Isi nke Iri Atọ
“Kasienụ Ndị M Obi”
1. Olee otu ụzọ Jehova si akasi anyị obi?
JEHOVA bụ ‘Chineke nke nkasi obi.’ Otu ụzọ o si akasi anyị obi bụ site ná nkwa ndị o meworo ka e dekọọ n’Okwu ya. (Ndị Rom 15:4, 5) Dị ka ihe atụ, mgbe onye ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị, olee ihe pụrụ ịkasi gị obi karịa olileanya nke onye ahụ ị hụrụ n’anya ịbụ onye a kpọlitere n’ọnwụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke? (Jọn 5:28, 29) Oleekwa banyere nkwa Jehova bụ́ na n’isi nso ọ ga-eme ka ajọ omume gwụsịa ma mee ka ụwa a ghọọ paradaịs? Ọ́ bụghị ihe nkasi obi inwe olileanya nke ịdị ndụ baa n’ime Paradaịs ahụ na-abịanụ ma ghara ịnwụ anwụ?—Abụ Ọma 37:9-11, 29; Mkpughe 21:3-5.
2. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụkwasị nkwa dị iche iche nke Chineke obi?
2 Ànyị pụrụ ịtụkwasị nkwa dị iche iche nke Chineke obi n’ezie? N’ezie, anyị pụrụ! A pụrụ ịdabere n’ebe Onye Kwere nkwa ndị ahụ nọ n’ụzọ nile. O nwere ma ike ma ọchịchọ imezu ihe o kwuru. (Aịsaịa 55:10, 11) E gosipụtara nke a n’ụzọ dị ike n’ihe Jehova kwuru site n’ọnụ onye amụma bụ́ Aịsaịa na ya ga-eweghachi ezi ofufe na Jerusalem. Ka anyị tụlee amụma ahụ, dị ka ọ dị n’Aịsaịa isi nke 40, n’ihi na ime otú ahụ pụrụ iwusi okwukwe anyị ike n’ebe Jehova nọ, bụ́ Onye Na-emezu nkwa ya.
Nkwa Na-akasi Obi
3, 4. (a) Aịsaịa dekọrọ okwu nkasi obi dị aṅaa nke ga-adị ndị Chineke mkpa n’ọdịnihu? (b) N’ihi gịnị ka a ga-eji kpụrụ ndị bi na Juda nakwa na Jerusalem gaa Babilọn, ruo ogologo oge hà aṅaa ka ha ga-abụ ohu?
3 Na narị afọ nke asatọ T.O.A., Aịsaịa onye amụma deturu okwu nkasi obi nke ga-adị ndị Jehova mkpa n’ọdịnihu. Ozugbo ọ gwasịrị Eze Hezekaịa banyere mbibi na-abịanụ nke Jerusalem na mkpụrụ a ga-akpụrụ ndị Juu gaa Babilọn, Aịsaịa kọwapụtara okwu Jehova ndị na-ekwe nkwa mweghachi, sị: “Kasienụ, kasienụ ndị m obi, ka Chineke unu na-asị. Gwanụ Jerusalem okwu ga-aba ya n’obi, kpọọkwanụ ya òkù, sị, na obubu agha ya ezuwo, na [a kwụchapụwo ụgwọ mmehie ya], na ọ natawo n’aka Jehova okpukpu abụọ n’ihi mmehie ya nile.”—Aịsaịa 40:1, 2.
4 “Kasienụ,” bụ́ okwu mmeghe nke Aịsaịa isi nke 40, na-akọwa nnọọ nke ọma ozi na-enye ìhè na olileanya bụ́ nke dị n’ihe fọdụrụnụ n’akwụkwọ Aịsaịa. N’ihi isi n’ezi ofufe dapụ, a ga-akpụrụ ndị bi na Juda nakwa na Jerusalem gaa Babilọn na 607 T.O.A. Ma ndị Juu ahụ e ji eji agaghị abụrụ ndị Babilọn ohu ruo mgbe ebighị ebi. Ee e, ha ga-anọgide na-abụ ohu ruo nanị mgbe a ‘kwụchapụrụ ụgwọ’ mmehie ha. Ogologo oge hà aṅaa ka nke ahụ ga-adịru? Dị ka Jeremaịa onye amụma si kwuo, ọ bụ afọ 70. (Jeremaịa 25:11, 12) Mgbe nke ahụ gasịrị, Jehova ga-eduru ndị fọdụrụ bụ́ ndị chegharịrịnụ si Babilọn laghachi Jerusalem. N’afọ nke 70 nke ntọgbọrọ n’efu Juda, lee ihe nkasi obi ọ ga-abụrụ ndị ahụ e ji eji ịmata na oge eruwela maka mgbapụta ha e kwere ná nkwa!—Daniel 9:1, 2.
