara mbara, lee peji nke 22, 24.
c Ruo ihe karịrị 35 afọ, site na 1895 ruo 1931, e hotara okwu ndị dị na Luk 21:25, 28, 31 n’ihu magazin Ụlọ Nche (Bekee) n’elu ihe osise nke ụlọ dị elu ebe ìhè si na-enwukwasị osimiri ndị na-amagharị amagharị.
d Dị ka ihe atụ, n’otu mkpọsa pụrụ iche e mere na 1931, Ndịàmà Jehova ji aka ha wejere ndị ụkọchukwu, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ndị na-achụ nta ego ọtụtụ puku akwụkwọ nta ahụ bụ́ The Kingdom, the Hope of the World gburugburu ụwa.
e N’iji okwu ahụ bụ “eluigwe” mee ihe n’ụzọ yiri nke a, amụma ahụ banyere “eluigwe ọhụrụ” nke dị n’Aịsaịa 65:17, 18 nwere mmezu ya n’usoro ọchịchị ọhụrụ ahụ, nke metụtara Onye Ọchịchị bụ Zerubabel na Onyeisi Nchụàjà bụ Jeshua, nke e guzobere n’Ala Nkwa ahụ mgbe ndị Juu lọtasịrị site ná ndọrọ n’agha gaa Babilọn.—2 Ihe Emere 36:23; Ezra 5:1, 2; Aịsaịa 44:28.
Igbe/Foto dị na peeji nke 105]
A Hụrụ 1914 Tupu O Ruo
“Ọ bụ na B.C. 606, ka alaeze Chineke gwụsịrị, e wepụrụ okpueze ahụ, e nyekwara ndị Jentaịl elu ala nile. 2520 afọ site na B.C. 606 ga-agwụsị na A.D. 1914.”f—The Three Worlds, nke e bipụtara na 1877, peji nke 83.
“Ihe àmà Bible doro anya, siekwa ike na ‘Oge ndị Jentaịl’ bụ oge nke dị 2520 afọ, malite n’afọ B.C. 606 ruo, gụnyekwa A.D. 1914.”—Studies in the Scriptures, Mpịakọta 2, nke C. T. Russell dere, nke e bipụtakwara na 1889, peji nke 79.
Charles Taze Russell na ndị mmụta Bible ibe ya ghọtara ọtụtụ iri afọ tupu mgbe ahụ na 1914 ga-aka akara ọgwụgwụ nke Oge ndị Jentaịl, ma ọ bụ oge a kara aka nke ndị mba ọzọ. (Luk 21:24) Ọ bụ ezie na ha aghọtazughị n’oge mbụ ndị ahụ ihe nke a ga-apụta, o doro ha anya na 1914 gaje ịbụ oge oké mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa, o mekwara otú ahụ. Rịba ama okwu a e hotara site n’otu akwụkwọ akụkọ:
“Ntiwapụ nke agha dị oké egwu na Europe emezuwo otu amụma pụrụ iche. N’ime iri afọ abụọ na ise gara aga, site n’ọnụ ndị nkwusa na akwụkwọ, ‘Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile,’ ndị a kasị mara dị ka ‘Ndị Ọbịbịa Ọchịchị Puku Afọ,’ anọwo na-akpọsara ụwa na Ụbọchị Oké Iwe nke e buru amụma ya na Bible ga-erute na 1914. ‘Lepụ anya maka 1914!’ abụwo òkù nke ọtụtụ narị ndị ozi ọma njegharị nọworo na-akpọ.”—The World, otu akwụkwọ akụkọ New York, August 30, 1914.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
f N’ebere Chineke, Ndị Mmụta Bible amataghị na e nweghị afọ a na-akpọghị aha nke dị n’agbata “B.C.” na “A.D.” E mesịa, mgbe nnyocha mere ka ọ dị mkpa idegharị B.C. 606 ka ọ bụrụ 607 T.O.A., e wepụkwara afọ ahụ a na-akpọghị aha, nke mere na amụma ahụ dabara nke ọma na “A.D. 1914.”—Lee “The Truth Shall Make You Free,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara na 1943, peji nke 239.
[Foto dị na peeji nke 106]
1914—Oge Oké Mgbanwe
Akwụkwọ bụ́ Politikens Verdenshistorie—Historiens Magt og Mening (Akụkọ Ụwa—Ike nke Akụkọ Ihe Mere Eme na Ihe Ọ Pụtara nke Politiken dere), nke e bipụtara na 1987 na Copenhagen, kwuru ihe na-esonụ na peji nke 40:
“Okwukwe e nwere na narị afọ nke 19 maka ọganihu natara ihe otiti na-akpata mbibi na 1914. N’afọ bu ntiwapụ nke agha ahụ ụzọ, onye Denmark bụ odeakụkọ ihe mere eme, onye bụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, bụ́ Peter Munch ji ezi olileanya dee, sị: ‘Ihe àmà nile na-egosi na a gajeghị inwe agha n’etiti mba ndị bụ dike nke Europe. “Ihe ize ndụ nke agha” ga-apụkwa n’anya n’ọdịnihu, dị ka o meworo ọtụtụ mgbe kemgbe 1871.’
“N’ụzọ megidere nke ahụ, anyị na-agụ n’ihe ndekọ ndị o mere n’ikpeazụ, sị: ‘Ntiwapụ nke agha ahụ na 1914 bụ oge e nwere oké mgbanwe n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ. Site n’oge e nwere olileanya nke inwe ọganihu, mgbe a pụrụ ịchụso ihe dị iche iche na-enwe ókè ụfọdụ nke ịnọ ná ntụkwasị obi, anyị banyere n’ọgbọ nke ọdachi, oké egwu, na ịkpọasị, na-enwe anọghị ná ntụkwasị obi n’ebe nile. N’oge ahụ, ọ dịghị onye pụrụ ikwu, ọbụna taa, ọ dịghịkwa onye pụrụ ikwu, ma ọchịchị nke dakwasịrị anyị n’oge ahụ ọ̀ ga-abụ mbibi na-adịgide adịgide nke nhazi omenala nile nke mmadụ mewooro onwe ya eri ọtụtụ puku afọ.’”
[Foto dị na peeji nke 110]
‘E wee wepụ ugwu nile n’ọnọdụ ya’
[Foto dị na peeji nke 111]
Ha zobere onwe ha n’ime ọgba