5, 6. (a) N’ihi gịnị ka ogologo njem ahụ nke isi Babilọn gaa Jerusalem na-agaghị eji gbochie mmezu nke nkwa Chineke? (b) Mweghachi nke ndị Juu n’ala nna ha ga-enwe mmetụta dị aṅaa n’ahụ mba ndị ọzọ?
5 Njem isi Babilọn garuo Jerusalem dị malite na kilomita 800 ruo kilomita 1,600, dabere n’ụzọ nke ha si. Ogologo njem ahụ ọ̀ ga-egbochi mmezu nke nkwa Chineke? Ọ dịghị ma ọlị! Aịsaịa na-ede, sị: “Ọ bụ olu nke onye na-akpọ mkpu n’ọzara, sị, Dozienụ ụzọ Jehova, meenụ ka ụzọ a tụliri atụli guzoziere Chineke anyị n’ala ihe na-adịghị. A ga-eme ndagwurugwu ọ bụla ka ọ dị elu, a ga-emekwa ka ugwu ọ bụla na ugwu nta ọ bụla dị ala: ebe dị mkputamkpu ga-aghọkwa ebe guzoziri eguzozi, nkume nile dị elu ga-aghọkwa ebe dị larịị: a ga-ekpughekwa ebube Jehova, anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, ga-ahụkọkwa ya n’otu: n’ihi na ọnụ Jehova ekwuwo.”—Aịsaịa 40:3-5.
6 Tupu ha amalite ime njem, ndị ọchịchị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-ezipụkarị ndị mmadụ ịga dozie ụzọ site n’iwepụsị nnukwute nkume na ọbụna ịrụ ụzọ na ime ka ugwu dị iche iche dị ala. N’ihe banyere ndị Juu na-alọtanụ, ọ ga-adị ka a ga-asị na Chineke n’onwe ya buteere ha ụzọ, na-ewepụsị ihe mgbochi ọ bụla. E kwuwerị, ndị a bụ ndị a kpọkwasịrị aha Jehova, imezukwa nkwa ya nke bụ́ iweghachi ha n’ala nna ha ga-eme ka ebube ya pụta ìhè n’ihu mba nile. Ma ọ̀ masịrị ha ma ọ masịghị ha, a ga-amanye mba ndị ahụ ịhụ na Jehova bụ Onye Na-emezu nkwa ya.
7, 8. (a) Ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 40:3 nwere mmezu dị aṅaa na narị afọ mbụ O.A.? (b) Olee mmezu ka ukwuu nke amụma Aịsaịa nwere na 1919?
7 Mweghachi ahụ e weghachiri ha na narị afọ nke isii T.O.A. abụghị nanị mmezu amụma a nwere. O nwekwara mmezu na narị afọ mbụ O.A. Jọn Onye Na-eme Baptism bụ olu nke onye “na-eti mkpu n’ọhịa,” ná mmezu nke Aịsaịa 40:3. (Luk 3:1-6) Site n’ike mmụọ nsọ, Jọn ji ihe ndị Aịsaịa kwuru mee ihe banyere onwe ya. (Jọn 1:19-23) Malite na 29 O.A., Jọn malitere idoziri Jisọs Kraịst ụzọ.a Mkpọsa Jọn mere tupu ọ bịa kpaliri ndị mmadụ ịtụ anya Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, ka ha, n’aka nke ha, wee nwee ike ige ya ntị ma gbasoo ya. (Luk 1:13-17, 76) Site n’aka Jisọs, Jehova ga-eduru ndị chegharịrịnụ gaa ná nnwere onwe nke ọ bụ nanị Alaeze Chineke pụrụ iweta—ntọhapụ n’agbụ nke mmehie na ọnwụ. (Jọn 1:29; 8:32) Ihe Aịsaịa kwuru nwere mmezu ka ukwuu ná mgbapụta nke ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ site na Babilọn Ukwu ahụ na 1919 nakwa ná mweghachi e weghachiri ha n’ezi ofufe.
8 Otú ọ dị, gịnị banyere ndị gaje irite uru site ná mmezu mbụ nke nkwa ahụ—ndị Juu e ji eji na Babilọn? Hà pụrụ ịtụkwasị obi n’ezie ná nkwa Jehova kwere iweghachi ha n’ala nna ha ha hụrụ n’anya? N’ezie, ha pụrụ! Aịsaịa jizi okwu na ihe atụ ndị doro anya sitere ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ mere ha pụrụ iji nwee obi ike zuru ezu na Jehova ga-emezu ihe o kwuru.
Chineke, Onye Okwu Ya Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi
9, 10. Olee otú Aịsaịa si jiri adịteghị aka nke ndụ mmadụ tụnyere ịdịgide adịgide nke “okwu” Chineke?
9 Nke mbụ, ihe Onye ahụ kwere nkwa mweghachi kwuru na-adịru mgbe ebighị ebi. Aịsaịa na-ede, sị: “Ọ bụ olu onye na-asị, Kpọọ mkpu. Otu onye wee sị, Gịnị ka m ga na-akpọ mkpu? Anụ ahụ nile bụ ahịhịa, ịma mma ya nile dịkwa ka okooko ọhịa: ahịhịa akpọnwụwo, okooko ọhịa ajanwụwo; n’ihi na iku ume Jehova ekukwasịwo ya: n’ezie ahịhịa ka ndị ahụ bụ. Ahịhịa akpọnwụwo, okooko ọhịa ajanwụwo: ma okwu Chineke anyị ga na-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 40:6-8.
10 Ndị Israel maara nke ọma na ahịhịa anaghị adịru mgbe ebighị ebi. N’ọkọchị, oké okpomọkụ nke anyanwụ na-eme ka o si n’ịcha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ chawa nchara nchara. N’ụzọ ụfọdụ, ndụ mmadụ yiri ahịhịa—nke na-adịghị adịte aka. (Abụ Ọma 103:15, 16; Jemes 1:10, 11) Aịsaịa ji adịteghị aka nke ndụ mmadụ tụnyere ịdịgide adịgide nke “okwu,” ma ọ bụ nzube Chineke nke o kwupụtara. Ee, “okwu Chineke anyị” na-adịru mgbe ebighị ebi. Mgbe Chineke kwuru okwu, ọ dịghị ihe pụrụ ịkagbu okwu ya ma ọ bụ gbochie ha imezu.—Joshua 23:14.
11. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụkwasị Jehova obi na ọ ga-emezu nkwa ndị dị n’ime Okwu ya e dere ede?
11 Taa anyị nwere nkwupụta nke nzube Jehova n’ụdị e dere ede n’ime Bible. Bible enwetawo mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ eri ọtụtụ narị afọ, ndị nsụgharị na-adịghị atụ ụjọ nakwa ndị ọzọ etinyewokwa ndụ ha n’ihe ize ndụ iji chebe ya. Ma, ọ bụghị mgbalị ha nanị mere o ji lanarị. Ekele nile maka nlanarị ya aghaghị ịgara Jehova, bụ́ “Chineke, nke dị ndụ, nke na-adịgidekwa” nakwa Onye Na-echebe Okwu ya. (1 Pita 1:23-25) Cheedị banyere nke a: Ebe Jehova chebeworo Okwu ya e dere ede, ọ̀ bụ na anyị apụghị ịtụkwasị ya obi na ọ ga-emezu nkwa ndị dị n’ime ya?
Chineke Dị Ike, Onye Ji Ịhụnanya Na-elekọta Atụrụ Ya
12, 13. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji tụkwasị nkwa mweghachi ahụ obi? (b) Olee ozi ọma dịnụ maka ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, n’ihi gịnịkwa ka ha pụrụ iji nwee obi ike?
12 Aịsaịa kwuru ihe nke abụọ mere a pụrụ iji tụkwasị nkwa mweghachi ahụ obi. Onye kwere nkwa ahụ bụ Chineke dị ike, onye ji ịhụnanya na-elekọta ndị ya. Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Rịgoo n’elu ugwu dị elu, gị nwanyị na-ezisa ozi ọma, bụ́ Zaịọn; welie olu gị n’ike, gị nwanyị na-ezisa ozi ọma, bụ́ Jerusalem; welie ya, atụla egwu; sị obodo nile nke Juda, Lee, Chineke unu! Lee, Onyenwe anyị Jehova ga-abịa dị ka onye dị ike [“ọbụna n’ike,” nkọwa ala ala peji nke NW], ogwe aka Ya ga na-achịkwara Ya: lee, ọkwụkwụ ụgwọ Ya dị n’aka Ya, ụgwọ ọrụ Ya dịkwa n’ihu Ya. Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha, Ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.”—Aịsaịa 40:9-11.
13 N’oge Bible ọ bụ omenala ụmụ nwanyị ịṅụrị ọṅụ mmeri, na-eti mkpu ma ọ bụ na-abụ abụ banyere ozi ọma nke agha ndị e nwere mmeri na ha ma ọ bụ nke nnwere onwe na-abịanụ. (1 Samuel 18:6, 7; Abụ Ọma 68:11) Aịsaịa na-egosi n’ụzọ amụma na ọ dị ozi ọma dịnụ maka ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ozi nke a pụrụ iti ná mkpu n’atụghị egwu, ọbụna site n’elu ugwu dị iche iche—Jehova ga-eduru ndị ya laghachi na Jerusalem ha hụrụ n’anya! Ha pụrụ inwe obi ike, n’ihi na Jehova ga-abịa “ọbụna n’ike.” Ya mere, ọ dịghị ihe pụrụ igbochi ya imezu nkwa ya.
14. (a) Olee otú Aịsaịa si mee ihe atụ nke ụzọ dị nro Jehova ga-esi duo ndị ya? (b) Olee ihe atụ na-egosi otú ndị ọzụzụ atụrụ si elekọta atụrụ ha n’ụzọ dị nro? (Lee igbe dị na peji nke 405.)
14 Otú ọ dị, Chineke a dị ike nwere akụkụ dị nro. Aịsaịa kọwara n’ụzọ na-akpali akpali otú Jehova ga-esi duru ndị ya laghachi n’ala nna ha. Jehova yiri onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya nke na-achịkọta ụmụ atụrụ ya ma kuru ha “n’obi” ya. Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ebe a okwu bụ́ “obi” na-ezo aka n’ebe a pịajiri uwe apịaji n’elu obi. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ n’ebe a ka ndị ọzụzụ atụrụ na-ekunye ụmụ atụrụ a mụrụ ọhụrụ ndị na-apụghị iso ìgwè atụrụ ahụ. (2 Samuel 12:3) Obi abụọ adịghị ya na ọnọdụ dị otú ahụ na-emetụ n’ahụ e si ná ndụ ndị ọzụzụ atụrụ weta na-emesi ndị Jehova e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ obi ike banyere nchegbu ịhụnanya o nwere maka ha. N’ezie a pụrụ ịtụkwasị Chineke dị ike otú ahụ ma dị nro obi na ọ ga-emezu ihe o kwere ha ná nkwa!
15. (a) Olee mgbe Jehova bịara “ọbụna n’ike,” ònyekwa bụ ‘ogwe aka nke na-achịrị ya’? (b) Ozi ọma dị aṅaa ka a na-aghaghị ịkpọsa n’atụghị ụjọ?
15 Okwu Aịsaịa nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara n’ụzọ amụma maka oge anyị. Na 1914, Jehova bịara “ọbụna n’ike” ma guzobe Alaeze ya n’eluigwe. ‘Ogwe aka nke na-achịrị ya’ bụ Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, onye Jehova meworo ka ọ nọkwasị n’ocheeze ya n’eluigwe. Na 1919, Jehova napụtara ndị ohu ya e tere mmanụ nọ n’elu ala n’ojiji Babilọn Ukwu ahụ ji ha ma malite iweghachi ofufe dị ọcha nke ezi Chineke ahụ dị ndụ n’ụzọ zuru ezu. Nke a bụ ozi ọma a na-aghaghị ịkpọsa n’atụghị ụjọ, dị ka ọ bụ n’iti mkpu site n’elu ugwu nile, ka mkpọsa ahụ wee gatee aka. Mgbe ahụ, ka anyị welie olu anyị ma jiri anyaike mee ka ndị ọzọ mara na Jehova Chineke eweghachiwo ofufe ya dị ọcha n’ụwa a!
16. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si na-edu ndị ya taa, ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka nke a na-esetịpụ?
16 Ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa 40:10, 11 nwere abamuru ọzọ nye anyị taa. Ọ bụ ihe na-akasi obi ịhụ ụzọ dị nro Jehova si na-edu ndị ya. Dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ama mkpa atụrụ ya n’otu n’otu—tinyere ụmụ atụrụ dị ntakịrị ndị na-apụghị iso ndị ọzọ—Jehova na-aghọta adịghị ike nke onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọzọkwa, Jehova, dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ dị nro, na-esetịpụrụ ndị Kraịst bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ ihe nlereanya. Ndị okenye aghaghị imeso ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ ịdị nro, na-eṅomi nchegbu ịhụnanya Jehova n’onwe ya gosiworo. Ha aghaghị iburu n’uche mgbe nile otú Jehova si ele onye ọ bụla so n’ìgwè atụrụ ya anya, bụ́ “nke O ji ọbara nke [Ọkpara ya] zụtara Onwe ya.”—Ọrụ 20:28.
Onye Nwere Ike Nile, Onye Maara Ihe Nile
17, 18. (a) N’ihi gịnị ka ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ pụrụ iji nwee obi ike ná nkwa mweghachi ahụ? (b) Ajụjụ dịgasị aṅaa na-emenye ụjọ ka Aịsaịa jụrụ?
17 Ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ pụrụ inwe obi ike ná nkwa mweghachi ahụ n’ihi na Chineke bụ onye nwere ike nile, onye makwaara ihe nile. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Ònye tụworo mmiri nile n’ọbụ aka Ya, were ntụaka tụpụta eluigwe, nagidezuo ájá nke ụwa na mgbé, sie ugwu nile n’ihe òsìsì, tụọ ugwu nta nile n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? Ònye tụpụtaworo mmụọ nke Jehova, ma ọ bụ, dị ka onye ndụmọdụ Ya, na-eme ka Ọ mara ihe? Ya na ònye gbara izu? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye ziri Ya ihe n’okporo ụzọ ikpe, ziekwa Ya ihe ọmụma, meekwa ka Ọ mara ụzọ nghọta?”—Aịsaịa 40:12-14.
18 Ndị a bụ ajụjụ na-emenye ụjọ ndị ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ga-echebara echiche. Ụmụ mmadụ efu hà pụrụ igbochi uto na ntalata nke oké osimiri? N’ezie ha apụghị! Ma, nye Jehova, oké osimiri ndị jupụtara n’ụwa yiri ntapụ mmiri dị n’ọbụ aka ya.b Ụmụ mmadụ na-adịghị ike, hà pụrụ ịtụ eluigwe sara mbara, nke jupụtara na kpakpando, n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ma ọ bụ tụọ ugwu nile dị n’ụwa n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? Ee e. Ma, Jehova na-atụ eluigwe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ụzọ dị mfe dị ka mmadụ pụrụ isi jiri ntụaka ya—agbata mkpịsị aka ukwu na mkpịsị aka nta mgbe a gbasara ọbụ aka—tụọ ihe. Ya bụ na Chineke pụrụ ịtụ ugwu nile n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ọbụna ụmụ mmadụ ndị kasị mara ihe hà pụrụ ịgwa Chineke ihe ọ ga-eme banyere ọnọdụ ndị dị ugbu a ma ọ bụ gwa ya ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu? Ọ dịghị ma ọlị!
19, 20. Iji mesie ịdị ukwuu Jehova ike, Aịsaịa ji ihe atụ dịgasị aṅaa doro anya mee ihe?
19 Gịnị banyere mba ndị dị ike n’ụwa—hà pụrụ iguzogide Chineke mgbe ọ na-emezu nkwa ya? Aịsaịa zara ya site n’ịkọwa mba nile otú a, sị: “Lee, a gụwo mba nile n’otu ntụ mmiri na-atụpụ n’ite mmiri, na n’uzuzu nke ihe ọ̀tụ̀tụ̀: lee, Ọ na-achịli àgwàetiti dị ka ifurifu ihe. Lebanọn ezughịkwa isure ọkụ, anụ ọhịa ya ezughịkwa isure àjà nsure ọkụ. Mba nile dị ka ihe efu n’ihu Ya; dị ka ihe na-erughị ihe efu na ebe tọgbọrọ n’efu ka a gụworo ha nye Ya.”—Aịsaịa 40:15-17.
20 N’ebe Jehova nọ, mba nile dị ka ntụ mmiri si n’ite mmiri tụpụ. Ha bụ nanị uzuzu dị n’elu ihe ọ̀tụ̀tụ̀, nke na-enweghị ihe ọ bụla ọ ga-eme ya.c Ka e were ya na mmadụ wuru otu nnukwute ebe ịchụàjà ma jiri osisi nile dị n’ugwu Lebanọn mere nkụ nke ebe ịchụàjà ahụ. Mgbe ahụ ka e were ya na ọ gaje ịchụ anụmanụ nile na-awagharị n’ugwu ndị ahụ n’àjà. Ọbụna àjà dị otú ahụ agaghị ezu inye Jehova. Dị ka a ga-asị na onyinyo ahụ o sere ezughị, Aịsaịa kwuziri ọbụna okwu siri ike karị—mba nile dị ka ihe “na-erughị ihe efu” n’anya Jehova.—Aịsaịa 40:17, New Revised Standard Version.
21, 22. (a) Olee otú Aịsaịa si mesie ya ike na Jehova enweghị atụ? (b) Nkọwa doro anya nke Aịsaịa na-eme ka anyị ruo nkwubi okwu dị aṅaa? (ch) Aịsaịa onye amụma dekọrọ okwu dị aṅaa ziri ezi n’ụzọ nkà mmụta sayensị? (Lee igbe dị na peji nke 412.)
21 Iji mesikwuo ya ike na Jehova enweghị atụ, Aịsaịa gara n’ihu igosi nzuzu nke ndị na-eji ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ osisi eme arụsị. Lee nzuzu ọ bụ iche na arụsị ọ bụla dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe oyiyi kwesịrị ekwesị nke “Onye ahụ Nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa,” onye nwekwara ike n’ahụ ndị bi n’ime ya!—Gụọ Aịsaịa 40:18-24.
22 Nkọwa a nile doro anya na-eme ka anyị ruo otu nkwubi okwu—ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Jehova nke nwere ike nile, onye maara ihe nile, na onye na-enweghị atụ imezu nkwa ya. Lee otú okwu Aịsaịa na-aghaghị isiworị kasie ndị Juu ahụ bi na Babilọn, bụ́ ndị ọ gụsiri agụụ ike ịlaghachi n’ala nna ha, obi ma wusie ha ike! Taa, anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe obi ike na nkwa Jehova maka ọdịnihu anyị ga-emezu.
“Ònye Kere Ihe Ndị A?”
23. N’ihi gịnị ka ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ pụrụ iji nwee obi ike, gịnịkwa ka Jehova mesiri ike ugbu a banyere onwe ya?
23 E nwekwara ihe ọzọ mere ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ pụrụ iji nwee obi ike. Onye kwere nkwa mgbapụta ahụ bụ Onye Okike nke ihe nile na Isi Iyi nke ike nile. Iji mesie ikike ya na-atụ n’anya ike, Jehova dọọrọ uche gaa n’ikike ya a na-ahụ anya n’ihe ndị e kere eke, sị: “Ònyekwa ka unu ga-asị na Mụ yiri ya, M wee ha ka ya? ka Onye Nsọ na-asị. Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.”—Aịsaịa 40:25, 26.
24. N’ikwuchitere onwe ya, olee otú Jehova si gosi na ọ dịghị onye ya na ya hà?
24 Onye Nsọ nke Israel na-ekwuchitere onwe ya. Iji gosi na ọ dịghị onye ya na ya hà, Jehova dọọrọ uche gaa na kpakpando nke eluigwe. Dị ka ọchịagha nke nwere ike ịhazi ndị agha ya, Jehova na-achịkwa kpakpando. A sị na ọ ga-akpọkọta ha, ‘ọ dịghị nke a na-agaghị ahụ.’ Ọ bụ ezie na kpakpando buru nnọọ ibu n’ọnụ ọgụgụ, ọ na-akpọ nke ọ bụla n’aha, aha ha n’otu n’otu ma ọ bụ ihe yiri aha. Dị ka ndị agha na-erube isi, ha na-anọ ebe e kenyere ha ma na-adị n’usoro, n’ihi na Onye Ndú ha bara ụba “n’ike” ma ‘nwee ume n’ike.’ N’ihi ya, ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ nwere ihe mere ha ga-eji nwee obi ike. Onye Okike, bụ́ onye na-achịkwa kpakpando, nwere ikike inyere ndị ohu ya aka.
25. Olee otú anyị pụrụ isi meghachi omume n’òkù ahụ Chineke kpọrọ nke e dekọrọ n’Aịsaịa 40:26, na-arụpụtakwa gịnị?
25 Ònye n’ime anyị pụrụ ịjụ òkù ahụ Chineke kpọrọ bụ́ nke e dekọrọ n’Aịsaịa 40:26: “Welienụ anya unu elu, hụ”? Ihe ndị na-enyocha mbara igwe n’oge a chọpụtara egosiwo na eluigwe nke jupụtara na kpakpando na-emenye ụjọ ọbụna karịa ka ha na-emenye n’oge Aịsaịa. Ndị na-enyocha mbara igwe bụ́ ndị na-eji ígwè teliskop ha dị ike enyobanye anya n’eluigwe na-eme atụmatụ na e nwere ihe ruru ijeri ụyọkọ kpakpando 125 na mbara igwe a na-ahụ anya. Leenụ, nanị otu n’ime ndị a—ụyọkọ Milky Way—nwere, dị ka atụmatụ ụfọdụ na-egosi, ihe karịrị 100 ijeri kpakpando! Ihe ọmụma dị otú ahụ kwesịrị ịkpali n’ime obi anyị nsọpụrụ maka Onye Okike anyị na ntụkwasị obi zuru ezu ná nkwa ya.
26, 27. Olee otú e si kọwaa mmetụta nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na Babilọn, oleekwa ihe ndị ha kwesịrị ịma?
26 N’ịmara na afọ ndị ahụ ha nọ ná ndọrọ n’agha ga-eme ka mmụọ nke ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ daa mbà, Jehova kpaliri Aịsaịa idetu okwu mmesighachi obi ike ndị a tupu o ruo, sị: “N’ihi gịnị ka ị na-asị, gị Jekọb, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ị na-ekwu, gị Israel, sị, Ụzọ m ezonahụworo Jehova, ọzọ, ikpe m esiwo n’ebe Chineke m nọ gabiga? Ị́ maghị? Ị́ nụghị? Chineke nke mgbe ebighị ebi ka Jehova, Onye keworo nsọtụ nile nke ụwa, bụ; Ọ dịghị ada mbà, ike adịghị agwụkwa Ya; ọ dịghị ngwupụta a na-egwupụta nghọta Ya.”—Aịsaịa 40:27, 28.d
27 Aịsaịa dekọrọ okwu Jehova, bụ́ ndị kọwara mmetụta nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na Babilọn, ọtụtụ narị kilomita site n’ala nna ha. Ụfọdụ na-eche na Chineke ha adịghị ahụ ha ma ọ bụ na ọ maghị “ụzọ” ha—ndụ ha nke jupụtara n’ihe isi ike. Ha na-eche na omume ikpe na-ezighị ezi a na-emeso ha adịghị emetụ Jehova n’obi. E chetaara ha ihe ndị ha kwesịrị ịma, ma ọ́ bụghị site n’ahụmahụ onwe onye, ọ bụrụ ma ọ dịghị ihe ọzọ site n’ihe ndị a kụziwooro ha. Jehova pụrụ, ọ dịkwa njikere ịnapụta ndị ya. Ọ bụ Chineke ebighị ebi na Onye Okike nke ụwa dum. N’ihi ya, ọ ka nwere ike ahụ o gosipụtara n’ike ihe, ọbụnakwa Babilọn dị ike akarịghị ya. Ike apụghị ịgwụ Chineke dị otú ahụ, o wee mechuo ndị ya ihu. Ha ekwesịghị ịtụ anya inwe ike ịghọtazu ihe nile Jehova na-eme, n’ihi na nghọta ya—ma ọ bụ ezi uche, mmata, na ịdị akọ ya—karịrị nghọta ha.
28, 29. (a) Olee otú Jehova si chetara ndị ya na ya ga-enyere ndị dara mbà aka? (b) Olee ihe atụ e ji gosi otú Jehova si enye ndị ohu ya ike?
28 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova gara n’ihu n’agbamume ya nye ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị nwere nkụda mmụọ: “Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba. Ọbụna ụmụ okoro na-ada mbà, ike na-agwụkwa ha, ọbụna ụmụ okorobịa na-asụ ngọngọ daa: ma ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nku dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.”—Aịsaịa 40:29-31.
29 Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere mkpa ọ dị inye onye dara mbà ike, Jehova pụrụ ibuworị n’uche njem siri ike ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ga-eme iji laghachi. Jehova chetaara ndị ya na ọ bụ omume ya inyere ndị dara mbà aka bụ́ ndị dabeere n’ebe ya nọ maka enyemaka. Ọbụna ụmụ mmadụ kasị gbasie ike—“ụmụ okoro” na “ụmụ okorobịa”—pụrụ inwe ike ọgwụgwụ ma daa n’ihi enwekwaghị ume. Ma, Jehova kwere nkwa inye ndị tụkwasịrị ya obi ike—ike na-adịghị agwụ agwụ iji gbaa ọsọ ma gaa ije. E ji ufe yiri ka ọ bụ na a dịghị etinyere ya mgbalị nke ugo, bụ́ nnụnụ dị ike nke pụrụ ịdị na-efegharị ruo ọtụtụ awa n’akwụsịtụghị akwụsị, mee ihe atụ nke otú Jehova si enye ndị ya ike.e N’atụmanya maka enyemaka dị otú ahụ nke Chineke, ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ enweghị ihe mere ha ga-eji nwee obi nkoropụ.
30. Olee otú ezi ndị Kraịst taa pụrụ isi nweta nkasi obi site n’amaokwu ndị ikpeazụ nke Aịsaịa isi nke 40?
30 Amaokwu ikpeazụ ndị a nke Aịsaịa isi nke 40 nwere okwu nkasi obi nye ezi ndị Kraịst na-ebi na mgbe ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a. Ebe e nwere ọtụtụ ihe nrụgide na nsogbu ndị yiri ka ha na-akụda mmụọ, ọ bụ ihe na-emesi obi ike ịmata na Chineke anyị na-ahụ ihe isi ike ndị anyị na-edi na omume ikpe na-ezighị a na-emeso anyị. Anyị pụrụ ijide n’aka na Onye Okike nke ihe nile, Onye “nghọta Ya [na-enweghị] ọnụ ọgụgụ,” ga-edozi ikpe na-ezighị ezi nile n’oge ya na n’ụzọ nke ya. (Abụ Ọma 147:5, 6) Ka ọ dịgodị, ọ dịghị mkpa anyị ịtachi obi n’ike aka anyị. Jehova, bụ́ onye ihe o nwere na-adịghị agwụ agwụ, pụrụ inye ndị ohu ya ike—ọbụna “ọkịka nke ike”—n’oge ule.—2 Ndị Kọrint 4:7.
31. Nkwa dị aṅaa maka nghọta ime mmụọ dị n’amụma Aịsaịa nye ndị Juu ahụ e ji eji na Babilọn, na gịnịkwa ka anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu?
31 Cheedị banyere ndị Juu ahụ e ji eji na Babilọn na narị afọ nke isii T.O.A. Ọtụtụ narị kilomita site n’ebe ahụ, Jerusalem ha hụrụ n’anya tọgbọrọ n’efu, ụlọukwu ya dakwara ada. Nye ha, amụma Aịsaịa nwere nkwa na-akasi obi maka nghọta ime mmụọ na olileanya—Jehova ga-eweghachi ha n’ala nna ha! Na 537 T.O.A., Jehova dulara ndị ya, na-egosi na ọ bụ Onye Na-emezu nkwa ya. Anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe obi ike zuru ezu n’ebe Jehova nọ. Nkwa ya maka Alaeze, bụ́ ndị a kọwara nnọọ n’ụzọ mara mma n’amụma Aịsaịa, ga-emezu. Nke ahụ bụ ozi ọma n’ezie—ozi nke ìhè nke dịịrị ihe nile a kpọrọ mmadụ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Aịsaịa buru amụma banyere idoziri Jehova ụzọ. (Aịsaịa 40:3) Otú ọ dị, Oziọma ndị ahụ ji amụma ahụ mee ihe n’ihe metụtara ihe Jọn Onye Na-eme Baptism mere n’idoziri Jisọs Kraịst ụzọ. Ndị e nyere ike mmụọ nsọ bụ́ ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ji ya mee ihe otú ahụ n’ihi na Jisọs nọchitere anya Nna ya, bịakwa n’aha Nna ya.—Jọn 5:43; 8:29.
b E mewo atụmatụ na “ịdị arọ nke oké osimiri bụ ihe dị ka ijeri kwuru ijeri metric ton 1.35 (1.35 x 1018), ma ọ bụ ihe dị ka 1/4400 nke ngụkọta ịdị arọ nke Ụwa.”—Encarta 97 Encyclopedia.
c The Expositor’s Bible Commentary na-ekwu, sị: “N’azụmahịa nke Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa a gaghị agụ ntakịrị ntụ mmiri dị n’ite mmiri e ji esi ihe ma ọ bụ ntakịrị uzuzu dị n’elu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ mgbe a tụrụ anụ ma ọ bụ mkpụrụ osisi n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ihe ọ bụla.”
d N’Aịsaịa 40:28, okwu bụ́ “mgbe ebighị ebi” pụtara na Jehova bụ “Eze nke mgbe nile.”—1 Timoti 1:17.
e Ugo na-eji ike dịkarịsịrị nta erugharị n’elu. Ọ na-eme otú ahụ site n’iji ikuku ọkụ na-arị elu eme ihe n’ụzọ nkà.
Igbe/Foto dị na peeji nke 404, 405]
Jehova, Onye Ọzụzụ Atụrụ Na-ahụ n’Anya
Aịsaịa ji Jehova tụnyere onye ọzụzụ atụrụ nke na-ekuru ụmụ atụrụ ya n’obi ya. (Aịsaịa 40:10, 11) Dị ka ihe àmà na-egosi, Aịsaịa si n’ihe ndị ọzụzụ atụrụ na-eme n’ezie weta ihe atụ a na-akpali akpali. Otu onye nke jere kirie ndị ọzụzụ atụrụ n’oge a ná mkpọda Ugwu Heamọn n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-akọ, sị: “Onye ọzụzụ atụrụ nke ọ bụla na-eleru ìgwè atụrụ ya anya nke ọma iji hụ otú ha na-eme. Mgbe ọ hụrụ nwa atụrụ a mụrụ ọhụrụ, ọ na-ekunye ya n’ime . . . nnukwute uwe oyi ya pịakọtara apịakọta, ebe ọ bụ na ọ gaghị enwe ume iso nne ya. Mgbe obi ya juru, ọ na-ekukwasị ụmụ atụrụ n’ubu ya, na-ejide ha n’ụkwụ, ma ọ bụ nwụnye ha n’ime akpa ma ọ bụ na nkata a dọkwasịrị n’azụ ịnyịnya ibu, ruo mgbe ndị ntakịrị ga-enwe ike iso nne ha.” Ọ́ bụghị ihe na-akasi obi ịmata na anyị na-ejere Chineke nwere ụdị mmetụta obi ebere ahụ n’ebe ndị ya nọ ozi?
Igbe/Foto dị na peeji nke 412]
Gịnị Bụ Ọdịdị nke Ụwa?
N’oge ochie, ụmụ mmadụ n’ozuzu ha kwenyere na ụwa dị mbadamba. Otú ọ dị, laa azụ na narị afọ nke isii T.O.A., onye Gris bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Pythagoras chepụtara na ụwa aghaghị ịdị okirikiri. N’agbanyeghị nke ahụ, narị afọ abụọ tupu Pythagoras echepụta ozizi ya, Aịsaịa onye amụma kwuru n’ụzọ doro nnọọ anya na n’obi ike, sị: “Ọ bụ Onye ahụ Nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa.” (Aịsaịa 40:22, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) A pụrụ ịsụgharị okwu Hibru bụ́ chugh, nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “gburugburu,” dị ka “okirikiri.” N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ọ bụ nanị ihe dị okirikiri na-eyi ka ọ dị gburugburu n’akụkụ ọ bụla e lere ya anya.f Mgbe ahụ, n’ikwu ihe a na-amatụghị n’oge ya, Aịsaịa onye amụma dekọrọ okwu ziri ezi n’ụzọ nkà mmụta sayensị, nke akụkọ ifo oge ochie na-adịghị n’ime ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
f N’ikwu ya kpọmkwem otú ọ dị, ụwa dị okirikiri ma dị larịị n’isi ya abụọ. Ọ dịtụ mbadamba n’isi ya abụọ.
[Foto dị na peeji nke 403]
Jọn Onye Na-eme Baptism bụ olu nke “onye na-eti mkpu n’ọhịa”